Igbo Mass Readings for February 26 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 26 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:11-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak
Amamihe na-ebulite ụmụ ya elu na-enyekwara ndị na-achọ ya aka. Onye ọbụla hụrụ ya n’anya hụrụ ndụ ya n’anya. Ndị ji isi ụtụtụ achọ ya ga-ejupụta n’añụrị. Onye ọbụla jidesiri ya ike ga-enweta otito.
Yahweh ga-agọzi ebe ọbụla ọ banyere. Ndị na-ejere ya ozi na-efe otu onye ahụ dị asọ. Ndị hụrụ ya n’anya, Yahweh na-ahụ ha n’anya. Onye ọbụla na erubere ya isi ga-ekpe mba niile ikpe.
Onye ọbụla na-ege ya ntị, ga-ebi n’udo. Ọ bụrụ na o nwere ntụkwasịobi na ya, ọ ga-enweta ya, ọ ga abụrụkwa nke ụmụụmụ ya. Na mbido, amamihe ga-eduga ya n’ụzọ siri ike, ọ ga-eme ka ụjọ na oke egwu tụọ ya.
Ọzụzụ ọ ga-achọ n’aka ya ga-esi nnukwu ike. Ọ ga-anwale ya n’ụzọ ya dị icheiche, ruo mgbe o nwere ezigbo ntụkwasịobi n’ebe ọ nọ.
Mgbe ahụ ka ọ ga-abịakwute ya n’atụfughị oge wee kpugheere ya ihe nzuzo ya ma meekwa ka obi tọọ ya ụtọ. Ma ọ bụrụ na o jehie ụzọ, ọ ga-agbahapụ ya, hapụ ya ka ọ laa n’iyi.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119:165,168,171-172,174-175
Azịza: Onyenweanyị, Ndị niile hụrụ iwu gị n’anya nwere udo.
1. Ndị niile hụrụ iwu gị n’anya nwere udo,
o nweghị ihe ga-eme ka ụkwụ kpọọ ha. Azịza
2. Ana m edobe iwu gị na nkuzi gị niile,
n’ihina ị maara ụzọ m niile. Azịza
3. Ọnụ m na-ekwupụta otito gị,
ebe ị na-akụziri m iwu gị. Azịza
4. Aga m ekwe ukwe banyere okwu gị.
n’ihina ha niile bụ ihe ziri ezi. Azịza
5. Ana m achọ nzọpụta gị, O Onyenweanyị,
iwu gị na-enye m añụrị. Azịza
6. Nye m ndụ ka m wee nwee ike ito gị,
kwe ka iwu gị gbaam ume. Azịza
MBEKU – 2 Cor 5:19
Alleluia, Alleluia:
Chineke sitere na Kristi na-eme ka ya na ụwa dị na mma. O tinyela n’aka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.
Alleluia.
OZIỌMA – 9:38-40
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jọn sịrị Jesu, “Onyenkuzi, anyị hụrụ otu nwoke onye na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị, anyị gbochiri ya, n’ihina ọ bụghị onye otu anyị”.
Ma Jesu zara sị, “Ụnụ egbochila ya, n’ihina ọ dịghị onye ọbụla ga-arụ ọrụ ebube n’aha m nke pụrụ ikwulụ m ọsọọsọ. N’ihina onye na-adịghị emegide anyị nọnyeere anyị.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.