Connect with us

Igbo Mass Readings

Igbo Mass Readings for May 22 2024, Wenezde Izuụka nke Asaa N’Oge Nkịtị

Published

on

Igbo Mass Readings for May 22 2024, Wenezde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 22 2024, Wenezde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:13-17

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis

Ugbu a geenụ ntị ụnụ ndị na-asị,. Taa, mọbụ echi, anyị ga-eje obodo nke a mọbụ nke ọzọ nọọ ebe ahụ otu afọ zụọ ahịa, kpata ego buru ibu. Ma ụnụ amaghị ihe ga-eme echi.

Ndụ ụnụ dịka gịnị? Ndụ ụnụ dị ka igirigi nke na-apụta ihe nwa oge e mechaa o mie ala. Kama ihe kwesịrị ka ụnụ kwuo bụ nke a: Ọ bụrụ na Onyenweanyị kwe, anyị ga-adị ndụ mee nke a mọbụ nke ọzọ.

Advertisement

Ma otu ọ dị, ụnụ na-anya isi na-afụli onwe ụnụ elu. Ịnya isi dị otu a dị njọ. Ya mere onye ọbụla maara iheọma ma o meghị ya ọ bụụrụ onye ahụ njọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 49: 1-2,5-6,7-9,10

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha.

1. Nụrụnụ nke a ụnụ mba niile

geenụ ntị ụnụ ndị bi n’ụwa.

Advertisement

Ma ndị dị elu ma ndị dị ala

ndị bara ụba na ndị ogbenye. Azịza

2. Gịnị mere m ga-eji tụọ egwu n’oge nsogbu

Mgbe omume ọjọọ nke ndịiro gbara m gburugburu?

Advertisement

Ndị tụkwasaraobi ha n’akụnụụba

ma werekwa nnukwu akụnụba ha na-anya isi. Azịza

3. Ma o nweghị onye nwere ike ịgbapụta onwe ya

mọbụ jiri ego kwụọ Chineke ụgwọ ndụ ya,

Advertisement

n’ihi ụgwọ ndụ mmadụ dị oke ọnụ ahịa ọ kariri ya ịkwụ.

Ya mere, O nweghị ihe ga-eme ka mmadụ ghara ịnwụ,

ka ọ ghara ịla mmụọ. Azịza

4. N’ihina ọ maara na ndị amamihe ga-anwụ,

Advertisement

Otu aka ahụkwa ndị nzuzu na ndị na-amaghị ihe ga-anwụkwa,

ha ga-anwụ hapụrụ ndịọzọ akụnụụba ha. Azịza

MBEKU – 2 Cor 5:19

Alleluia, Alleluia:

Chineke sitere na Kristi na-eme ka ya na ụwa dị na mma. O tinyela n’aka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.

Advertisement

Alleluia.                              

OZIỌMA – 9:38-40

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jọn sịrị Jesu, “Onyenkuzi, anyị hụrụ otu nwoke onye na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị, anyị gbochiri ya, n’ihina ọ bụghị onye otu anyị”.

Ma Jesu zara sị, “Ụnụ egbochila ya, n’ihina ọ dịghị onye ọbụla ga-arụ ọrụ ebube n’aha m nke pụrụ ikwulụ m ọsọọsọ. N’ihina onye na-adịghị emegide anyị nọnyeere anyị.

Advertisement

Igbo Mass Readings for May 23 2024, Tọọzde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for May 22 2024, Wenezde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.