Igbo Mass Readings for November 30 2025, Ụka nke Mbụ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Mbụ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 30 2025, Ụka nke Mbụ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-5

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Onyenweanyị ga-akpọkọta mba nile ọnụ n’udo ahụ dị ebighi ebi; ka ha bụrụ alaeze nke Chineke.

Ọhụ nke Aịzaya nwa Emọz, banyere Juda na Jerusalem. N’oge na-abịanụ, ugwu Ụlọ Nsọ nke Onyenweanyị ga-eto karịchaa ugwu ndị ọzọ nile. A ga ebulite ya elu karịchaa mkpumkpu ala nile.

Mba nile ga-enubata n’ime ya. Ndị mmadụ a na-enweghi ike ịgụta ọnụ ga-abata n’ime ya. Ha ga-ekwu si: “Ngwanụ! Bịanụ ka anyị rịgoro n’ugwu nke Onyenweanyị; ka anyị rịgoro n’Ụlọ Nsọ Chineke nke Jekọp; ka Ọ kuziere anyị ụzọ Ya, ka anyị wee nwee ike ịga n’okporo ụzọ Ya.

Ebe ọ bụ na iwu nile ga-esi na Zayọn na-apụta; atụmatụ nile nke Onyenweanyị esikwa na Jerusalem na-abịa. Ọ ga-etiri mba niile iwu. Ya onwe Ya ga-abụ Ọ kaa, O bie, n’etiti mba niile.

Ndi a nile ga-eji mma agha ha kpụọ ihe e ji akọ ugbo. Ha ga-eji ube ha mere ihe e ji egbu ahịhịa. O nweghịkwa mba ga-eweliri ibe ya mma agha. A gaghị enwekwa ọzụzụ maka ibu agha. Gị bụ ụlọ Jekop, ngwa bịa ka anyị gawa ije n’lhè nke Onyenweanyị.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 121:1-2. 4-5. 6-9 Az. 11

Azịza: Aňurịrị m ọñụ, mgbe m nụrụ ha kwuru: ‘Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke!’

1. Añụrịrị m ọñụ, mgbe m nụrụ ha kwuru:

‘Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke!

Gị bụ Jerusalem, ugbu a,

ụkwụ anyi guzoro n’ọnụ ụzọ ama gị.

Azịza: Aňurịrị m ọñụ, mgbe m nụrụ ha kwuru: ‘Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke!’

2. E wuru Jerusalem dịka oke obodo kwụsiri ike.

Ebe ahụ ka mba nile na-aga;

mba nile nke Onyenweanyị.

Azịza: Aňurịrị m ọñụ, mgbe m nụrụ ha kwuru: ‘Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke!’

3. N’ihi ịhụnanya nke ụmụnne m na ndị enyi m,

ana m ekwu sị: ‘Udo dịrị gị!

N’ihi ịhụnanya m nwere maka Ụlọ nke Onyenweanyị,

aga m arịọ arịrịọ maka ọdịmma gị.

Azịza: Aňurịrị m ọñụ, mgbe m nụrụ ha kwuru: ‘Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke!’

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 13:11-14

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndi Rom

Isi Okwu: Nzọpụta anyị dị nso

Ụmụnna m ụnụ ma nke ọma na ‘oge ahụ’ eruole. Tetanụ n’ụra, n’ihi na nzọpụta anyị dị nso ugbu a karịa mgbe mbụ a tọghatara anyị n’okwukwe. Ọ fọdụrụ ntakịrị ka abalị gafee. Chi ọbụbọ dị nso.

Ka anyị wụfuonụ ejiji e jiri mara abalị! Ka anyị yirinụ ejiji e ji agagharị n’ehihie! Ka anyị biwenụ ndụ mara mma; ụdị ndụ ahụ mmadụ na-ebi n’oge ehihie: ọ bụghị ndụ añụrụma mmanya; ọ bụghị ndụ ịkwa iko na nke ikpa oke aghara; ọ bụghị nke oke ekwurekwu na inwe anya ukwu.

Ka ngwa ọgụ ụnụ bụrụ Onyenweanyị Jesu Kristi. Wepụnụ uche n’igbo mkpa anụ ahụ, na inye anụ ahụ ihe niile na-agụ ya.

MBEKU – Abụọma 85:8

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, mee ka anyị hụ ebere Gị. Nyekwa anyị enyemaka nzọpụta Gị.

Aleluya.

OZIỌMA – 24:37-44

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Mụrụnụ anya! Dịkwanụ nkwadebe!

Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka ihe mere n’oge Noa. N’Oge ahụ, tupu uju mmiri ahụ abịa, ndị mmadụ nọ na-eri, na-aňụ; ụfọdụ nọ n’ịlụ nwanyị, ụfọdụ nọ n’ịlụ di, ruo ụbọchị ahụ Noa banyere n’ụgbọ mmiri.

Ha atụghị anya ihe ọ bụla ruo mgbe mmiri riri ha niile. Otu ahụ ka ọ ga-adịkwa mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa. Mgbe ahụ, ụmụ nwoke abụọ ga-anọ n’ụbi; e were otu, hapụ otu.

Ụmụ nwanyị abụọ ga-anọ ebe a na-akwọ ọka: e were otu, hapụ otu. N’ihi ya, mụrụnụ anya maka na ụnụ amaghị mgbe Onyenwe ụnụ ga-abịa. O were anya nke ọma, na ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ma mgbe onye ohi ji abịa n’abalị, ọ gaara amụrụ anya, ghara ikwe ka mmadụ ọ bụla gbukaa ụlọ ya.

N’ihi ya, ụnụ onwe ụnụ ga-amụrụ anya, dịkwa njikere, maka na Nwa nke Mmadụ ga-abịa mgbe ụnụ na-atụghị anya Ya.

Igbo Mass Readings for December 1 2025, Mọnde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị

Igbo Mass Readings for November 30 2025, Ụka nke Mbụ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Mbụ.