Igbo Mass Readings for Wednesday Izu Uka Di Aso

WEDNESDAY:IZU UKA DI ASO

EKPERE MMEGHE:

Nna, na nzube nke oru nzoputa Gi, Nwa Gi Jesu Kristi narala onwu n’elu obe iji zoputa anyi n’ike nke onye iro. Mee ka anyi bia keta oke n’otito nke mbilite n’onwu ya. Site na Dinwenu Jesu Kristi ….
Ihe Ogugu nke mbu. 50: 4-9
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwo onye amuma Aizaya
Yahweh Chineke enyela m ire nke ndi azuru azu ka m wee mara ka e si eji okwu agba onye ume dara mba ike. Ututu obula, o na-akpolite m, ka m nuru ihe, ka m gee nti dika onye a na-akuziri ihe. Oseburuwa Chineke emegheela nti m, enupughi m isi, alaghi mazu. Enyere m ndi na-aku mihe azu m, nye ndi na-ado m aka n’ahuonu, agba m. Ezoghi m ihu m maka mkpari na aso ha na abu m. Maka na Oseburuwa Chineke na-enyere m aka, ya mere, na adaghi m mba. Edotere m ihu m ka okwute, ama m na ihere agaghi eme m.
Onye na agbara maka eben nso. Kedu onye mu na ya ga-ana aka? Kedu onye bu onye iro m? Ya kpudebe nso. Lee, Yahweh Chineke m na-enyere m aka, onye ga-ama mikpe? Ha niile ga erekacha ka uwe akika tara.

ABUOMA NA AZIZA: Ps: 69:8-10, 21-22, 31, 33-34.
Aziza: Onyenweanyi zaa m na nnukwu ihunanya gi.

  1. O bu maka gi ka m jiri na-edi mkpari,
    nke na-eme m ihere,
    nke na-eme ka m buru onye obia n’etiti umunne m,
    na-emekwa m onye mbiambia n’umunne m ndi ozo;
    Inwe mmasi nke ulo gi eriela m obi,
    mkpari nke ndi na akpari gi na-adakwasi m. Az./
  2. Mkpari agbawala obi m,
    Echere m na m gaara enweta ntasiobi, mana ahughi m.
    Ha nyere m nsi ka m rie, mgbe aguu guru m,
    mgbe akpiri kporo m nku
    ha nyere m mmanya gbakara agbaka ka m nuo. Az./
  3. Aga m eji ukwe too aha nke Chineke,
    aga m eji ekele m bulie aha ya,
    mgbe ahu ndi umeala hu nke a, ha ga-anuri,
    Ka unu wee nwee ogologo ndu unu ndi na-acho Chineke!
    Onyenweanyi na-ege ndi niile no na mkpa nti mgbe niile,
    o naghi echezo ndi nke ya eji eji. Az./

MBEKU:
Az./
Ekele diri gi Eze anyi, onye rubeere Nna ya isi, O naara onwu ya n’elu obe dika ezi nwaturu. Az. /

OZIOMA: 26:14-25.
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Matiu dere.
Mgbe ahu otu onye n’ime umuazu iri na abuo ahu a na-akpo Judas Izkariot jekwuru ndi isi nchu aja juo ha si: “Gini ka unu ga-enye m ma m rara ya nye unu?” Ha wee kwuo ya iri ego olaocha ato. Bidozie n’oge ahu gaba, Judas malitere choba uzo o ga-esi rara ya nye. N’ubochi mbu nke oriri Achicha na ekoghieko ndi na-eso uzo Jesu biakwutere ya juo ya si: “Olee ebe i ga-acho ka anyi kwadooro gi maka oriri Ngabiga?” Jesu siri ha: “Gakwurunu otu nwoke n’ime obodo, gwanu ya na onye nkuzi kwuru si: ‘Oge madila nso, mu na ndi na-eso uzo m ga-eri oriri Ngabiga n’ulo gi.” Ndi na-eso uzo ya mere ihe Jesu gwara ha. Ha wee kwadoo oriri Ngabiga. N’uhuruchi ya, ya na ndi umuazu ya iri na abuo ahu no n’oche nri. Mgbe ha na-eri nri, Jesu siri ha, “Ana magwa unu eziokwu, otu onye n’ime unu ga arara m nye.” Okwu a wutere ha nke ukwuu, ha wee malite juba n’otu n’otu si: “Onyenweanyi, o bu m?
O zara si: “Onye mu na ya manyekotara aka n’efere nri ga-arara m nye. Nwa nke mmadu na-ala dika Akwukwo Nso kwuru banyere ya. Ma ahuhu ga adiri onye ahu, onye a ga-esite n’aka ya rara nwa nke mmadu nye. O gaara akara ya mma ma a si na a mughi ya amu.” Judas onye ahu rara ya nye juru ya si, “O bu m, Nnamukwu?” O zara ya si, “i kwuola ya na onwe gi.”

EKPERE NHUNYE:
Dinwenu, nara onyinye anyi na-ehunyere Gi n’oge a anyi na-eme emume ihe omimi nke ahuhu na onwu nke Nwa Gi. Mee ka anyi keta oke na ndu ebighi-ebi nke o riterele anyi, n’ihi na O bu Dinwenu ebighi-ebi ebighi-ebi. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO:
Nna ji ike niile, emume nke Eucharistia na ekwuputa onwu nke Nwa Gi. Mee ka okwukwe anyi n’ike nzoputa ya na abawanye. Meekwa ka nchekwube anyi na ndu nke o kwere anyi na nkwa siwanyekwuo ike. Anyi na-ario Gi ihe ndi a n’aha Kristi Dinwenu anyi. Amen.

error: Content is protected !!
Open chat
1
Catholic Lectionary
Hello 👋
How can I help you?