Igbo Mass Readings for Wednesday of Second Week of Lent

WEDNEZDEE IZU UKA NKE ABUO N’OGE NCHETA AHUHU KRISTI

EKPERE MMEGHE
Nna, kuziere anyi ibi ezi ndu, were enyemaka Gi kwalite anyi ma dubata anyi na ndu ebighi ebi. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi …

Ihe Ogugu nke mbu: 18:18-20
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwo onye Amuma Jeremaya
Ndi obodo Judah na umu afo Jerusalem kwuru si, “Bia ka anyi tuo aro ojoo banyere Jeremaya n’ihina ndi ukochukwu ga-enye anyi nkuzi, ma o bu ndi amamihe ga-enye anyi ndumodu, ma o bu ndi amuma ga na-agwa anyi okwu agaghi ako anyi, ma gharakwa ige okwu ya obula.”
Gee m nti O Yahweh, ma nuru aririo m. E ji ihe ojoo akwu ugwo iheoma? Ha egwuorola m olulu, cheta otu m siri kwuru n’ihu gi na-ekwu iheoma banyere ha, ka m were wepuru ha iwe gi.

ABUOMA NA AZIZA: Ps: 31: 5-6, 14, 15-16.
Aziza: Site na eziomume gi zoputa m.

  1. Ekwekwala ka m daba n’onya ha kweere m
    N’ihina gi bu ebe mgbaba m
    N’aka gi ka m tinyere mmuo m,
    I gbaputala m Oseburuwa,
    Chineke nke eziokwu. Az./
  2. Ana m anu nkwuto ha niile,
    iyi egwu si n’akuku niile abia;
    Ha na-agbako imegide m;
    Ha na-agba izu iwere ndu m. Az./
  3. Na gi ka m tukwasiri obi, O Oseburuwa.
    Ana mekwu si, “Ginwa bu Chineke m.”
    Ubochi m niile di gi n’aka;
    Zoputa m n’aka ndi iro m na ndi na emekpa m ahu. Az/
    MBEKU: Lk: 8,15.

Az./
Añuri ga adiri ndi nuru okwu Chineke, were ikwesi ntukwasiobi na obi di mma jidesie ya ike. Az./

OZIOMA: 20:17-28

Ihe ogugu ewetara n’ Ozioma di aso nke Matiu dere.

Mgbe Jesu na-aga Jerusalem, o kpoputara umuazu iri na abuo ahu iche si ha, “Lee anyi na aga Jerusalem ebe a ga-arara Nwa nke mmadu nye n’aka ndi isi nchuaja na ndi ode akwukwo. Ha ga-ama ya ikpe onwu. Ha ga-arara ya nye ndi mba ozo ka ha mee ya akaja, pia ya ihe, wee kpogbue ya n’obe. Ma ubochi nke ato, a ga-eme ka o si n’onwu bilie”. Mgbe ahu, nne umu Zebedi kpooro umu ya ndiikom abuo biakwute Jesu. O sekpuuru ala rio Jesu aririo. Jesu juru ya si, “Gini ka i choro?” O zara si, “Kwe m nkwa na umu m abuo ndi a ga-ano otu n’aka nri, nke ozo n’aka ekpe n’alaeze gi. Ma Jesu gwara ha si, “Unu amaghi ihe unu na-ario.
Unu nwere ike iñu iko ahuhu nke mu onwe m ga-añu?” Ha si ya “Anyi nwere ike.” Jesu siri ha, “N’eziokwu unu ga-añu iko m ga-añu, mana o bughi m ka o diiri ikwu onye ga-ano n’aka nri m ma o bu n’aka ekpe m, kama o bu ndi niile Nna m kwadooro ya. Mgbe umuazu ya mmadu iri ndi o zo nuru nke a, ha wesara umunne abuo ahu iwe nke ukwu. Jesu kpokotara ha si, “Unu amarala na ndi na-achiachi n’etiti ndi mba ozo na-eji mmegbu na-achi ha dika ndi nwe ha. Ndi ukwu n’etiti ha na-egosikwa na ike di ha n’aka. Ma o gaghi adi otu a n’etiti unu. Kama onye obula na acho ka emee ya onye ukwu n’etiti unu ga-abu onye na ejere unu ozi. Ozokwa, onye obula nke na-acho ibu onye mbu n’etiti unu ga-abu ohu unu niile, dika o si buru na Nwa nke mmadu abiaghi ka a gbaara ya odibo, kama ka o gbara ndi ozo odibo, bia werekwa ndu ya nye maka mgbaputa nke otutu mmadu.”
EKPERE NHUNYE
Dinwenu, nara aja nke a, ma site n’inyerita onyinye anyi na Gi tohapu anyi n’ibu ohu njo obula. Anyi na-ario Gi ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.
EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO
Dinwenu Chineke anyi, mee ka Eucharistia nke a I nyere anyi dika mbe nke ndu ebighi ebi, nyere anyi aka inweta nzoputa. Mezuoro anyi ihe ndi a site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

error: Alert: Content is protected !!