Igbo Mass Readings for December 3 2023, Ụka nke Mbụ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Abụọ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for December 3 2023, Ụka nke Mbụ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 63:16-17,19, 64:2-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Isi Okwu: Tiwapụ eluigwe gbadata
Onyeweanyị, Ị bụ Nna anyị. Onye Nzọpụta Anyị bụ aha ochie Gị. Onyenweanyị, gịnị kpatara I jiri hapụ ka anyị na-agahịeri, na-ahapụkwa ụzọ Gị? Gịnị kpatara I jiri hapụ ka anyị kpọchie obi, ghara ịtụrụ Gị egwu?
Kpọghachie anyị azụ, n’ihi ụmụodibo Gị, na agbụrụ ahụ Ị họọrọ ka ha bụrụ ndị nke Gị. Ewoo! Ọ ga-ama mma ma a sị Gị tiwaa eluigwe gbadata! Ka ugwu ukwu gbazee n’ihu Gị!
Ka a hụ ihe na-emebeghị mbụ; nụ ihe na-anụbeghị mbụ! Anya ahụbeghị, ntị anụbeghị na-enwere chi dị ka Gị, Onye na-arụ ọrụ ebube maka ndị tụkwasara Ya obi.
Ị na-eduzi ndị kwụbara aka ọtọ, ndị bu iwu Gị n’obi. Iwe were Gị mgbe anyị bụ ndị njọ. O teela anyị na-enupụrụ Gị isi. Anyị niile dị ka ndị rụrụ arụ. Ịkwụba aka ọtọ anyị ahụ dị ka nkịrịka akwa ruru inyi.
Anyị niile akpọnwụọla ka ahịhịa. Mmehie anyị na-ebugharị anyị ka ikuku. O nweghị onye kpọkuru aha Gị; nke a na-enwe onye metụrụ ụñara imetụ Gị aka.
Maka na Ị zolahara anyị ihu Gị, bịakwa tụhapụ anyị ka anyị na-agwọtọgharị na njọ anyị. Onyenweanyị, n’ezie Ị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ; Gị bụ Ọkpụite. Anyị niile bụ ọrụ aka Gị.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 80:2-3, 15-16, 18-19 Az. 4
Azịza: Chineke nke igwe ndị agha, kpọchighaa anyị azụ. Mee ka ihu Gị chakwasị anyị, ka anyị wee nweta nzọpụta.
1. Onye nche nke Izrel,
tọọ ntị n’ala nụrụ olu anyị.
Si n’oche eze, ebe I ji ndị Mmụọọma gbakwasị ukwu, chawapụta.
Kpalite ike Gị, bịa zọpụta anyị. Azịza.
2. Chineke nke igwe ndị agha,
anyị na-arịọ Gị, che anyị ihu ọzọ kwa.
Si n’eluigwe ledata anya n’ala ka Ị hụ. Azịza.
3. Ka enyemaka Gị nọnyere Onye Ị họtara ahọta;
Onye I jiri aka Gị nye mgbasike.
Mgbe ahụ, anyị agaghịkwa agbalaha Gị ọzọ.
Nye anyị ndụ ọhụrụ, ka anyị wee na-akpọku aha Gị. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:3-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi okwu: Anyị na-eche ka e gosi anyị Onyenweanyị Jesu Kristi
Ka Chineke Nna na Onyenweanyị Jesu Kristi zitere ụnụ amara na udo. A na m ekele Chineke akwụsịghị akwụsị, maka amara niile dị iche iche, ụnụ natara site na Jesu Kristi.
Ana m ekele Ya, na O mere ka ụnụ baa ụba n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche; ọ kachasị n’inwe ndị nkuzi na ndị na-ekwu okwuchukwu. N’ezie, ịgbara Kristi akaebe siri ike n’etiti ụnụ, nke pụtara na Ọ gbawaghị ụnụ aka onyinye nke Mmụọ Nsọ, ebe ụnụ na-eche ka e gosi Onyenweanyị, Jesu Kristi.
Ọ ga-eme ka ụnụ guzosie ike; ka a ghara ịta ụnụ ụta ruo n’ụbọchị ikpeazụ; nke bụ ụbọchị Onyenweanyị Jesu Kristi. N’ihi na mgbe Chineke kpọrọ ụnụ oku, O jikọtara ụnụ na Nwa Ya, Jesu Kristi. Chineke bụ Onye a ga-atụkwasa obi.
MBEKU – Abụọma 85:8
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, gosi anyị ebere Gị. Nyekwa anyị nzọpụta Gị.
Aleluya!
OZIỌMA – 13:33-37
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi Okwu: Mụrụ anya, n’ihi na ị maghị mgbe onye nwe ụlọ ga-eji bata
Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Na-echenụ nche. Mụrụnụ anya, n’ihi na ụnụ amaghị mgbe oge ahụ ga-abụ. Ọ dị ka nwoke gara mba ọzọ. Mgbe ọ na-ahapụ ụlọ, ọ gwara ụmụodibo ya lekọtawa ihe ya; bịakwa kenye nke ọ bụla ọrụ nke ya.
Ọ gwara onye nche ọnụụzọ ka ọ mụrụ anya. N’ihi ya, mụrụnụ anya, maka na ụnụ amaghị mgbe nna ukwu nwe ụlọ ga-abata: ọ bụ n’anyasị, ka ọ bụ n’etiti abalị, ka ọ bụ mgbe okeọkpa bere akwa, ka ọ bụ n’ụzọ ụtụtụ?
Ọ bụrụ na ya bata mgbe a na-atụghị anya ya, ya ahụkwala gị ebe ị na-arahụ ụra. Ihe M gwara ụnụ ka M gwara mmadụ niile: ‘Mụrụnụ anya!””