Connect with us

Igbo Mass Readings

Igbo Mass Readings for September 20 2023, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Nkịtị

Published

on

Igbo Mass Readings for September 20 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 20 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:14-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl degaara Timoti

Enwere m nchekwube na-aga m abịa ngwangwa ileta gị, ma ana m edere gị akwụkwọ ndụmọdụ nke a ka ọ ga-abụ, ọ bụrụ na m nọọ ọdụ ịbịa ị ga-ama otu mmadụ kwesịrị isi mee omume n’ezinụụlọ nke Chineke, nke bụ nzukọ nke Chineke dị ndụ, bụrụkwa ide na ntọala nke eziokwu.

N’ikwu eziokwu, ihe anyị na-ekwupụta bụ nnukwu iheomimi dị n’okpukpe anyị. Chineke mere ka onye ahụ pụta ihe n’anụ ahụ, Ọ gụrụ ya n’onye eziomume n’ime mmụọ,

Advertisement

O mere ka ndị mmụọọma hụ ya anya; E kwusara ya na mba niile, Onye ụwa niile kwere na ya, E buliri ya elu n’otito.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 111: 1-2, 3-4, 5-6

Azịza: Lee ka ọrụ niile nke Onyenweanyị siri jupụta n’otito na ebube

1. Alleluia! Eji m obi m niile enya Onyenweanyị ekele,

N’ọgbakọ ndị eziomume

Advertisement

Ọrụ Onyenweanyị niile dị ịtụnaanya,

Ndị niile ọ na-amasị kwesịrị ilekwasa ya anya. Azịza

2. Ọrụ niile ọ na-arụ jupụtara n’otito na ebube,

Eziomume ya enweghị ike ịgbanwe agbanwe

Advertisement

Ọ na-ekwe ka anyị na-echeta ọrụ ebube ya

Onyenweanyị dị ebere, dịkwa obiọma. Azịza

3. Ọ na-enye ndị na-atụrụ ya egwu nri;

Ọ na-echetara ndị nke ya ike ọ na-akpa

Advertisement

Site n’inye ha oke mba ndịọzọ. Azịza

MBEKU – Kol 3:16,17

Alleluia, Alleluia:

Werenụ abụọma na ukwe nke mmụọ kweere Chineke ukwe ekele n’obi ụnụ.

Alleluia

Advertisement

OZIỌMA – 7:31-35

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu kwuru sị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere ọgbọ a, olee ihe ha dị ka ya? Ha dịka ụmụntakịrị nọ n’ime ahịa, na-akpọ ibe ha oku sị, “Anyị gbuuru ụnụ ụja, ma ụnụ a gbaghị egwu, anyị tikuru ụnụ mkpu akwa, ma ụnụ ebeghị akwa.

N’ihina Jọn onye na-eme mmirichukwu bịara n’erighị ihe ndị ọzọ na-eri na-añụghịkwa mmanya, ụnụ wee sị, “O nwere mmụọ ọjọọ!”

Nwa nke mmadụ ahụ abịakwala na-eri ihe oriri na-añụkwa ihe ọñụñụ, ụnụ sị, “Leenụ onye oke afọ na onye añụrụma, enyi ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ! Ma amamihe ziri ezi dị n’ebe ụmụ ya nọ.”

Advertisement

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for September 20 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.