Igbo Mass Readings for February 22 2026, Ụka nke Mbụ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 22 2026, Ụka nke Mbụ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:7-9.3:1-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis

Isi Okwu: Okike na njọ nna anyị na nne anyị mbụ.

Onyenweanyị Chineke kọrọ ubi a gbara ogige na Idem nke dị n’ọwụwa anyanwụ. O wee tinye mmadụ ahụ Ọ kpụrụ n’ebe ahụ. Onyenweanyị Chineke mere ka ụdị osisi ọ bụla si n’ala pulite, ma nke mara mma ile anya, ma nke mara mma oriri.

A bịakwa nwee osisi nke ndụ, na osisi nke ịma ihe dị mma na ihe dị njọ n’etiti ubi ahụ a gbara ogige. A bịa n’anụ ọhịa niile Chineke kere, agwọ bụ nke ghọkarịrị ha niile n’aghụghọ.

Ọ bịara jụọ nwanyị ahụ sị: “Ọ bụ ezi okwu na Chineke sịrị ụnụ atakwala mkpụrụ osisi ọ bụla dị n’ubi a a gbara ogige?” Nwanyị ahụ zara agwọ sị: “Anyị nwere ike ịta mkpụrụ nke osisi dị n’ubi a a gbara ogige.

Ma gbasara mkpụrụ osisi dị n’etiti ubi a agbara ogige, Chineke kwuru sị: “Ụnụ atakwala mkpụrụ sitere na ya. Ụnụ emetukwala ya aka. Ụnụ taa ya, ma ọ bụ metu ya aka, ụnụ ga-anwụ anwụ.”

Mgbe ahụ ka agwọ jiri gwa nwanyị ahụ sị: “Mba! Ụnụ agaghị anwụ. Chineke maara nke ọma na ụbọchị ọ bụla ụnụ ga-ata ya, ka anya ga-emeghe ụnụ; ụnụ ewee dị ka Chineke, mara ihe dị mma na ihe dị njọ.”

Nwanyị ahụ were hụ na osisi ahụ mara mma oriri, makwasa mma ile anya, bụrụkwa ihe na-atụlọ akpịrị maka amamihe ahụ o nwere ike inye. O wee ghọrọ otu mkpụrụ ya taa.

Ọ bịakwa were ya nyetụ di ya, onye so ya nọrọ; o sorokwa taa. Mgbe ahụ ka anya ha abụọ meghere, ha wee ghọta na ha gba ọtọ. N’ihi ya, ha wee dụkọta akwụkwọ fig ọnụ; were ya mere akwa ha na-eje.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 50:3-6, 12-14.17 Az. 3

Azịza: Biko Onyenweanyị, meere anyị ebere n’ihi na anyị emeela njọ.

1. Chineke m, were obi ọma Gị meere m ebere,

were obi ebere Gị hichapụ njọ m niile.

Biko sachapụ m mmehie m.

Ghụchaa m njọ m. Azịza

2 N’ezie, amaara m mmehie m.

Njọ m niile guzoro m n’ihu mgbe niile.

Emehiela m Gi. Sọ Gị ka m mehiere.

Emeela m ihe rụrụ arụ n’ihu Gị. Azịza.

3. Chineke m, kenye m obi dị ọcha.

Tinye mmụọ kwụdosiri ike n’ime m.

Achụpụkwala m n’ihu Gị.

A napụkwala m mmụọ Gị dị asọ. Azịza

4. Nyekwa m añụrị nke enyemaka Gị.

Were mmụọ nke obi na-anụ ọkụ kwalite m.

Onyenwe m, meghee egbugbere ọnụ m.

Ka ọnụ m wee kwusaa otito Gị. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:12-19

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Amara Chineke karịrị njọ mmadụ nwere ike imeta.

Njọ batara n’ụwa site n’aka otu mmadụ. Ọnwụ soro njọ bata. Ọnwụ wee si otu ahụ gazuo mmadụ niile, n’ihi na mmadụ niile emeela njọ. Njọ dịrịị adị n’ụwa tupu e nye Iwu.

