Igbo Mass Readings for February 18 2024, Ụka nke Mbụ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 18 2024, Ụka nke Mbụ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:8-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis

Isi Okwu: Ọgbụgbandụ dị n’etiti Chineke na Noa, oge Ọ zọpụtara ya na mmiri tọchitere ụwa.

Chineke gwara Noa na ụmụ ya ndị ikom sị, “Ana m ekwe ụnụ nkwa, ụnụ na ụmụ ụnụ, na anụmanụ ndị a niile so ụnụ si n’ụgbọ ahụ pụta, anụ ufe, anụ ụlọ, na anụ ọhịa ahụ niile, na agaghị m ekwekwa ka e jiri mmiri mebie ihe niile nwere ndụ n’ụwa ọzọ.

Ihe m ji mesie nkwa a ike bụ nke a; emeela m ka eke na egwurugwu m dịrị na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ịrịbaama nye ụnụ na ihe niile nwere ndụ bi n’ụwa.

Mgbe ọ bụla m zitere igwe ojii n’ụwa, aga m eme ka eke na egwurugwu soro ya pụta ihe. Site n’ụzọ dị otu a aga mecheta nkwa m kwere ụnụ na ụmụ anụmanụ niile, na agaghị m ejikwa mmiri mebie ihe niile nwere ndụ n’ụwa ọzọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 24:4-9; Az. 10

Azịza: Onyenweanyị, ụzọ Gị bụ ịkwụdosi ike na ịhụnanya maka ndị na-edebe ọgbụgba ndụ Gị.

1. Onyenweanyị, mee ka m mara ụzọ Gị.

Onyenweanyị, kụziere m ụzọ Gị.

Mee ka m na-aga n’eziokwu Gị.

Kụziere m, n’ihi na Gị bụ Chineke Onye Nzọpụta m. Azịza

2. Onyenweanyị, cheta ebere Gị.

Chetakwa ịhụnanya ahụ ejiri mara Gị site na mgbe ochie.

Onyenweanyị, were ihi ịhụnanya Gị cheta m,

n’ihi na Ị dị mma. Azịza

3. Onyenweanyị dị mma bụrụkwa Onye ikpe nkwụmọtọ.

Ọ na-egosi ndị mmehie ụzọ.

Ọ na-eduzi ndị umeala n’ụzọ ziri ezi;

na-akụzikwara ụmụ ogbenye ụzọ Ya. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:18-22

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ Pita dị asọ dere

Isi Okwu: Mmiri ahụ bụ ụdị mmirichukwu nke na-azọpụta ụnụ ugbu a.

Ọ bụ ihe a kpatara Kristi jiri were otu ịnwụ ọnwụ maka njọ nwụchitere mmadụ niile ọnwụ. Onye ezi omume nwụchiteere ndị ajọ omume ọnwụ, iji durute mmadụ n’ihu Chineke.

Ọnwụ ahụ Ọ nwụrụ bụ ọnwụ a nwụrụ n’anụ ahụ, ma e nyere Ya ndụ nke ime mmụọ. Ọ bụkwa n’ime mmụọ ka Ọ gara kwusaara ndị mmụọ e ji na mkpọrọ okwu Chincke.

Ụmụ mmụọ ndị a bụ ndị jụrụ ikwere na Chineke n’oge gara aga, mgbe Chineke jiri ndidi chere ka Noa rụọ ụgbọ mmiri e ji zọpụta mmadụ asatọ n’uju mmiri.

Mmiri ahụ bụkwa ihe e ji atụnyere mmiri nke mmirichukwu, nke na-abụghị ihe e ji asachapụ inyi nke elu ahụ, kama ọ bụ nkwa e jiri ezigbo akọ na uche kwee Chineke site na mbilite n’ọnwụ nke Jesu Kristi, Onye rọgoro n’eluigwe wee nọdụ n’aka nri Chineke; ebe Ọ nọ na-achị ndị Mmụọ ozi niile, na ndị niile na-achị achị na ike niile dị n’eluigwe.

MBEKU – Matiu 4:4

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Ọ bụghị sọ na nri ka mmadụ ji adị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla si n’ọnụ Chineke pụta.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 1:12-15

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Isi Okwu: Ekwensu nwara Jesu, ndị Mmụọọma bịara jeere Ya ozi.

Mmụọ Nsọ wee duru Jesu banye n’ọzara. Ọ nọrọ n’ọzara iri ụbọchị anọ. Ekwensu nwara Ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa bikwa. Ndị Mmụọ ozi bịakwara nyere ya aka.

Ma mgbe a tụnyesịrị Jọn n’ụlọ mkpọrọ, Jesu bịara na Galili, na-ekwusa Oziọma Chineke, na-asị: “Oge ezuola, ọchịchị Chineke adịla nso; chegharịanụ kwerenụ n’Oziọma.

Igbo Mass readings for February 19 2024, Mọnde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Igbo Mass Readings for February 18 2024, Ụka nke Mbụ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ.

Last Update: March 9, 2023