Igbo Mass Readings for December 7 2022, Wednezde Izu Abụọ n’Oge Adventi

Igbo Mass Readings for December 7 2022, Wednezde Izu Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 7 2022, Wednezde Izu Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.

Bible quotations for Igbo Mass Readings for December 7 2022, Wednezde Izu Abụọ n'Oge Adventi
Igbo Mass Readings for December 7 2022, Wednezde Izu Abụọ n’Oge Adventi

EKPERE MMEGHE

Nna ji ike niile, anyị nọ n’olileanya maka ike ọgwụgwọ nke Kristi Nwa Gị. Ekwela ka ume daa anyị mba n’ihi adịghị ike anyị n’oge anyị na akwado maka ọbịbịa Ya. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi.

Ihe Ọgụgụ Nke Mbụ – 40:25-31

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Onye nsọ na-ajụ sị, “Onye ka ụnụ ga-eji tunyere m, nke na mụ ga-adị ka ya? Lee anya n’elu ka ịhụ onye kere ihe ndị a niile?

Ọ bụ onye ahụ na edupụta ha n’igwe na akpọ nke ọbụla aha ya. Site n’ike aka ya na ike ya dị egwu o nweghị nke furu efu.

O! Jekọb gịnị mere iji na-ekwu, o! Izrel gịnị mere i ji na-atamu sị, “Yahweh amaghị nsogbu m, ọ na-elegha oke ruuru m anya?”

Ọ bụ na ụnụ amaghị? ọ bụ na ụnụ anụbeghị? Chineke bụ Chukwu dị ebeebe, onye kere nsọtụ ụwa niile.

Ọ naghị ada mba, nke ike na-agwụ ya, nghọta ya dị omimi. Ọ na-enye ndị dara mba ike, na-emekwa ka ndị na enweghị ume nwee ume.

Ọbụladị ndị ụmụokorobịa ga-ada mba, ike ga-agwụkwa ha. Ike ga-agwụkwa ndị na eto eto.

Ma ndị niile chekwubere na Chukwu ga-enweta ike ọzọ. Ha ga-efe n’elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha. Ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 103, 1-2. 3-4, 8.10

Azịza: Gozie Onyenweanyị, Mkpụrụobi m.

1.Gozie Onyenweanyị mkpụrụobi m,

gozie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n’ime m!

Gozie Onyenweanyị mpkụrụobi m,

echezọkwala obi ebere ya niile. Azza.

2.Nke o ji gbaghara njị gị niile,

ma gwọọ ọrịa gị niile,

nke o ji si n’olulu zọpụta ndụ gị,

nke o ji were ịhụnaanya na obi ebere kpube gị okpueze. Azza.

3. Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya

ọ naghị ewe iwe ngwa ngwa, ịhụnaanya ya dị ukwuu

Ọ naghị emeso anyị, ọ naghị ata anyị ahụhụ,

dịka amamikpe anyị na njọ anyị si dị. Azza.

MBEKU

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Onyenweanyị na-abịa ịzọpụta anyị, añụrị ga-adịrị ndị dị nkwadobe izute ya.

ALLELUỊA.

Oziọma – Matiu 11: 28-30

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu kwuru sị: “Bịakwutenụ m ụnụ niile ndị na adọgbu onwe ụnụ n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, aga m enye ụnụ ezumike.

Nyaranụ ịnyagba nke m n’olu ụnụ; mụtakwanụ ihe n’omume m, n’ihina adị m nwayọọ dịkwa obi umeala.

Ụnụ mee otu a, obi ụnụ ga-enweta ezumike. N’ihi na ịnyagba m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ, mee ka Onyinye nke a anyị ji okwukwe na ịhụnaanya na-ehunyere Gị ghọọrọ anyị aja na-enweghị ngwụcha iji nye Gị otito. Meekwanụ ka ha bụrụ n’ezie Eucharịstịa anyị na nzọpụta anyị. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ, Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Chineke Onye ebere, mee ka Eucharịstịa nke a wetara anyị enyemaka Gị, zọpụta anyị na njọ anyị ma kwadokwa anyị maka ọmụmụ nke Onye nzọpụta anyị bụ Dinwenụ ebighị ebi, ebighị ebi.

Subscribe to Receive Daily Mass Readings via Email

[newsletter_form type=”minimal” lists=”1″]

Follow us on Social Media:

Today’s Mass Readings in Igbo Language – December 7 2022, Wednezde Izu Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị Catholic Lectionary

Catholic Lector
Catholic Lector is the founder of Catholic Lectionary. He is a passionate Writer, a Web Developer, a Computer expert and a part-time Blogger who loves to write a lot of contents on Catholicism in his free time. He is also the co-founder of the price review website: https://jumiaprice.com; where he shares a lot of product price contents.
error: Alert: Content is protected !!

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.