Igbo Mass Readings for September 10 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 10 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Kolosi
Ọ bụrụ na ụnụ so Kristi bilie n’ọnwụ, na-achọnụ ihe dị n’eluigwe ebe Kristi nọ n’akanri nke Chukwu. Tụkwasịnụ uche ụnụ n’ihe nke dị n’eluigwe, ọ bụghị n’ihe nke dị n’elu ụwa.
N’ihina ụnụ anwụọla n’ebe mmehie dị, e zookwala ndụ ụnụ na Kristi n’ime Chineke. Mgbe Kristi, onye bụ ndụ anyị pụtara ihe, ụnụ onwe ụnụ ga-esokwa ya pụta ihe n’otito.
Meenụ ka ndụ nke anụahụ nke na-achị n’omume ndụ ụwa nwụọ n’ime ụnụ, dị ka ịkwaiko, adịghị ọcha, agụụ mmehie, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu nke bụ ife arụsị.
N’ihi ihe niile ndị a, iwe Chineke ga-abịakwasa ndị niile anaghị erubere ya isi. Na mbụ, ụnụ bikwaara ndụ dị otu a mgbe ụnụ bi n’etiti ha.
Ma ugbu a, hapụnụ ihe ndị a niile dị ka: iwe, ọnụma, ibu iro, nkwutọ na okwu rere ure na-esi n’ọnụ ụnụ apụta.
Ụnụ agwala ibe ụnụ okwu ụgha, ebe ụnụ yipụrụla mmadụ ochie ụnụ na omume ọjọọ ya niile, bịa yikwasa mmadụ ọhụrụ nke e ji amamihe na-eme ka ọ dị ọhụrụ n’oyiyi nke onye kere ya.
N’ime Kristi, o nweghị ihe dịka ndị Juu mọbụ ndị Grik, ndị e biri ugwu na ndị Skitịa, ndị ohu na ndị nwe onwe ha, kama Kristi bụ ihe niile nọrọkwa n’ihe niile.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 145: 2-3, 10-11, 12-13
Azịza: Onyenweayị na-egosi ihe niile o kere obiọma na ebere.
1. Ụbọchị niile aga m eto gị
Aga m eto aha gị ruo mgbe ebighịebi.
Onyenweanyị dị ukwuu, kwesịkwa inye otito niile,
Ebube ya dị omimi karịkwa nghọta.
Azịza: Onyenweayị na-egosi ihe niile o kere obiọma na ebere.
2. Onyenweanyị ihe niile i kere ga-ekele gị,
ndị kwere na gị ga-agọzi gị
Ha ga-ekwupụta ebube nke alaeze gị
Ma kwupụtakwa ịdị ike Gị.
Azịza: Onyenweayị na-egosi ihe niile o kere obiọma na ebere.
3. Ka mmadụ niile mata ọrụ ịtụnaanya gị niile.
Na ebube dị elu nke alaeze gị
Alaeze gị ga-adị ebeebe,
ọchịchị gị na-adị na ndụdụgandụ niile.
Azịza: Onyenweayị na-egosi ihe niile o kere obiọma na ebere.
MBEKU – 1 Pita 1:25
Alleluia, Alleluia:
Okwu nke Onyenweanyị ga-adigide ruo mgbe ebighịebi. Okwu a bụkwa oziọma ahụ nke a gbasaara ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 6:20-26
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu lere ndị na-eso ụzọ ya anya sị, “Ngọzi na-adịrị ụnụ bụ ndị ogbenye, n’ihina alaeze Chineke bụ nke ụnụ. Ngọzi na-adịrị ụnụ ndị agụụ na-agụ ugbu a, n’ihina ụnụ ga-eriju afọ.
Ngọzi na-adịrị ụnụ ndị na-akwa akwa ugbu a, n’ihina ụnụ ga-achị ọchị. Ngọzi na-adịrị ụnụ mgbe ndị mmadụ na-akpọ ụnụ asị, mapụ ụnụ n’iwu, kparịkwaa ụnụ, mọbụ tee aha ụnụ unyi dịka ihe arụ, n’ihi Nwa nke mmadụ!
Ñụrịanụ ọñụ mgbe nke a mere wụlikwaanụ elu n’ọñụ, n’ihina ụgwọ ọrụ ụnụ buru ibu n’eluigwe; n’ihina otu a ka ndị nna ha mere ndị amụma.
Ma ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị ọgaranya, n’ihina ụnụ enwetala nkasịobi. Ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị afọ jurula ugbu a, n’ihina agụụ ga-agụ ụnụ.
Ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị nọ n’ọchị ugbu a, n’ihina ụnụ ga-eru ụjụ beekwa akwa. Ahụhụ ga-adịrị ụnụ mgbe mmadụ niile na-ekwu iheọma banyere ụnụ, n’ihina otu a ka ndị nna ha siri rafuo ndịamụma ụgha.”
Igbo Mass Readings for September 10 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.