Igbo Mass Readings for March 9 2025, Ụka nke Mbụ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 9 2025, Ụka nke Mbụ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 26:4-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

Isi Okwu: “Nkwupụta okwukwe nke agbụrụ a họtara ahọta.

Mosis gwara ndị mmadụ ahụ sị: “Onye Ụkọchukwu ga-anara gị abọ ahụ, were ya dọba n’ihu ebe nchụaja Chineke gị. N’ihu Onyenweanyị bụ Chineke gị, Ị ga-ekwupụta ihe ndị a: “Nna m bụ nwa onye Aramịa, bụụrụ ojemba.

O jere n’Ijipt ịchọ ebe ọ ga-eze ndụ. Oge ahụ, ọnụ ọgụgụ ha dị sọ olemole. Ma ebe ahụ ka ha nọrọ mụbaa, ghọọ nnukwu obodo siri ike ma ndị ljipt mesoro anyị omume ọjọọ.

Ha ekweghị ka obi ruo anyị ala. Ha jiri aka ike sogide anyị ka ohu. Mana anyị bekuru Onyenweanyị bụ Chineke nke nna anyị ha. Onyenweanyị nụrụ olu anyị, hụkwa nsogbu anyị, na ahụhụ na mmegbu a na-emegbu anyị.

Onyenweanyị gbatịrị aka ike Ya, were menye ha oke ọma jijiji, na ihe ịrịba ama na ihe dị egwu, bịa si n’ljipt kpọpụta anyị. Ọ bụ Ya dutere anyị ebe a wee nye anyị ala nke a; ala mmiri ara na mmanụ jupụtara.

Onyenweanyị, ebe a nọ ugbu a, ka m na-eweta mkpụrụ mbụ nke ala I nyere m.” Ị ga-adọba ya n’ihu Onyenweanyị bụ Chineke gị, bịakwa sekpuoro Dinwenụ bụ Chineke gị.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 90: 1-2, 10-15 Az. 15

Azịza: Onyenweanyị, biko nọnyere m na nsogbu m.

1. Onye bi na nchedo nke Onye Kacha Elu,

bịakwa nọrọ n’ime udo nke Onye Ji Ike Niile,

na-asị: “Onyenweanyị: Gị bụ ebe mgbaba m,

ebe siri ike m, Chineke m,

Onye m tụkwasara obi.” Azịza.

2. Ihe ọjọọ agaghị adakwasị gị.

Ọrịa ogbu n’igwe agaghị erute gị.

O nyela ndị Mmụọ ozi Ya iwu,

ka ha chekwaba gị n’ụzọ gị niile. Azịza.

3. Ha ga-apara gị n’aka,

ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.

Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ.

Ị ga-eji ụkwụ zọgbuo agụ okpo, na agụ iyi. Azịza

4. Aga M azọpụta ya n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe m nọ.

Aga M echekwa ya n’ihi na ọ maara aha M.

Mgbe ọ kpọkuru M, aga M aza ya sị: “Anọnyeere M gị”.

Aga M azọpụta ya n’ahụhụ, nyekwa ya otito. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 10:8-13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Nkwupụta okwukwe ndị kwere na Kristi.

Akwụkwọ Nsọ kwuru sị: Okwu ahụ dị gị nso. Ọ dị gị n’egbugbere ọnụ. Ọ dịkwa gị n’ezi obi. Okwu ahụ bụ okwu nke okwukwe nke anyị na-ekwusa. N’ihi na, ọ bụrụ na iji ọnụ gị kwupụta na Jesu bụ Onyenweanyị; ọ bụrụkwa na iji obi gị kwere na Chineke bilitere Ya n’ọnwụ, a ga-azọpụta gị! Ibu okwukwe n’obi na-eduba n’ịgụnye mmadụ n’onye ezi omume.

Ikwupụta ya n’ọnụ na-eduba na nzọpụta. Akwụkwọ Nsọ kwuru sị: “Onye kwere na Ya, ihere agaghị eme ya.” Ọ pụtara na e nweghịkwa ngụbọsị ọzọ n’etiti onye Juu na onye Grik. Ha niile nwere otu Onyenweanyị ahụ, Onye jupụtara n’amara maka ndị niile na-akpọku Ya. “Onye ọ bụla kpọkuru aha nke Onyenweanyị a ga-azọpụta ya.”

MBEKU – Matiu 4:4

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Ọ bụghị sọ na nri ka mmadụ ji adị ndụ, kama ọ bụ site n’okwu ọ bụla si n’ọnụ Chineke pụta.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 4:1-13

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Isi Okwu: Jesu jupụtara na Mmụọ Nsọ wee hapụ Jọdan; Mmụọ ewee duru Ya gaa n’ọzara.

Ma ebe ọ bụ Jesu jupụtara na Mmụọ Nsọ, O siri na Jọdan laghachi. Mmụọ Nsọ wee duru ya baa n’ọzara. Ọ nọrọ iri ụbọchị anọ n’ọzara; ekwensu bịara nwaa Ya ọnwụnwa.

N’oge ahụ, O buru ọnụ, e righị ihe ọ bụla. Ma mgbe oge obubu-ọnụ ahụ gasịrị, agụụ gụrụ Ya. Ekwensu wee sị Ya: “Ọ bụrụ na Ị bụ Nwa Chineke, tie iwu ka nkume a ghọọ ogbe-achịcha.” Jesu zara ya, sị: “E dere ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eri wee dị ndụ.”

E mesịa, Ekwensu duuru Ya rịgoo ebe dị oke elu, were otu ntabi anya gosi Ya alaeze niile dị n’ụwa wee sị ya: “Aga m enye Gị ike na akụ na ụba niile dị n’ụwa, bịakwa nye Gị ugwueze niile dị n’ime ụwa, ma ọ bụrụ na Ị ga-akpọrọ m isiala bịakwa gbuoro m ikpere ala.

N’ihi na ọ bụ m ka e nyere ha n’aka. Onye ọ masịrị m, m nye. Ya mere, ọ bụrụ na Ị kpọọrọ m isiala, ụwa niile ga-abụ nke Gị.” Jesu wee zaa sị ya: “E deela ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Ọ bụ naanị Onyenweanyị Chineke gị ka ị ga-akpọrọ isi ala; ọ bụkwa naanị Ya ka ị ga-efe.”

E mesịa, Ekwensu wee duru Jesu gaa Jerusalem, wee mee ka Ọ rịgoruo n’ebe dị oke elu nke Ụlọ Nsọ Chineke. Ekwensu wee sị Ya: “Ọ bụrụ na Ị bụ Nwa Chineke, si n’elu ebe a wụda n’ala!

N’ihi na e deela ya n’Akwụkwọ Nsọ sị: “Ndị Mmụọ ozi Ya ka Ọ ga-enye iwu ịghọta Gị!” Ọzọ kwa, “Ha ga-ekuru Gị n’elu ubu-aka ha, ka Ị ghara ịpịabi ụkwụ Gị na nkume.”

Ma Jesu zara ya, sị: “E kwuola ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “A nwala Onyenweanyị, bụ Chineke gị.” Mgbe Ekwensu nwalesịrị Jesu n’ụzọ dị iche iche, o nyetụrụ Ya efe, na-achọ ohere ọzọ ọ ga-eji nwaa Ya.

Igbo Mass readings for March 10 2025,

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for March 9 2025, Ụka nke Mbụ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ.

Last Update: March 9, 2023