Igbo Mass Readings for May 29 2024, Wenezde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 29 2024, Wenezde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:18-25

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Pita nke Mbụ

Ụnụ matara ihe e jiri gbapụta ụnụ na ndụ ọjọọ nke ụnụ si n’aka nna ụnụ ha nata. Ụnụ matakwara na ihe e ji gbapụta ụnụ abụghị ihe pụrụ imebi emebi dị ka ọlaọcha, mọbụ ọlaedo.

Kama, ihe e ji gbapụta ụnụ bụ ọbara dị oke ọnụ nke Kristi, onye dị ka nwa atụrụ na-enweghị ọrụ mọbụ ntụpọ. A họpụtalarị Kristi tupu e kee ụwa. E kpughekwara ya n’ihi ụnụ mgbe oge ruru.

Ụnụ sitere n’aka ya kwere na Chineke, bụ onye nyere ya ebube. N’ihi nke a, okwukwe na olileanya ụnụ dị n’ebe Chineke nọ. Ebe ụnụ sitere n’irubere eziokwu nke oziọma ahụ isi, mee ka mkpụrụ obi ụnụ dị ọcha, na-ahụkwa ndị kwere ekwe ibe ụnụ n’anya n’ejighị aghụghọ ọbụla, werekwanụ obi ụnụ niile na-ahụrịta ibe ụnụ n’anya.

Site n’okwu nke Chineke dị ndụ, a mụgharịala ụnụ ọzọ, ka ụnụ bụrụ ụmụ na-anaghị anwụ anwụ, na ndị na-adịgidekwa. N’ihina: Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ebube ha dịkwa ka okooko ọcha.

Ahịhịa kpọnwụọ, okooko ya adapụ. Ma okwu nke Onyenweanyị ga-adịgide ruo mgbe ebighịebi. Okwu a bụkwa oziọma ahụ nke a gbasaara ụnụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 147: 12-13, 14-15, 19-20

Azịza: Jerusalem too Onyenweanyị.

1. Jerusalem too Onyenweanyị, Zayọn too Chineke gị,

n’ihina ọ bụ ya mere ọnụụzọ ama gị niile ka ha sie ike,

ọ na-agọzi ụmụ gị niile. Azịza

2. Ọ na-enye gị udo n’oke ala gị niile,

ọ na-eji ọka nke kacha mma azụ gị nri.

Ọ na-etiri ụwa iwu,

okwu ya agazuo ụwa niile ọsọọsọ. Azịza

3. Ọ na-ekpughere ụmụ Jekob okwu ya,

na-egosikwa ụmụ Izrel iwu ya na ikpe ya.

Ọ naghị emere mba ndịọzọ otu a,

ọ naghị akụziri ha iwu ya. Alleluia. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

A na m akpọzi ụnụ ndị enyi, Onyenweanyị na-ekwu, n’ihina agwala m ụnụ ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m.

Alleluia.

OZIỌMA – 10:32-45

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Ka ha nọ n’ụzọ na-agaje Jerusalem, Jesu ganahụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Nke a tụrụ ha n’anya, bịakwa dị ndị mmadụ, ndị so ha egwu. Ma Jesu kpọrọ ndị ozi iri na abụọ ahụ iche ọzọ malite ikpughere ha ụfọdụ ihe ga-adakwasị ya.

Ọ sịrị ha, “Lee, anyị na-agbago Jerusalem, n’ebe ahụ, a ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndịisi nchụaja na ndị odeakwụkwọ, ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, rara ya nye n’aka ndị mba ọzọ; Ndị a ga-eme ya ihe ọchị, bụọ ya asụ, pịa ya ụtalị, gbukwaa ya, ma mgbe ụbọchị atọ gachara, ọ ga-esikwa n’ọnwụ bilie”.

E mechaa Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, were bịakwute Jesu, sị ya, “Onyenkuzi, anyị na-achọ ka i meere anyị otu ihe anyị ga-arịọ gị”. Jesu jụrụ ha sị, “Gịnị ka ụnụ chọrọ ka m meere ụnụ?”

Ha sịrị ya, “Biko, kwee ka anyị nọdụ, otu n’aka nri gị, otu n’aka ekpe gị, mgbe ọbụla ị ga-anọdụ n’ocheze gị”. Ma Jesu sịrị ha, “Ụnụ amaghị ihe ụnụ na-arịọ. Ụnụ nwere ike ịñụ iko m ga-añụ, mọbụ kwe ka e mee ụnụ ụdị mmirichukwu ahụ nke a ga-eme m?”

Ha zara ya, “Anyị nwere ike” Jesu sịrị ha, “Iko nke m ga-añụ ka ụnụ ga-añụ, mmirichukwu nke a ga-eme m ka a ga-emekwa ụnụ. Ma, ọ bụghị m ga-ekpebi onye ga-anọ n’aka nri m mọbụ n’aka ekpe m. Kama ọnọdụ ahụ dịịrị ndị niile a kwadebeere ya”.

Mgbe ụmụazụ Jesu mmadụ iri ọzọ nụrụ maka arịrịọ ụmụnne abụọ ahụ, iwe jupụtara ha obi n’ebe Jemis na Jọn nọ. Ma Jesu kpọkọtara ha ọnụ sị ha, “Ụnụ amarala na n’etiti ndị ọgọ mmụọ ndị kwesịrị ịchị ha na-achị ọchịchị nchịgbu.

Ndị nnukwu mmadụ ha na-egosịkwa na ha ji ike ọchịchị. Ma ọ gaghị adị otu a n’etiti ụnụ. Kama onye ọbụla ga-abụ onye ukwu n’etiti ụnụ ga-abụrịrị nwodibo ụnụ.

Onye ọbụlakwa nke ga-abụ onye mbụ n’etiti ụnụ ga-abụrịrị ohu ụnụ niile. N’ihina Nwa nke mmadụ bịakwara, ọ bụghị ka a gbaara ya odibo, kama ka ọ bụrụ odibo, werekwa ndụ ya nye maka mgbapụta ọtụtụ mmadụ”.

Igbo Mass Readings for May 30 2024, Tọọzde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for May 29 2024, Wenezde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 8, 2022