Igbo Mass Readings for February 11 2024, Ụka nke Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 11 2024, Ụka nke Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 13:1-2,44-46.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Levitikọs
Isi Okwu: Onye ekpenta ga-ebi iche.
Onyenweanyị gwara Mosis na Erọn okwu sị: “E nwere onye ọ bụla nwere etuto, ma ọ bụ ọnya, ma ọ bụ ụdị etuto tụrụ agwa n’akpụkpọ ahụ ya; A sị ọ dị ka ọnya ekpenta, a ga-akpọta ya n’ihu onye nchụaja bụ Erọn, ma ọ bụ n’ihu otu n’ime ndị nchụaja si n’agbụrụ ya.
Ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye ekpenta na onye rụrụ arụ, ọ bụ onye nchụaja ahụ ga-ekwuwapụta na ọ rụrụ arụ, maka ihi ọnya ekpenta nke o bu n’isi. Onye ahụ bu ọnya ekpenta ga na-eyi nkịrịka uwe, bịakwa gbara isi oghe.
Ọ ga-afuchi ahụ-ọnụ ya na-eti mkpu sị: “Onye rụrụ arụ! Onye rụrụ arụ!” Oge niile o bu ọnya ekpenta ahụ n’ahụ, ọ ga na-ekwuwapụta na ya rụrụ arụ, n’ihi na ọ bụ ezie na ọ rụrụ arụ. Ọ ga-ebi iche. Ọ ga-ewu ebe obibi ya n’azụ owere dịpụụrụ onwe ya iche n’ebe ndị ọzọ bi.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 33:1-2, 5, 11 Az. 7
Azịza: Onyenweanyị, echere m Gị ihu mgbe m nọ na mkpa. I wee nye m uju añụrị nke nzọpụta.
1. Ngọzi dịrị onye e wepụrụ mmehie ya;
onye e kpuchiri njọ ya.
Ngọzi dịrị onye Onyenweanyị na-agụnyeghịrị njọ;
onye na-ebughị aghụghọ ọ bụla n’obi. Azịza.
2. Mgbe ahụ ka m mere ka ị mara njọ m.
Ezoghị m njọ ọ bụla.
Ekwuru m sị: “Ekwupụtaara Onyenweanyị njọ m.”
I wee wepụ ajọ omume m. Azịza.
3. Ụnụ bụ ndị ezi omume ñụrịanụ ọñụ n’Onyenweanyị.
Ụnụ bụ ndị obi ha ziri ezi, wulitenụ elu n’ọñụ. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 10:31 – 11:1
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: Na-eñominụ m, otu m si eñomi Kristi.
Ihe ọ bụla ụnụ na-eme, ma ọ bụ oriri ma ọ bụ ọñụñụ na-emenụ ha niile, ka e wee nye Chineke otito. Ụnụ emejọla ndị Juu ma ọ bụ ndị Grik, ma ọ bụ Nzukọ Chineke.
Na-emenụ otu m si eme. Ana m agba mbọ ime ihe ga-atọ mmadụ niile ụtọ n’ihe ọ bụla m na-eme. Adịghị m achọ nke naanị m, kama ọdịmma nke mmadụ niile, ka e wee zọpụta ha. Na-eñominụ m, otu m si eñomi Kristi.
MBEKU – Ọrụ ndị Ozi 16:14
Aleluya, aleluya!
Biko Onyenweanyị meghee obi anyị, ka anyị nụ okwu nke Nwa Gị.
Aleluya!
OZIỌMA – 1:40-45
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi Okwu: Ọrịa ekpenta hapụrụ ya. Ahụ ya wee dịkwa ọcha.
Οtu onye ekpenta wee bịakwute Jesu, daa n’ụkwụ Ya, na-arịọ Ya, sị: “Ọ bụrụ na Ị chọrọ, Ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Jesu wee nwee obi ebere n’ahụ ya, setịpụ aka ya, bitu ya sị: “Achọrọ M ka ị dị ọcha.
Dịkwa ọcha!” N’otu oge ahụ, ahụ wee dị ya mma, o wee dị ọcha. Ma Jesu dọsiri ya aka na ntị ike, chụlaa ya ngwa ngwa, mgbe Ọ gwasịrị ya sị; “Lezie anya!
A gwakwala onye ọ bụla maka ihe a. Kama jee, gosi onye ụkọchukwu onwe gị, tụkwaa mmamma n’ihu Chineke maka ọgwụgwọ a gwọrọ gị, dịka Mosis nyere n’iwu, ka ọ bụụrụ ndị mmadụ ihe akaebe na e meela ka ị dị ọcha.”
Ma o siri n’ebe ahụ pụọ, malite ikwusazu ya, na ifesa okwu banyere ọgwụgwọ ya, nke mere na ọ dịghịkwara Jesu mfe ịba n’ime obodo, n’ịhụ ọha mmadụ. Kama Ọ na-anọzi n’azụ obodo, n’ebe mmadụ na-ebighị. Ma ndị mmadụ si ebe niile na-abịakwute Ya.
Igbo Mass Readings for February 12 2024, Mọnde Izuụka nke Isii N’Oge na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for February 11 2024, Ụka nke Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.