Igbo Mass Readings for Ụka nke Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for Ụka nke Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:41-43
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ nke ndị Eze
Isi Okwu: Ọ bụrụ na onye ọbịa abịa, biko nye ya ihe niile ọ rịọrọ.
Solomọn kwụụrụ n’ihu ebe nchụaja nke Dinwenụ bịa setịa aka ya n’eluigwe sị: “Onye mba ahụ na-abụghị otu onye n’ime ndị nke Gị bụ Izrel; ọ bụrụ na onye a sitere na mba tere aka, jiri maka ihi aha Gị bịa kpee ekpere n’ụlọ nsọ nke a; biko site n’ebe obibi Gị dị n’eluigwe bịa nụrụ olu ya.
Meere ya bụ onye ọbịa, ihe ọ na-arịọ. N’ihi na ndị mmadụ ga-anụ aha Gị, nụ maka aka Gị dị ike nke Ị gbasara agbasa. Otu a, mmadụ niile nọ n’ụwa ga-anụ aha Gị, bịakwa soro nzọ-ụkwụ ndị nke Gị Izrel, bịa sọpụrụ Gị. Ha ga-amatakwa na aha Gị ka e nyere ụlọ nsọ ahụ nke m wuru.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 116:1-2 Az. Mk. 16:15
Azịza: Gawanụ na mba niile, gaanụ kwupụta Oziọma. ma ọ bụ Aleluya
1. Mba niile, toonụ Dinwenụ,
mmadụ niile, jikọọnụ ọnụ too Ya. Azịza.
2. Ịhụnanya Ya ebuka n’ebe anyị nọ.
Eziokwu nke Dinwenụ dị ebighị ebi. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:1-2, 6-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshia
Isi Okwu: Ọ bụrụ na m na-achọ otito n’aka ndị mmadụ, etosịghị m ịbụ nwodibo Kristi.
Pọl, onye a kpọrọ ịbụ onye ozi; ọ bụghị site na nhọpụta nke ndị mmadụ, ma ọ bụ nke mmadụ ọ bụla, kama site na nhọpụta nke Jesu Kristi, na nke Chineke Nna Ya, Onye ahụ mere ka O si n’ọnwụ bilie.
Ụmụnna anyị niile ndị mụ na ha nọ ebe a, so m na-ezitere Nzukọ Galeshia niile ozi ekele. Ọ gbara m gharịị na ụnụ ji ọsọ ọsọ otu a na-agbanarị onye ahụ kpọrọ ụnụ site n’usoro amara Kristi, wee na-agbaso ozi ọma ọzọ dị iche.
N’ịgwa ụnụ ezi okwu, “Ozi Ọma ọzọ” adịghị. Ana m ekwu nke a n’ihi na ụfọdụ mmadụ na-atụgharị obi ụnụ, na-achọkwa ịgbanwo Oziọma nke Kristi. Ma a sịgodu na anyị onwe anyị, ma ọ bụ mmụọma si n’eluigwe bịara, zie ụnụ Oziọma ọzọ, nke na-abụghị Oziọma ahụ anyị kụzirila ụnụ na mbụ, ya bụrụkwa onye a bụrụ ọnụ!
Anyị ekwuola ya na mbụ. Ugbu a, ekwukwa ya ọzọ: Ọ bụrụ na onye ọ bụla ezie ụnụ Oziọma ọzọ, nke na-abụghị Oziọma ahụ ụnụ natara na mbụ, ya bụrụkwa onye a bụrụ ọnụ!
Ihe m na-achọ ugbu a, ọ bụ ka mmadụ too m? Ka ọ bụ ka Chineke too m? Ọ bụ otu a ka e si enweta otito mmadụ? Ọ bụrụ na mbọ niile a m na-agba bụ ka m nweta otito mmadụ, ọ pụtara na m abụghị nwodibo Kristi.
MBEKU
Aleluya, aleluya:
Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu, nke na O nyere Sọ Otu Nwa Ya; ka onye ọ bụla kwere na Ya, wee nweta ndụ ebighị ebi.
Aleluya
OZIỌMA – 7:1-10
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị nsọ nke Luk dere.
Isi okwu: Ahụbeghị m okwukwe dị otu a, ọ bụladị n’ala Izrel.
Mgbe Jesu gwachara ndị mmadụ okwu, O wee banye na Kapanọm. Otu onye ọchị agha, na-achị ọgụ ndị agha ise, nwere otu odibo dị ya n’obi; odibo ahụ dị ya n’obi dara nnukwu ọrịa, nke mere ka ọnọdụ n’ọnụ ọnwụ.
Mgbe ọchị agha ahụ nụrụ maka Jesu, o ziri ndị okenye nke ndị Juu ka ha jee rịọ Jesu, ka Ọ bịa gwọọ odibo ya. Mgbe ndị okenye ndị Juu bịakwutere Jesu, ha jiri obi ha niile rịọwa Ya, sị: “Ọchị agha nke a bụ onye I kwesịrị imere amara dị otu a, n’ihi na ọ hụrụ ndị ala anyị n’anya; o wukwaara anyị otu ụlọ nzukọ.”
Jesu wee soro ha gaa. Ma mgbe ọ fọdụrụ nwantakịrị ka ha bịaruo n’ebe ọchị agha ahụ bi, ọchị agha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha zute Jesu gwa Ya sị: “Nna anyị ukwu, e sogbula onwe Gị.
N’ihi na ekwesịghị m ka Ị bata n’ụlọ m. Ọ bụ nke a kpatara na ejighị m ụkwụ m bịa, kpọọ gị n’onwe m. Kama kwuo naanị okwu ọnụ, nwodibo m ga-adịhị.
N’ihi na mụ onwe m bụkwa onye ghọtara ike dị n’okwu ọnụ onye nọ n’ọchịchị. Enwere m ndị agha nọ n’okpuru m; nke m sị “gawa”, ya gawa. Nke m sị “bịa”, ya bịa. M sị ohu m: “Mee ihe a”, ya mee ya.”
Mgbe Jesu nụrụ ihe a, ọ tụrụ Ya n’anya. O wee tụgharịa gwa igwe mmadụ ahụ so Ya okwu sị: “N’ezie agwa M ụnụ, ahụbeghị M ụdị okwukwe dị otu a n’etiti ụmụ Izrel!” Mgbe ndị ahụ ọchị agha ahụ zitere laghachiri n’ụlọ ya, ha hụrụ na ahụ adịla odibo ahụ mma.