Connect with us

Igbo Mass Readings

Igbo Mass Readings for October 11 2023, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Nkịtị

Published

on

Igbo Mass Readings for October 11 2023, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 11 2023, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:1-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jona

Ihe Chineke mere amasịghị Jona, o were wee iwe. Ọ rịọrọ Chineke arịrịọ sị, “Biko Yahweh ọ bụ na ọ bụghị ihe a ka m kwuru ga-emenụ mgbe m ka nọ n’obodo m?

N’ihi ya ka m jiri chọọ ịgbalaga n’obodo Tashish n’ihina amaara m na ị bụ onye obi ịhụnaanya na Chineke onye obi ebere, ị naghị ewe iwe ọsọọsọ, I jupụtakwara n’ịhụnaanya dị ọkpụ.

Advertisement

Ị bụ onye na-anaghị ata mmadụ ahụhụ dịka mmehie ya siri dị. Ya mere ugbu a Chineke, biko napụ m ndụ m n’ihina ọ kaara m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.” Chineke zara Jona sị, “Iwe ị na-ewe o ziri ezi?”

Jona hapụrụ obodo Ninive gaa nọdụ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ. N’ebe a ọrụụrụ onwe ya ụlọ ndo iji zere anwụ, wee nọdụkwa na ya na-eche ịhụ ihe ga-eme obodo Ninive.

Chineke mere ka osisi tolite n’ebe ahụ wee kpuchie Jona ka ahụ juo ya oyi. Mgbe Jona hụrụ nke a, o nwere añụrị nke ukwuu. Ma mgbe chị bọrọ n’ụbọchị nke so ya, Chineke mere ka ahụhụ tagbuo osisi ahụ nke mere ka ọ kpọnwụọ.

Mgbe anwụ wara, Chineke zitere oke ikuku ọwụwa anyanwụ nke na-agbakasị ahụ. Anwụ chara Jona nnukwu n’isi nke na ike gwụrụ ya. Ọ rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya sị: “Ọ kaara m mma na m nwụrụ anwụ karịa na m dị ndụ.”

Advertisement

Ma Chineke jụrụ Jona sị, “O kwesịrị ekwesị na ị ga-ewere osisi a iwe?” Jona azaa ya sị, “Ee, o kwesịrị na m ga-ewe iwe, ọ bụladị iwe iwe ruo n’ọnwụ.”

Chineke zara ya sị: “Ị na-ewe iwe maka osisi nke ị kụghị, nke i mekwaghị ka o too, nke topụtara n’otu abalị nwụọkwa n’otu abalị.

Ọ bụ na m agaghị emere Ninive ebere, obodo ukwu ahụ nke mmadụ karịrị puku otu narị na puku iri abụọ bi n’ime ya, ndị na-enweghị ike ikwu nke bụ aka nrị ha na aka ekpe ha, na-agụnyeghị ọtụtụ anụmaanụ dị n’ime ya?”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 86: 3-4, 5-6, 9-10

Azịza: Onyenweanyị, ijupụtara n’ịhụnaanya na ịkwụdosiike

Advertisement

1. Ị bụ Chineke m meere m ebere Onyenweanyị

ọ bụ gị ka m na-akpọkukwa ụbọchị niile

Mee ka mkpụrụobi nwodibo gị jupụta n’ọñụ, Onyenweanyị

n’ihina ọ bụ gị ka m na-akpọku n’ekpere m. Azịza

Advertisement

2. Onyenweanyị Ị dị ebere dị mgbaghara,

i nwere nnukwu ịhụnaanya

n’ebe ndị niile na-akpọku gị nọ.

Onyenwanyị nụrụ ekpere m,

Advertisement

Gee m ntị nụrụ arịrịọ m. Azịza

3. Mba niile ga-abịa kpọọrọ gị isi ala Onyenweanyị

N’ihina ị dị ukwuu na-emekwa ihe ịtụnaanya,

ọ bụ sọ gị bụ Chineke. Azịza

Advertisement

MBEKU – Ps 130: 5

Alleluia, Alleluia:

Ana m eche Onyenweanyị, na nkwa ya ka m nwere nchekwube.

Alleluia

OZIỌMA – 11:1-4

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Advertisement

Jesu nọ n’otu ebe na-ekpe ekpere. Mgbe ọ kwụsịrị otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ ya gwara ya sị, “Onyenweanyị kuziere anyị ka e si ekpe ekpere dịka Jọn si kuziere ndị na-eso ụzọ ya.”

Ọ sịri ha, “Mgbe ọbụla ụnụ na-ekpe ekpere, sịnụ: “Nna, ka otito dịrị aha gị, ka ọchịchị gị bịa, nye anyị taa, nri nke ụbọchị anyị. Gbaghara anyị mmehie anyị niile dịka anyị siri gbaghara ndị mehiere anyị. Ekwela ka anyị kwenye na nranye ma zọpụta anyị n’ajọ ihe.”

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for October 11 2023, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Advertisement

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.