Igbo Mass Readings for February 21 2024, Wenezde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka February 21 2024, Wenezde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Jona

Okwu nke Yahweh bịakwutere Jona nke ugboro abụọ. Ọ sịrị, “Kulite, gaa na Ninive, obodo ukwu ahụ, gwa ha okwu m ga-agwa gị.” Jona biliri gaa Ninive n’irubeisi n’okwu nke Chineke.

Ninive bụ nnukwu obodo, ọ na-ewe mkpụrụ ụbọchị atọ iji gafe uhie ya. Jona jiri otu ụbọchị gagharịa n’ime obodo ahụ na-ekwu na-asị; “Ọ Fọdụrụ naanị iri ụbọchị anọ ka e mebie Ninive.”

Ndị obodo Ninive bịara kwenye na Chineke, wee tie iwu na onye ọbụla ga-ebu ọnụ, yiri akwa iru ụjụ bido n’onye ukwu ruo n’onye nta ha. Mgbe akụkọ a rutere onye eze nke Ninive, o siri n’oche eze nke ya bilie, yipụ efe eze ya, bịa chịrị akwa iru ụjụ yiri, nọdụkwa ọdụ na ntụ.

O mere ka e kwupụta ya n’obodo Ninive niile site n’iwu ya na ndịisi ọchịchị ya tiri sị: “O nweghị mmadụ ma ọ bụ anụmaanụ ọbụla a na-azụ ga-eri ihe ọbụla. Ka mmadụ niile yiri akwa iru ụjụ wee kpọkuo Chineke n’ike ha niile.

Ka onye ọbụla hapụ ụzọ ọjọọ ya niile nakwa mkpagbu ya niile. Onye maara ma Chineke ọ ga-agbanwe obi ya, hapụ iwe ya dị ọkụ ka anyị ghara ịla na iyi?”

Mgbe Chineke hụrụ mkpebi ha, otu ha siri chegharịa na mmehie ha niile, Ọ gbanwere obi ya wee hapụ ịta ha ahụhụ ahụ ọchọburu ịta ha.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 51: 3-4, 12-13, 18-19.

Azịza: Ị naghị ajụ obi gbawara agbawa na nke loghara elogha.

1. Meere m ebere O Chineke site n’ịhụnaanya gị,

site na nnukwu obi ebere gị hichapụ njọ m niile,

Sachapụ mmehie m niile,

wụchapụ m na njọ m. Azịza

2. Chineke, kenye obi dị ọcha n’ime m,

tinye n’ime m mmụọ ọhụrụ na nke siri ike.

Achụpụkwala m n’ihu gị,

anapụkwala m mmụọ nsọ gị. Azịza

3. Ị naghị enwe mmasị ọbụla n’aja,

Aja nsureọkụ anaghị atọ gị ụtọ,

Aja a na-achụrụ Chineke bụ obi gbawara agbawa,

Ị naghị ajụ obi gbawara agbawa na nke loghara elogha. Azịza

MBEKU – Ps. 95,8.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 11:29-32

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Mgbe igwe mmadụ ahụ na-abawanye, Jesu bidoro na-ekwu sị, “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ; ọ na-achọ ihe ama, ma ọ dịghị ihe ama a ga-enye ya karịa ihe ama nke Jona.

N’ihi na otu Jona si bụụrụ ndị obodo Ninive ihe ama, otu ahụ ka Nwa nke mmadụ ahụ ga-esi bụụrụ ọgbọ a ihe ama. N’ụbọchị ikpe ahụ, Ezenwaanyị Ndịda ugwu ga-ebili so ọgbọ a guzo n’ikpe, kpegbue ya.

N’ihi na o si nsọtụ nke ụwa bịa ịnụ okwu amamihe Solomọn. Ma lee, ihe kariri Solomọn nọ ebe a. Ndị obodo Ninive ga-eso ọgbọ a kulie n’ụbọchị ikpe, kpegbue ya; n’ihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkụzi Jona, ma lee, ihe ka Jona dị n’ebe a.”

Igbo Mass readings for February 22 2024, Emume Oche Pita dị Asọ

Igbo Mass Readings for February 21 2024, Wenede Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

Last Update: September 4, 2021