Igbo Mass Readings for January 22 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 22 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:1-3, 15-17

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru

Melkizedek eze nke Salem, onye nchụaja nke Chineke kacha elu, zutere Abraham ka o si agha o gburu ndịeze na-alọta, ma gọzie ya. Abraham nyekwara ya otu ụzọ n’ụzọ iri ihe niile nke o nwere.

Ọ bụ onye mbụ site na ntụgharị nke aha ya, “Eze nke eziomume”. Ọ bụkwa eze nke Salem nke bụ, “eze nke udo”. O nweghị nne mọbụ nna, nke ọ na-enwe agbụrụ.

O nwekwaghị isi mbido nke ọ na-enwe isi njedebe. O yiri Nwa nke Chukwu. Ọ ga-abụgide onye nchụaja ruo ebeebe. Ihe anyị na-ekwu pụtara ihe karịa mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara.

Onye bụụrụ ụkọchukwu n’esiteghị n’ọchịchọ nke iwu, gbasara ọmụmụ nke anụ ahụ, kama, ọ bụ site n’ike ndụ na-enweghị mbibi. A gbara akaebe banyere ya n’akwụkwọ nsọ sị, “Ị bụ ụkọchukwu ebeebe, n’usoro nke Melkizedek”.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 110:1, 2, 3, 4.

Azịza: Ịbụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek

1. Dinwenụ gwara gị nna m ukwu sị,

“Nọrọ ala n’aka nri m,                     

aga m eme ndịiro gị ihe mgbakwasa ụkwụ gị.”

Azịza: Ịbụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek

2. Onyenweanyị, ga-amanye ndịiro gị niile,

ka ha nọrọ n’okpuru ọchịchị gị na Zayọn.

Azịza: Ịbụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek

3. Ugwueze bụ nke gị bido n’ụbọchị a mụrụ gị n’elu ugwu dị nsọ,

ị bụ eze site n’afọ, bido n’isi ụtụtụ nke ndụ gị.

Azịza: Ịbụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek

4. Onyenweanyị añụọla iyi nke na ọ gaghị ala azụ na ya,

ị bụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek.

Azịza: Ịbụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Mgbe ụnụ nụrụ okwu Chineke nke anyị wetaara ụnụ, ụnụ naara ya, ọ bụghị dịka okwu mmadụ kama dịka ihe ọ bụ n’onwe ya, okwu nke Chineke.

Alleluia.

OZIỌMA – 3:1-6

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Jesu banyere ọzọ n’ụlọnzukọ ha, ma otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọ ebe ahụ. Ụfọdụ mmadụ nọkwa ebe ahụ na-eche ka ha mara ma ọ ga-arụ ọrụ ịgwọ mmadụ n’ụbọchị Sabat, ka ha wee bo ya ebubo.

Jesu sịrị nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Bịa ebe a”. O wee jụọ ndị ahụ sị, “O ziri ezi n’iwu ime iheọma n’ụbọchị Sabat ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ya n’iyi?”

Ma ha gbara nkịtị. Jesu jiri iwe lezuo ha anya. O wutere ya n’ihi obi ịkpọnkụ ha. Ọ sịrị nwoke ahụ: “Gbatịa aka gị”. Ọ gbatịrị ya, aka ya wee dịkwa mma ọzọ.

N’ihi nke a ndị Farisii siri n’ụlọnzukọ pụọ; ha na ndị otu Herọd gbara izu ozigbo ahụ otu ha ga-esi gbuo Jesu.

Igbo Mass Readings for January 23 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for January 22 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.