Ma ebe iwu na-adịghị, ibo mmadụ ebubo na o mebiri iwu adịghị. Ma ọnwụ sitere n’oge Adam bụrụ eze na-achị ụwa niile, ruo n’oge Mosis. Ọ bụ ezie na njọ ha abụghị nke imebi iwu dịka nke Adam.

Adam bụ ihe ọmụmatụ nke Onye ahụ gaje ịbịa. Ma onyinye nke amara jiri ihe buru ibu karịa ọdịda nke mmadụ. Ọ bụrụ na mmadụ niile nwụrụ n’ihi njọ otu mmadụ ahụ, bụ Adam; ọ karịrị bụrụ eziokwu na amara Chineke, nke sitere n’aka otu mmadụ ahụ, bụ Jesu Kristi, ga-agazu mmadụ niile dịka uju onyinye obi ọma Chineke.

Uru e ritere n’amara Chineke karịkwara abụmọnụ e nwetara na njọ otu mmadụ ahụ. N’ihi na otu njọ mmadụ mere butere ikpe ikpe na amamikpe. Ma onyinye amara Chineke nke bịara mgbe mmadụ merela ọtụtụ njọ, mere ka a gụnye onye mmehie n’onye ezi omume.

Ọ bụrụ na ọnwụ sitere n’aka otu onye, n’ihi mmehie ya, rute mmadụ niile; otu ahụ kwa ka o siri kara bụrụ eziokwu na otu Onye ahụ bụ Jesu Kristi, ga-eme ka onye ọ bụla nweta ndụ, bịakwa bụrụ onye ezi omume ahụ ọ na-etozughị ịbụnụ.

Ọ pụtara na, otu e si gụnye mmadụ niile na ndị njọ, site n’erubeghị isi nke otu onye; ka e sikwara gụnye mmadụ niile na ndị eziomume, site n’irube isi nke otu onye.

MBEKU – Matiu 4:4

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Ọ bụghị sọ na nri ka mmadụ ji adị ndụ, kama ọ bụ site n’okwu ọ bụla si n’ọnụ Chineke pụta.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 4:1-11

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Isi Okwu: Jesu buru ọnụ ọgụ abalị abụọ, e wee nwaa Ya ọnwụnwa.

N’oge ahụ, Mmụọ Nsọ wee duru Jesu baa n’ọzara ka Ekwensu nwaa Ya. Mgbe O busịrị ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, oke agụụ gụrụ Ya. Onye ọnwụnwa ahụ wee bịakwute Ya, sị: “Ọ bụrụ na Ị bu Nwa Chineke n’eziokwu, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ ogbe achịcha.”

Jesu zara ya, sị: “E deela ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eri wee dị ndụ; kama ọ bụ site n’okwu ọ bụla si n’ọnụ Chineke pụta.” Mgbe ahụ, ekwensu wee kpọrọ Jesu baa Obodo Nsọ.

O wee guzobe Ya n’akụkụ dị elu nke Ụlọ Nsọ, sị Ya: “Ọ bụrụ na Ị bụ Nwa Chineke n’eziokwu, si ebe ahụ wụda n’ala. N’ihi na e deela ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi Ya iwu maka Gị; ka ha kuru Gị n’aka, ka Ị ghara ịkpọbi ụkwụ Gị na nkume.”

Jesu wee zaa ya, sị: “Ọzọ kwa, e deela ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “A nwala Onyenweanyị Chineke gị ọnwụnwa.” Ekwensu wee kpọrọ Jesu rịgoo otu ugwu dị oke elu.

O wee gosi Jesu alaeze niile nke ụwa na ebube ha. O wee gwa Jesu, sị: “Aga m enye Gị ihe ndị a niile ma ọ bụrụ na Ị daa n’ala, kpọọrọ m isi ala.” Mgbe ahụ Jesu wee baara Ekwensu mba, sị, “Ekwensu! Ngwa pụọ!

N’ihi na e deela ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Onyenweanyị Chineke gị ka ị ga-akpọrọ isi ala. Ọ bụkwa naanị Ya ka Ị ga-efe!” Mgbe ahụ ka Ekwensu ji hapụ Ya, ndị mmụọ ozi wee bịa na-ejere Jesu ozi.

Igbo Mass readings for February 23 2026,

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for February 22 2026, Ụka nke Mbụ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ.

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X
Scroll to Top

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.