Igbo Mass Readings for January 29 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 29 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 10:11-18
Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru
Ụkọchukwu ọbụla na-anọ n’ọrụ ya ụbọchị niile na-achụ otu aja ahụ ugboro ugboro, aja nke na-enweghị ike isachapụ njọ. Ma mgbe Kristi chụchara otu aja maka njọ, ọ nọdụrụ ala n’aka nri nke Chineke.
Ebe ahụ ka ọ ga-anọ wee ruo mgbe a ga-eme ndịiro ya ihe mgbakwasaụkwụ ya. Site n’aja ahụ ọ chụrụ naanị otu ugboro, o mere ka ndị niile o doro nsọ zuo oke mgbe niile.
Mmụọ Nsọ na-agbakwara anyị akaebe ka o kwuchara sị, “Nke a bụ ọgbụgbandụ nke mbụ mụ na ha ga-eme, ka ụbọchị ahụ gachara Onyenweanyị kwuru sị, “Aga m etinye iwu m n’obi ha, dekwaa ya n’uche ha”.
O kwukwara sị, “Agaghị m echetakwa njọ ha na ajọomume ha ọzọ”. Mgbe a gbagharachaara ihe ndị a, a gaghịkwa enwe aja mgbaghara njọ ọzọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 110:1, 2, 3, 4.
Azịza: Ị bụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek
1. Dinwenụ gwara gị nna m ukwu sị,
“Nọrọ ala n’aka nri m,
aga meme ndịiro gị ihe mgbakwasa ụkwụ gị”
Azịza: Ị bụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek
2. Onyenweanyị, ga-amanye ndịiro gị niile,
ka ha nọrọ n’okpuru ọchịchị gị na Zayọn;
Azịza: Ị bụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek
3. Ugwueze bụ nke gị bido n’ụbọchị a mụrụ gị n’elu ugwu dị nsọ,
ị bụ eze site n’afọ,
bido n’isi ụtụtụ nke ndụ gị.
Azịza: Ị bụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek
4. Onyenweanyị añụọla iyi nke na ọ gaghị ala azụ na ya,
ị bụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek.
Azịza: Ị bụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek
MBEKU
Alleluia, Alleluia.
Kwuwe Onyenwe m, nwodibo gị na-ege ntị. Ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe.
Alleluia.
OZIỌMA – 4:1-20
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere,
Jesu malitekwara ọzọ ikuzi ihe n’akụkụ osimiri Galili. Oke igwe mmadụ gbara ya gburugburu, nke mere na ọ banyere n’ụgbọmmiri, wee nọdụ ala n’ime ya, n’elu mmiri. Igwe mmadụ niile ahụ guzoro n’ala n’akụkụ mmiri. O jiri ụkabụilu dị icheiche kuziere ha ọtụtụ ihe.
Na nkụzi ya, ọ sị ha; “Geenụ ntị! Onye ọgha mkpụrụ gara n’ubi ịgha mkpụrụ; ka ọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ dara n’akụkụ ụzọ, ụmụnnụnụ abịa tụtụrịa ha.
Mkpụrụ ụfọdụ dara n’ala okwute ebe ha na-enweghị aja buru ibu. Ngwangwa mkpụrụ ahụ pulitere, n’ihina ha enweghị aja miriemi. Ma mgbe anyanwụ wara, ha chanwụrụ ma kpọnwụkwaa n’ihina ha enweghị mgbọrọgwu miriemi.
Mkpụrụ ụfọdụ dara n’etiti ogwu, ogwu wee tolite, kpagbuo ha; ha amịtaghị mkpụrụ ọbụla. Mkpụrụ ndị ọzọ dara n’ala dị mma, wee puo, topụta, mịkwaa mkpụrụ, ụfọdụ mịtara iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ otu narị”.
Na mmechi, ọ sịrị ha, “Onye nwere ntị ịnụ ihe ya nụrụ”. Ma mgbe naanị Jesu nọ, ndị na eso ụzọ ya na ụfọdụ ndị gbara ya gburugburu rịọrọ ya ka ọ kọwaara ha ihe banyere ụkabụilu ya. Ọ sịrị ha, “Ụnụ ka e nyere ike ịghọta na ịkọwa ihe banyere ihe omimi nke alaeze Chineke, mana ebe ndị ọzọ nọ, ihe niile bụ n’ụkabụilu.
Ka ha wee hụ ghara ịhụta, Ka ha wee nụ ghara ịghọta, Ka ha ghara ịtụgharị obi ma nwee mgbaghara”. Jesu jụkwara ha sị,”Ọ bụ na ụnụ aghọtaghị ụkabụilu a? Olee otu ụnụ ga-esi aghọta ụkabụilu ndị ọzọ? Ọgha mkpụrụ na-agha okwu ahụ.
Mkpụrụ ndị dara n’akụkụ ụzọ pụtara ndị a gwara okwu ahụ, mgbe ha nụrụ ya, ngwangwa Ekwensu bịara wepụ okwu nke a kụrụ n’obi ha. Otu aka ahụkwa, mkpụrụ ndị dara n’ala okwute bụ ndị ji ọñụ nara okwu Chineke mgbe ha nụrụ ya. Ma ebe ọ bụ na okwu ahụ agbaghị mgbọrọgwụ n’obi ha, ọ nọrọ ntakịrị oge.
Mgbe mkpagbu mọbụ nsogbu bịara n’ihi okwu ahụ ha na-esi n’okwukwe ha adapụ. Mkpụrụ ndị dara n’etiti ogwu bụ ndị nụrụ okwu Chineke, ma nchegbu na nchekasị nke ụwa a na oke ọchịchọ nke ihe ndị ọzọ abanye ha n’obi kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ.
Ma ndị a ghara n’ala dị mma bụ mmadụ ndị nụrụ okwu ahụ, nabatakwa ya ma mịa mkpụrụ: ụfọdụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ otu narị.
Igbo Mass Readings for January 30 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for January 29 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.