Igbo Mass Readings for Ụka nke Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for Ụka nke Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:12-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

Isi Okwu: Chetakwanụ na o nwere mgbe ụnụ bụ ohu n’ala Ijipt

Hụkwa na ị na-edebe ụbọchị Ụka nsọ, dịka Onyenweanyị Chineke gị si tiere gị iwu. I nwere ụbọchị isii maka ọrụ gị niile. Mana ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị ezumike nke Onyenweanyị Chineke gị.

A naghị arụ ọrụ n’ụbọchị ahụ, ma ọ bụ gị, ma ọ bụ nwa gị nwoke, ma ọ bụ nwa gị nwanyị, ma ọ bụ odibo gị nwoke ma ọ bụ odibo gị nwanyị, ma ọ bụ ehi ma ọ bụ ịnyịnya ma ọ bụ anụ bi n’ụlọ gị, ma ọ bụ onye ọbịa bi n’ụlọ Gị.

Ohu gị nwoke na ohu gị nwanyị ga-eso gị zuru ike n’ụbọchị ahụ. Maka na chetakwanụ na o nwere mgbe ụnụ bụ ohu n’ala Ijipt. Ma Onyenweanyị Chineke ụnụ setịrị ogwe aka O jiri bụrụ dike si n’ebe ahụ kpọpụta ụnụ. N’ihi ya ka Onyenweanyị Chineke ụnụ ji tiere ụnụ iwu na ụnụ ga na-edebe ụbọchị Ụka asọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 80:3-8,10-11 Az. 2

Azịza: Tierenụ enyemaka anyị bụ Chineke mkpu ọñụ.

1. Bidonụ egwu mara mma. Tibenụ ịgba.

Fụwanụ ọja. Kpọbanụ ụbọ.

Fụọnụ opi ike na mbido ọnwa ọhụrụ;

fụọnụ ya mgbe ọnwa nọ n’uju na n’ụbọchị mmemme anyị. Azịza.

2. N’ihi na ọ bụ iwu a ma ama n’ala Izrel;

bụrụkwa mkpebi Chineke nke Jekọp,

Onye nyere atụmatụ ahụ na Josef mgbe anyị si n’ala Ijipt pụta. Azịza.

3. A nụrụ m olu m na-anụbeghị mbụ;

nke sịrị m: “Ọ bụ M zidara gị ibu ahụ na-anyị gị n’ubu,

bịakwa napụta gị nkata ahụ i bu n’aka.

Ọ bụ M ka ị kpọkuru na mkpa,

e were M za gị.” Azịza.

4. A gaghị enwe chi mba ọzọ na arụsị n’etiti ụnụ.

Ụnụ agaghị efe chi mba ọzọ.

Mụ onwe M bụ Dinwenụ bụ Chineke ụnụ,

onye ahụ dupụtara ụnụ n’ala Ijipt. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:6-11

Ihe Ọgụgụ wetara n’Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: N’ahụ anyị nke a na-anwụ anwụ, e mere ka ndụ Jesu pụta ihe.

Ọ bụ otu Chineke ahụ kwuru sị: “Ka ihe si n’ọchịchịrị nwupụta!”, bụkwa otu onye ahụ na-enwu ka ọkụ n’ime obi anyị. O mere nke a I ji mee ka anyị gosipụta ebube Chineke nke na-enwupụta n’ihu Kristi.

Ihe a bụ ihe omimi ahụ dara oke ọnụ nke anyị bu n’ite aja na-akụwa-akụwa, ka o wee anya na ike o ji adị ire si n’aka Chineke; ọ bụghị n’ike aka anyị Ụdị mkpagbu niile si n’akụkụ niile na-abịara anyị mgbe niile, ma anyị adarubeghị ala.

Anyị ahụbeghị ihe ga-ebelata nsogbu anyị, ma anyị enweghịkwa obi ịda mba. A na-emegbu anyị emegbu, ma a hapụghị naanị anyị. A kụdara anyị n’ala, ma egbughị anyị egbu.

Mgbe niile, ebe ọ bụla anyị nọ, anyị bu ọnwụ Kristi n’ahụ anyị, ka ewee hụkwa ndụ Kristi n’ahụ anyị oge niile. Ọ bụ ezie na anyị dị ndụ, ma anyị na-ahụ ọnwụ n’anya ụbọchị niile n’ihi Jesu; ka e wee mee ka ndụ Jesu pụta ihe n’ahụ anyị nke a na-anwụ anwụ.

MBEKU – Jọn 8:12

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Abụ M ihe nke ụwa. Onye ọ bụla na-eso M ga-enwe ihe nke ndụ”.

Aleluya!

OZIỌMA – 2:23-3:6 ma ọ bụ 2:23-28

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Nwa nke mmadụ bụkwa Onyenwe Ụbọchị ezumike.

N’otu ụbọchị izuike, Jesu na Ụmụazụ Ya si n’ubi a kụrụ ọka na-agafe. Mgbe ha na-aga, Ụmụazụ Ya malitere ịghọ ọka. Ndị Farisii jiri iwe jụọ Ya sị: “Lee anya!

Gịnị mere Ụmụazụ Gị ji eme ihe na-ezighị ezi n’iwu n’ụbọchị izuike?” Jesu wee jụọ ha sị: “Ụnụ agụbeghị ihe Devid mere mgbe ọ nọ na mkpa; mgbe agụụ na-agụ ya na ndị ya na ha nọ? Otu o si banye n’ụlọ Chineke, mgbe Abiata bụ onye isi nchụaja, wee rie ogbe achịcha nsọ nke iwu kwuru na ọ bụ sọ ndị ụkọchukwu na-eri.

Ọ bụghị naanị na oriri ya, kama ọ bịakwara nyetụ ndị ya na ha so.” O wee kuziere ha, sị: Ọ bụ mmadụ nwe ụbọchị ezumike, ọ bụghị ụbọchị ezumike nwe mmadụ.

Ya mere, Nwa nke Mmadụ bụkwa Onyenwe ụbọchị ezumike. (Jesu batakwara ọzọ n’ụlọ nzukọ ha, ebe e nwere otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ.

Ndị mmadụ wụkwasịrị Jesu anya, na-eche ya nche, ma ọ ga-arụ ọrụ ịgwọ mmadụ n’ụbọchị izuike, ka ha wee hụ ihe ha ji ebo Ya ebubo. Jesu wee sị onye ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Bilie, gbagote n’ihu ebe a!” O wee jụọ ha, sị: “O ziri ezi n’iwu ime ihe ọma n’ụbọchị izuike ka ọ bụ ime ihe ọjọọ; ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ya n’iyi?”

Ma ha gbachiri Ya nkịtị. Jesu lezuru ha anya ahụ n’iwe; ọnụma juru Ya obi, n’ihi na ha kpọchiri obi ha akpọchi ka ha ghara ịghọta ihe ọ bụla Ọ na-agwa ha.

Ma Ọ sịrị nwoke ahụ: “Ngwa setịa aka gị!” Nwoke ahụ wee setịa aka ya. Aka ya bịakwa zuo oke ọzọ. Mgbe ahụ ka ndị Farisii pụrụ n’ezi, kpọrọ ndị otu Herọd, banye n’ịgba izu otu ha ga-esi egbu Jesu).

Igbo Mass Readings for Ụka nke Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 3, 2023