Igbo Mass Readings for April 24 2024, Wenezde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 24 2024, Wenezde n’ime Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:24-25; 13:1-5

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Okwu Chineke a na-aga n’ihu, na-agbasa ebe niile. Mgbe Banabas na Sọl rụchara ọrụ ha na Jerusalem, ha kpọọrọ Jọn onye a na-akpọkwa Mak laghachi.

N’ime nzukọ Kristi nke dị n’Antiọk, e nwere ọtụtụ ndị amụma na ndị nkuzi. Ndị a bụ Banabas, Simiọn, onye a na-akpọ Nịga, Lushiọs, onye Saịrin, Manen bụ otu onye n’ime ndị obi Herọd, bụ onye na-achịrị ndị Rom obodo anọ, na Sọl.

Otu ụbọchị, ka ha nọ na-ekpe ekpere na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ gwara ha sị, “Wepụtaranụ m Banabas na Sọl iche, maka ịrụ ọrụ nke m kpọrọ ha ka ha rụọ.”

Oge ha kpechara ekpere, buchakwa ọnụ, ha bikwasara ha aka n’isi zipụ ha. Ebe Mmụọ Nsọ zipụrụ ha, ha gbadara Selushịa, si ebe ahụ banye ụgbọ mmiri gbadaa Saịprọs. Ka ha ruru Salamis, ha gbasara okwu Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 67: 2-3,5, 6, 8.

Azịza: Ka mba niile too Gị O Chineke.

1. Ka Chineke gosi anyị obiọma ya ma gọzie anyị,

ka o mee ka ihu ya chakwasị anyị,

n’ihi n’oge ahụ ka ụwa ga-ekwupụta ụzọ gị niile,

mba niile ga-amatakwa ike nke nzọpụta gị. Azịza

2. Ka mba niile tie mkpu ọñụ ma kweekwa ukwe añụrị,

n’ihina iji ikpe nkwụmọtọ

na-ekpe ndị mmadụ ikpe,

Ị na-achị mba niile dị n’ụwa. Azịza

3. Ka mba niile too gị, O Chineke

ka mba niile too gị!

Ka Chineke gọzie anyị,

ka a tụọrọ ya egwu ruo na ngwụcha ụwa niile. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Kristi bilitere n’ọnwụ, ma mee ihe niile ka ọ dị ọ hụrụ, O gosila ebere ya n’ebe mmadụ nọ.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 12:44-50.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kweere na m, ọbụghị na m ka o kwere, kama okwukwe ya bụ n’onye nke zitere m. Onye ọbụla hụrụ m, ahụla onye nke zitere m.

Abịala m n’ụwa dịka ihè, ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ n’ọchịchịrị. Ọ bụrụ na onye ọbụla anụ ihe ndị m na-ekwu ma o dobeghị ha, Ọ bụghị m ga-ekpe ya ikpe; n’ihina abịaghị m ikpe ụwa ikpe, kama ka m zọpụta ụwa.

Onye ọbụla nke jụrụ m, nke jụkwara ịnabata okwu m, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Okwu nke m kwuru ga-ekpe ya ikpe n’ụbọchị ikpeazụ. Ekwughị m ya n’ike nke aka m.

Kama Nna nke zitere m nyere m iwu banyere ihe m ga-ekwu na ihe m ga-aka. Amaara m na iwu ya bụ ndụ ebeebe, maka ihe m na-ekwu bụ site na ntụziaka nke Nna nyere m.”

Igbo Mass readings for April 25 2024, Emume Ncheta Maak Dị Asọ

Igbo Mass Readings for April 24 2024, Wednezde n’ime Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Last Update: April 15, 2022