Igbo Mass Readings for May 15 2024, Wenezde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 15 2024, Wenezde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 20:28-38

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Pọl gwara ndị okenye nzukọ Kristi nọ na Efesus sị: Kpachapụrụnụ onwe ụnụ anya. Kpachapụkwaranụ igwe atụrụ ahụ niile anya, nke Mmụọ Nsọ mere ụnụ ndị nlekọta ha.

Na-azụnụ nzukọ nke Chineke, nke Onyenweanyị ji ọbara ya gbata. Ama m na mgbe m lachaara, ajọ anụ ahụ ga-abata n’etiti ụnụ nke agaghị emere igwe atụrụ ebere.

Ụfọdụ mmadụ n’etiti ụnụ ga-ebilikwa were okwu ụgha duhie ndị kwere na Kristi ụzọ, ka ha sobe ha. Ya bụ na-echenụ nche. Chetakwa etu m si were anya mmiri, abalị na ehihie n’ewepụghị aka, ihe ha ka afọ atọ, na-adụ mmadụ niile ọdụ n’otu n’otu.

Ugbu a, ana m ewere ụnụ nye n’aka nchedo Chineke ma n’odudu nke okwu nke amara ya, nke nwere ike iwulite ụnụ elu, nke nwere ike ime ka ụnụ keta ngọzi ukwu ahụ nke Chineke kwadobere ndị ya niile edoro nsọ.

Ọ dịghị onye ọbụla n’ime ụnụ m jiri anya ukwu nara ọlaọcha ya, ma ọ bụ ọlaedo ya, ma ọ bụ uwe ya. Ụnụ onwe ụnụ ma na-ejiri m aka m abụọ rụpụta ihe dị mụ onwe m na ndị mụ na ha nọ mkpa.

N’ihe niile, egosiri m ụnụ onwe m na anyị aghaghị inyere ndị adịghị ike aka site na-ịrụ ọrụ n’ụzọ dị otu a, na-echeta okwu nke Onyenweanyị Jesu kwuru sị: “Ọ dị ngọzi inye enye karịa ịnara anara.”

Mgbe o kwuchara ihe ndị a ya na ha niile gburu ikpere n’ala, kpee ekpere. Ha niile bere akwa makụọ Pọl, susukwa ya ọnụ. Ihe wutere ha karịa bụ okwu Pọl gwara ha, na ha agaghị ahụkwa ya ọzọ. Ha jisiri ike dupụ ya, ruo mgbe ọ banyere n’ụgbọ mmiri.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 68:29-30,33-35, 35-36.

Azịza: Bụọrọnụ Chineke abụ, ụnụ alaeze nke ụwa.

1. Nara mgbụcha Chineke, dịka o si kwesị ike gị,

ike ahụ, Chineke, I jirila meere anyị ọtụtụ ihe

site n’ụlọ nsọ gị dị elu karịa Jerusalem!

Ndịeze ga-abịakwute gị, na-eweta onyinye ha. Azịza

2. Bụọrọnụ Chineke abụ, ụnụ alaeze nke ụwa,

kụọrọnụ Onyenweanyị egwu,

onye na-agba ịnyịnya n’eluigwe,

eluigwe mgbe ochie,

Geenụ ya ntị ka ọ na-eti mkpu,

ka ọ na-agba egbe igwe.

Ma kwupụtakwa ike Chineke. Azịza

3. Ebube ya dị n’elu Izrel, ike ya dị n’urukpu,

Chineke kwesịrị ịtụrụ nnukwu egwu n’ebe ya dị nsọ:

Chineke nke Izrel, na-enye ndị nke ya ike.

Ngọzi dịrị Chineke. Azịza

MBEKU

ALLEUIA ALLELUIA:

Aga m ezitere ụnụ mmụọ nke eziokwu, ọ ga-eduba ụnụ na eziokwu niile.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 17:11-19.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu leliri anya n’eluigwe were kpee ekpere sị: “Ugbu a, anọghịkwa m n’ime ụwa, ha ka nọ n’ime ụwa, ma ana m alaghachikwute gị. Ya bụ, Nna dị nsọ, dokwaa ha nke ọma site n’ike nke aha gị, bụ aha ahụ nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu.

Mgbe mụ na ha nọ, edobere m ha nke ọma site n’ike nke aha gị, bụ nke i nyere m. Echekwabara m ha, ọ dịghịkwa onye ọbụla n’ime ha lara n’iyi ma ọ bụghị nwa nke ịla n’iyi ahụ.

Ma nke a mere ka ewee mezuo ihe edere n’Akwụkwọ Nsọ. Ugbu a, ana m alaghachikwute gị. Ana m ekwu ihe ndị a otu a m ka nọ n’ime ụwa, ka ha wee nwee ọñụ n’uju n’ime ha.

Agwara m ha okwu gị, ụwa wee kpọọ ha asị, n’ihi na ha abụghị ndị nke ụwa dịka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa. Ekpere m abụghị ka i wepụ ha n’ụwa, kama ka i chekwaba ha ka ha ghara ịbanye na njọ.

Ha abụghị ndị nke ụwa, dịka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa. Were eziokwu gị doo ha nsọ, n’ihi na okwu gị bụ eziokwu. Ezigala m ha n’ụwa dịka i si ziga m n’ụwa. N’ihi ha, edoola m onwe m nsọ, ka e wee doo ha nsọ n’eziokwu.

Igbo Mass readings for May 16 2024, Tọọzde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for May 15 2024, Wenezde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Last Update: April 15, 2022