Igbo Mass Readings for February 1 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 1 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:5-7, 11-15

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru

Ụnụ echefuola okwu nkasiobi ahụ nke Chineke jiri gbaa ụnụ ume dịka ụmụ ya? Sị, “Nwa m ewela nkuzi Onyenweanyị na-akuziri gị dịka ihe mfe, mọbụ daa mba mgbe Onyenweanyị na-ata gị ahụhụ.

Onyenweanyị na-eji ahụhụ akuziri onye ọ hụrụ n’anya, na-apịakwa nwa ọbụla ọ nabatara ụtalị.” Ọ bụ maka inweta ọzụzụ dị mma ka ụnụ ga-eji nwe ndidi. Chineke na-emeso ụnụ omume dịka ụmụ ya.

O nwere nwa ọbụla nna ya na-adịghị akuziri ihe site n’inye ya ahụhụ? Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site n’inye anyị ahụhụ, ọ na-abụrụ anyị ihe ahụhụ. Ma e mechaa ndị ahụ e ziri ihe site n’inye ha ahụhụ na-enweta udo na ndụ eziomume dịka ụgwọ ọrụ.

Ya bụ gbatịanụ aka ụnụ n’anwụ anwụ, mekwaanụ ka ikpere ụnụ na-ama jijiji sie ike, meenụ ụzọ ụnụ ka ọ kwụrụ ọtọ maka ụkwụ ụnụ, ka ụkwụ dara ngwọrọ ghara isi na njikọ dapụ, kama ka a gwọọ ya. Gbaanụ mbọ ka ụnụ na mmadụ niile na-adị n’udo, ya na ndụ ịdị nsọ.

E wepụ ya o nweghị onye pụrụ ịhụ Dinwenụ. Hụkwanụ na o nweghị onye ga-ahapụ inweta amara nke Chineke; na o nweghịkwa onye ga-epupụta dị ka “Mkpọrọgwụ ilu”, weta nsogbu a ga-esi n’ime ya merụọ ọtụtụ mmadụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 103:1-2, 13-14, 17-18

Azịza: Dinwenụ na-egosi obi ebere ya mgbe ebighị ebi, n’ebe ndị na atụrụ Ya egwu nọ.

1. Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,

gọzie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n’ime m!

Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,

echezọkwala obi ebere ya niile. Azịza

2. Dịka nna si emere ụmụ ya ebere,

otu ahụ ka Onyenweanyị si emeso ndị na-atụrụ ya egwu.

Ọ mara ihe e ji wee kee anyị.

ọ na-echeta na anyị bụ ntụ. Azịza

3. Ma n’agbanyeghị, ịhụnaanya nke Onyenweanyị

n’ebe ndị na-atụrụ ya egwu nọ,

na-adị ọkpụ, ọ na-adị ebeebe,

dịka obiọma ya dị n’ebe ụmụụmụ ya nọ.

Ọ na-adịgide oge ọbụla ha na-edobe ọgbụgbandụ ya. Azịza

MBEKU – Eph 1:17-18

Alleluia, Alleluia:

Ka Chineke meghee anya nke obi ụnụ, ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 6:1-6

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Ozọma dị asọ nke Mak dere.

Jesu siri n’ebe ahụ pụọ laghachi n’obodo ya. Ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya. N’ụbọchị Sabat, ọ malitere ikuzi ihe n’ụlọnzukọ ndị Juu. Ọgbagwojuru ndị niile nụrụ nkuzi ya anya, nke mere na ha malitere na ajụ sị, “Kedụ ebe nwoke a si nweta ike ndị a niile?

Olee ụdị amamihe e nyere ya? Lekwaa ọrụ dị ịtụnaanya nke ọ rụrụ, Ọ bụ na ọ bụghị onye ọkụntu ahụ. Nwa Marịa nwanne Jemis, Joses, Juud na Saịmọn?” Ọ bụ na ọ bụghị ụmụnne ya ndị nwaanyị ka anyị na ha nọ n’ebe a?”

Ha wee jụ ịnabata ya. Jesu zaghachiri ha sị, “Onye amụma nwere nsọpụrụ ebe ọbụla belụsọ n’obodo ya, n’etiti ụmụnna ya na n’ezinụụlọ ya”.

Nke a mere o nweghị ike ịrụ ọrụ ebube ọbụla n’ebe ahụ, ma e wezuga na o bikwasara ndị ọrịa olemaole aka, ahụ wee dịkwa ha mma. Ekweghịekwe ha gbagwojuru ya anya. Mgbe ahụ Jesu gagharịrị n’obodo nta niile dị n’ebe ahụ na-akụzi nkuzi.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Header text

Igbo Mass Readings for February 1 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 6, 2022