Page Contents
- 1 Igbo Mass Readings for September 23, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị
- 2 IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ 30:5-9.
- 3 ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 119:29, 72, 89, 101, 104, 163.
- 4 MBEKU Jọn 8:12
- 5 Oziọma maka September 23, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị – Luk 9:1-6
- 6 Igbo Catholic Readings for September 23, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị
Igbo Mass Readings for September 23, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị
Nke a bu Igbo Mass Readings maka September 23, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Anọ N’oge Na-Adanyeghị N’emume nke ndị Catholic Lectionary wetara ụnụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ 30:5-9.
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ilu
Okwu niile nke Chineke bụ eziokwu. Ọ bụ ọta n’ebe ndị niile gbakwutere ya nọ. A tụkwasịla ihe ọbụla n’okwu ya ka ọ ghara ịbara gị mba, ị bụrụ onye asị.
Ihe abụọ ka m na-arịọ gị; ajụla inye m ha tupu m anwụọ. Wepụ asị na okwu ụgha n’ebe m nọ; emela ka m bụrụ ogbenye mọbụ ọgaranya; kama nye m nri ga-ezuru m.
Ka m ghara iriju afọ cheere chi m aka mgba na-asị, “Onye bụ Chineke?” Ka m ghara ịbụ ogbenye nke ga-eme ka m zuo ohi metọọ aha Chineke m.
ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 119:29, 72, 89, 101, 104, 163.
Azịza: Onyenweanyị okwu Gị bụ mpanaka na-edu m, bụrụkwa ìhe n’ụzọ m.
- Ekwela ka m soro ụzọ na-akwughị ọtọ
Ma nye m amara nke iwu gị. Azịza.
2. Iwu siri n’ọnụ gị pụta ka mma
karịa puku kwụrụ puru ọlaọcha na ọlaedo. Azịza.
3. Okwu gị kwụ chịm ebeebe
O guzosiri ike n’eluigwe O Onyenweanyị. Azịza.
4. Esepụla m ụkwụ n’ụzọ ọjọọ niile
Ka m wee nwee ike idobe okwu gị. Azịza.
5. Iwu gị niile enyela m nghọta
Ya mere akpọrọ m ụzọ aghụghọ niile asị. Azịza.
6. Akpọrọ m okwu ụgha asị
Mana ahụrụ m iwu gị n’anya. Azịza.
MBEKU Jọn 8:12
Alleluịa, Alleluịa:
Jesu gwara ha okwu ọzọ sị, Abụ m ìhe nke ụwa onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhe nke ndụ.
Alleluịa.
Oziọma maka September 23, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị – Luk 9:1-6
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu were kpọkọta ndịozi iri na abụọ ahụ, nye ha ike na ọchịchị n’ebe ndị mmụọ ọjọọ niile nọ, na ike ịgwọ ọrịa dị iche iche. O wee zipụ ha ikwusa Alaeze Chineke, na ịgwọ ọrịa dị ịcheiche.
O wee sị ha, “Ụnụ ejila ihe ọbụla maka ije ụnụ. Ụnụ ejila mkpọ, mọbụ akpa, mọbụ ogbe achịcha, mọbụ ego. Ụnụ achịkwala uwe abụọ.
Ụlọ ọbụla ụnụ banyere, nọgidenụ ebe ahụ, ruo mgbe ụnụ ga-apụ n’obodo ahụ. Ma ebe ọbụla a na-anabataghị ụnụ, mgbe ụnụ na-apụ n’obodo ahụ, tichapụ aja dị n’ọbụụkwụ ụnụ, ka ọ bụrụ ihe akaebe megide ha.
Ụmụazụ ahụ wee pụọ, gazuo obodo nta niile, na-ekwusa oziọma, na-agwọkwa ndị mmadụ nrịanrịa, ebe niile.
IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Tuezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị
IHE ỌGỤGỤ ECHI: September 24, 2020, Tọọzdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị
Igbo Catholic Readings for September 23, 2020, Wednezdee Izu Nke Iri Abụọ na Ise N’oge Nkịtị
Sonyere anyị na Facebook na Catholic Igbo Lectionary