Igbo Mass Readings for January 21 2026, Wednezde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 21 2026, Wednezde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:32-33, 37, 40-51
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ mbụ nke Samuel
Devid wee sị Sọl, “Onyenwe m, ụjọ atụla onye ọbụla maka onye Filistia nke a! Aga m eje lụso ya agha.” Sọl zara ya sị, “mba! Olee otu ị ga-esi alụso ya agha? Ị bụ nwata.
Ma ya onwe ya bụ onye agha ogologo ndụ ya nile”! Yahweh, onye napụtara m n’aka ọdụm na anụ ndọgbu, ga-anapụtakwa m n’aka onye Filistia nke a.” Sọl wee sị, “Ọ dị mma. Jee Osebụrụwa ga-anọnyekwara gị.”
O weere mpanaka ọ na-eji achị atụrụ, tụtụrụkwa okwute ise na-akwọ mụrụmụrụ n’ime mmiri iyi, tinye ha n’ime akpa ya. O were ebe ya, pụọ izute Goliat. Onye Filistia ahụ na onye na-eburu ya ọta ji nwayọọ na-abịa nso n’ebe Devid nọ.
Mgbe onye Filistia ahụ bịaruru nso, o lezuru Devid anya, wee lelịa ya, n’ihina ọ bụ nwata, makwaa mma ile anya. O wee sị Devid, Gịnị ka i ji osisi nke a ịkpa n’aka eme? I chere na abụ m nkịta nke na i ji osisi abịa ebe m nọ?” O jiri aha chi ya kpọọ Devid iyi.
O cheere Devid aka ọgụ, sị, “Bịa, ka m dorie gị, were anụ gị fesaara ụmụnnụnụ na anụmaanụ nke ọhịa.” Devid zara Goliat, sị, “I ji mmaagha, ogologo ube na mkpụmkpụ ube na-abịakwute m. Ma mụ onwe m ji aha Yahweh, Chineke igwe ndịagha na-abịakwute gị, nke bụ Chineke usuu ndịagha Izrel, onye I leliri.
Ụbọchị taa ka Yahweh ga-etinye gị n’aka m. Aga m egbukwa gị, bepụ gị isi. Aga m ewerekwa ozu ndịagha Filistia nye ụmụnnụnụ nke igwe na anụmaanụ nke ọhịa ka ha jiri mere ihe oriri.
Mgbe ahụ ụwa niile ga-amata na Izrel nwere Chi. Mmadụ niile ga-amata na Izrel na ọ bụghị mmagha na ube ka Yahweh ji enye mmeri, n’ihina Yahweh nwe mmeri n’agha nke a.
Ọ ga-enyekwa ụnụ niile n’aka anyị”. Goliat ebilie ijeru Devid nso ọzọ, Devid mere ngwa, gbaa ọsọ, ruo n’ọgbọ agha ndị Filistia ibuso Goliat agha. O tinyere aka n’ime akpa ya, wepụta otu okwute ahụ gbaa ya Golia n’egedege ihu. Okwute ahụ baruru n’ụbụrụ ya.
Goliat wee daa, kụọ ihu n’ala. Otu a ka Devid siri jiri ebe na okwute gbuo Goliat, na-ejighị mmagha. Devid gbaara ọsọ, garuo ebee Goliat tọgbọrọ zọdo ya ụkwụ, mịrị mmaagha Goliat n’ọbọ ya, bepụ ya isi, ọ nwụọ. Mgbe ndị Filistia hụrụ na dike ha anwụọla, ha wee gbalaga.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 144:1, 2, 9-10
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa, nkume m.
1. Ngọzi dịrị Osebụrụwa, nkume m,
Onye na-azụ aka m maka ịlụ ọgụ
mkpịsị aka m maka ibu agha.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa, nkume m.
2. Ọ bụ ya bụ ịhụnanya m, na onye nkwado m
ụlọ mgbaba m, na onye nzọpụta m,
ọ bụ na ya ka m na-ezo onwe m,
ekpeke m,ọo na-eme ka mba niile rubere m isi.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa, nkume m.
3. Onyenweanyị, aga m ekwere gị ukwe ọhụrụ
Aga m eji ụbọ akwara kweere gị ukwe
Ọ bụ gị na-enye ndịeze mmeri
Nakwa azọpụta Devid nwaodibo gị.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa, nkume m.
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Mgbe ụnụ nụrụ okwu Chineke nke anyị wetaara ụnụ, ụnụ naara ya, ọ bụghị dịka okwu mmadụ kama dịka ihe ọ bụ n’onwe ya, okwu nke Chineke.
Alleluia.
OZIỌMA – 3:1-6
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Jesu banyere ọzọ n’ụlọnzukọ ha, ma otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọ ebe ahụ. Ụfọdụ mmadụ nọkwa ebe ahụ na-eche ka ha mara ma ọ ga-arụ ọrụ ịgwọ mmadụ n’ụbọchị Sabat, ka ha wee bo ya ebubo.
Jesu sịrị nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Bịa ebe a”. O wee jụọ ndị ahụ sị, “O ziri ezi n’iwu ime iheọma n’ụbọchị Sabat ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ya n’iyi?”
Ma ha gbara nkịtị. Jesu jiri iwe lezuo ha anya. O wutere ya n’ihi obi ịkpọnkụ ha. Ọ sịrị nwoke ahụ: “Gbatịa aka gị”. Ọ gbatịrị ya, aka ya wee dịkwa mma ọzọ.
N’ihi nke a ndị Farisii siri n’ụlọnzukọ pụọ; ha na ndị otu Herọd gbara izu ozigbo ahụ otu ha ga-esi gbuo Jesu.
Igbo Mass Readings for January 22 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for January 21 2026, Wednezde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.