Igbo Mass Readings for September 11 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 11 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:25-31

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Enweghị m ihe ọbụla Onyenweanyị nyere n’iwu banyere ụmụagbọọghọ na-enweghị di mọbụ ụmụokorobịa na-enweghị nwunye.

Ma aga m ekwu uche nke aka m na nke a, dịka onye kwesịrị ntụkwasịobi. Ana m eche na ọ ka mma, n’ihi ahụhụ ukwu ahụ nke dị nso ugbu a, ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya n’alụghị di mọbụ nwunye.

Ị lụọla nwaanyị? Achọla nkewa. Ma ọ bụrụ na ị lụbeghị, ejela ịchọ onye ịga-alụ. Ma ọ bụrụ na ị lụọ nwaanyị, ọ dịghị njọ.

Ọ bụrụkwa na nwaagbọghọ na enweghị di alụọ di, ọ dịghịkwa njọ. Ma otu ọ dị, ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe ọtụtụ nsogbu n’ime ụwa.

Ọ ga-amasị m igbochiri ụnụ nsogbu ndị ahụ. Isi okwu m bụ nke a, ụmụnna m; oge fọdụụrụ anyị dị nkenke. Bido ugbu a gaba, ndị ji nwaanyị biri ka ndị na-ejighị.

Ndị na-eru ụjụ nọdụ ka ndị ihe anaghị ewute; ndị ihe na-agaziri nọrọ ka ndị anaghị añụrị. Ndị na-azụ ahịa, ha biri ka ọ bụghị ha nwe ihe ha zụtara.

Ndị na-agbaso akụnụụba na ihe ụtọ nke ụwa a, ha achọfela ya oke. N’ihina ọdịdị ụwa nke a bụ ihe na-agafe agafe.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 45:10-11,14, 15-16

Azịza: Gee ntị, ada m, chee ntị n’okwu m ma nụrụ.

1. Gee ntị, ada m, chee ntị n’okwu m ma nụrụ,

Chefuo ndị ala gị na ndị ụlọ nna gị

Mgbe ahụ ka onyeeze ga-ahụ gị na mma gị n’anya.

Ọ bụ ya bụ nna gị ukwu sọpụrụ ya. Azịza

2. Ada nke onyeeze yi uwe dị oke ọnụ

ya na ndị otu ya so na-abata n’ihu onyeeze.

Ụmụodibo ya ndị nwaanyị sokwa ya. Azịza

3. Ha ji nnukwu añụrị na-abata n’obi eze.

Ị ga-amụta ụmụ nke ga-anọchi anya ndị nnanna gị

Ị ga-eme ha ndị ọchịchị nke ụwa niile. Azịza

MBEKU – 1 Pita 1:25

Alleluia, Alleluia:

Okwu nke Onyenweanyị ga-adigide ruo mgbe ebighịebi. Okwu a bụkwa oziọma ahụ nke a gbasaara ụnụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 6:20-26

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu lere ndị na-eso ụzọ ya anya sị, “Ngọzi na-adịrị ụnụ bụ ndị ogbenye, n’ihina alaeze Chineke bụ nke ụnụ. Ngọzi na-adịrị ụnụ ndị agụụ na-agụ ugbu a, n’ihina ụnụ ga-eriju afọ.

Ngọzi na-adịrị ụnụ ndị na-akwa akwa ugbu a, n’ihina ụnụ ga-achị ọchị. Ngọzi na-adịrị ụnụ mgbe ndị mmadụ na-akpọ ụnụ asị, mapụ ụnụ n’iwu, kparịkwaa ụnụ, mọbụ tee aha ụnụ unyi dịka ihe arụ, n’ihi Nwa nke mmadụ!

Ñụrịanụ ọñụ mgbe nke a mere wụlikwaanụ elu n’ọñụ, n’ihina ụgwọ ọrụ ụnụ buru ibu n’eluigwe; n’ihina otu a ka ndị nna ha mere ndị amụma.

Ma ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị ọgaranya, n’ihina ụnụ enwetala nkasịobi. Ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị afọ jurula ugbu a, n’ihina agụụ ga-agụ ụnụ.

Ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị nọ n’ọchị ugbu a, n’ihina ụnụ ga-eru ụjụ beekwa akwa. Ahụhụ ga-adịrị ụnụ mgbe mmadụ niile na-ekwu iheọma banyere ụnụ, n’ihina otu a ka ndị nna ha siri rafuo ndịamụma ụgha.”

Igbo Mass Readings for September 12 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for September 11 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 12, 2022