Igbo Mass Readings for January 31 2024, Wenezde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 31 2024, Wenezde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 24:2, 9-17

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ abụọ nke Samuel

Devid wee nye onyeisi ndịagha ya, bụ Joab iwu sị, “Gị na ndịagha Gị jegharịa n’agbụrụ Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, gụọnụ ndị Izrel ọnụ. Achọrọ m ịma ọnụọgụgụ ha.” Joab wee gwa eze ọnụọgụgụ ndị mmadụ: narị puku asatọ bụ ndị nwoke ruru n’ije agha n’Izrel.

Narị puku ise bụkwa ndị ruru n’ije agha na Juda. Ma akọnuuche Devid tara ya ụta mgbe ọ gụchara ndị Izrel ọnụ. O wee sị Yahweh, “Emehiela m nke ukwu n’ihe a m mere! Biko, gbaghara m; n’ihina akpaala m agwa ka onye nzuzu.”

Mgbe Devid tetara ụra n’ụtụtụ, Yahweh ezielarị onye ọhụụzọ Devid bụ onye amụma Gad sị: “Gaa gwa Devid na ana m eche ahụhụ atọ n’ihu ya, ya họro otu n’ime ha m ga-enye ya.” Gad jekwuuru ya, gwa ya ihe Yahweh kwuru.

Ọ jụkwara ya sị, “Ole nke ị họọrọ: Ọ bụ oke ụnwụ afọ atọ, n’ala gị, ka ọ bụ ka ịgbaa ọsọ ndụ n’ihu ndịiro gị ọnwa atọ, ka ọ bụ ajọ ọrịa na-efe efe ịdakwasị ala gị ụbọchị atọ? Ugbu a, chebara ya uche, gwa m ọsịsa m ga-eweghachiri onye zitere m.

Devid zara ya, “Amaghị m nke m ga-ahọrọ na nke a! Achọghị m ịdaba n’aka mmadụ. Kama Yahweh jiri aka ya nye m ahụhụ n’ihina ama m na o nwere obi ebere nke ukwuu.” Ya mere, Yahweh zitere ajọ ọrịa na-efe efe site n’ụtụtụ ahụ ruo mgbe ahụ ọ kara.

Bido na Dan ruo Bịasheba, iri puku asaa nke ndị Izreel nwụrụ n’ọrịa ahụ. Mgbe mmụọọma nke Osebụrụwa na-achọ imebi Jerusalem, Yahweh gbanwere obi ya banyere ahụhụ o nyere ndị Izrel. O wee gwa mmụọọma ahụ na-egbusị ha, “Kwụsị! O zuola”!

Mgbe ahụ, mmụọọma ahụ nọ n’akụkụ ebe nzọcha ọka nke Arauna, onye Jebus. Mgbe Devid hụrụ mmụọọma ahụ nke na-egbusị ndị Izrel, ọ sịrị Yahweh, “Lee, naanị m mehiere gị. Ikpe makwara m. Igwe mmadụ ndị a, gịnị ka ha mere? Biko nye m na ezinụụlọ nna m ahụhụ ma hapụ ha.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 32: 1-2, 5, 6,7

Azịza: Onyenweanyị, gbaghara m njọ m niile.

1. Ngọzi na-adịrị onye nke a gbaghaara njọ ya;

Onye nke e kpochapụrụ mmehie ya.

Ngọzi dịrị onye ahụ Onyenweanyị amaghị ikpe,

Onye aghụghọ adịghị n’ime obi ya. Azịza.

2. N’ikpeazụ, ekwere m na m mere njọ

Anakwaghị m ezo njọ m ezo

Asịrị m, Aga m ekwupụtara Onyenweanyị njọ m,

I wee gbagharam njọ m niile. Azịza.

3. Ya mere ndị nke gị niile ji ebeku gị.

mgbe ọbụla ha nọ na nsogbu,

ọ bụrụgodu na nsogbu ekwọrọ ka idee mmiri bịa,

ọ gaghị eru ha n’ahụ. Azịza

4. Gị bụ ebe mgbaba m,

Ị na-echebe m n’oge nsogbu,

I ji ukwe nzopụta agba m gburugburu. Azịza.

MBEKU – Eph 1:17-18

Alleluia, Alleluia:

Ka Chineke meghee anya nke obi ụnụ, ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 6:1-6

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Ozọma dị asọ nke Mak dere.

Jesu siri n’ebe ahụ pụọ laghachi n’obodo ya. Ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya. N’ụbọchị Sabat, ọ malitere ikuzi ihe n’ụlọnzukọ ndị Juu. Ọgbagwojuru ndị niile nụrụ nkuzi ya anya, nke mere na ha malitere na ajụ sị, “Kedụ ebe nwoke a si nweta ike ndị a niile? Olee ụdị amamihe e nyere ya?

Lekwaa ọrụ dị ịtụnaanya nke ọ rụrụ, Ọ bụ na ọ bụghị onye ọkụntu ahụ. Nwa Marịa nwanne Jemis, Joses, Juud na Saịmọn?” Ọ bụ na ọ bụghị ụmụnne ya ndị nwaanyị ka anyị na ha nọ n’ebe a?”

Ha wee jụ ịnabata ya. Jesu zaghachiri ha sị, “Onye amụma nwere nsọpụrụ ebe ọbụla belụsọ n’obodo ya, n’etiti ụmụnna ya na n’ezinụụlọ ya”.

Nke a mere o nweghị ike ịrụ ọrụ ebube ọbụla n’ebe ahụ, ma e wezuga na o bikwasara ndị ọrịa olemaole aka, ahụ wee dịkwa ha mma. Ekweghịekwe ha gbagwojuru ya anya. Mgbe ahụ Jesu gagharịrị n’obodo nta niile dị n’ebe ahụ na-akụzi nkuzi.

Igbo Mass Readings for February 1 2024, Tọọzde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for January 31 2024, Wenezde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 6, 2022