Igbo Mass Readings for September 27 2023, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 27 2023, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:5-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Ezra
N’oge ọchụchụ aja mgbede, eyi m uwe m dọkara adọka si n’ebumọnụ m pụta gbuo ikpere n’ala, chịlie aka m elu tikuo Osebụrụwa Chineke m sị: “Chineke m, ihere na-eme m nke na o kweghị m lelie anya elu ebe ị nọ n’ihina mmehie anyị ehiela nne karịa, oke ihe ọjọọ anyị, ikpe ọmụma anyị dịkwa ukwuu nke na ha eruola eluigwe.
Site n’ụbọchị nnanna anyị ha ruo taa, anyị jupụtara na mmehie. N’ihi mmehie, anyị na ndịeze anyị na ndị ụkọchukwu anyị adabaala n’aka ndịeze na amaghị Chineke.
Ha egbuo anyị, dọrọ anyị n’agha, bukọrọ ihe anyị niile, mee anyị ihe ihere dị icheiche nke mere ka anyị nọdụ otu anyị nọ taa. Ma ugbu a, Chineke egosila anyị obiọma, mee ka olemaole n’ime anyị fọdụ, meekwa ka ụfọdụ n’ime anyị lọta bịa nọrọkwa n’ime ụlọnsọ ya.
Chineke mere nke a iji mee ka anyị nwee ihu ọchị meekwa ka anyị si n’ibu ahụhụ anyị nwetatụ onwe anyị. N’ihina ndị e nwe enwe ka anyị bụ, ma Chineke ahapụghị anyị n’ịbụ ohu nke anyị bụ, kama o meela ka ịhụnanya ya na-enweghị njedebe ruo anyị aka, n’ihu ndịeze Peshịa site n’ime ka ha nyetụ anyị ndụ ọhụrụ, ka anyị nwee ike ịrụchapụ ụlọnsọ Chineke, ma meziekwa akụkụ ya niile dakpọrọ adakpọ, wee chekwaa anyị n’ime Judia na Jerusalem.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Tobit 13:2, 3-4, 6, 7-8:6
Azịza: Ngọzi dịrị Chineke onye dị ebeebe.
1. N’ihina ọ na-enye ntaramahụhụ, na-egosikwa ebere;
Ọ na-eduba mmadụ n’ala mmụọ,
na-akpọpụtakwa ya
O nweghị onye ọbụla nwere ike ịgbanahụ ya. Azịza
2. Toonụ ya na mba niile, O ụmụ Izrel;
N’ihina o kposaala anyị n’etiti ha
Meenụ ka a mata ịdị ukwu ya ebe ahụ;
Ma buliekwanụ ya elu n’ihu ihe niile dị ndụ
Maka na ọ bụ Onyenweanyị na Chineke anyị
Ọ bụ ya bụ nna anyị ruo mgbe ebighịebi. Azịza
3. Chetanụ ihe ọma Chineke meere ụnụ,
ma jirinụ obi ụnụ niile nye ya ekele.
Toonụ Osebụrụwa nke eziomume,
bulienụ eze dị ụwatụwa elu. Azịza
4. Ana m eto Chineke m,
mmụọ m na-eto eze nke eluigwe,
na-añụrịkwa n’ebube ya
ka onye ọbụla nye ya ekele na Jerusalem. Azịza
5. Chegharịanụ ụnụ ndị ome njọ,
Ma mebenụ eziomume n’ihu ya
Ikekwe ọ ga-anabata ụnụ,
ma meere ụnụ ebere. Azịza
MBEKU – Jọn 8:12
Alleluịa, Alleluịa:
Jesu gwara ha okwu ọzọ sị, Abụ m ìhe nke ụwa onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhe nke ndụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – Luk 9:1-6
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu were kpọkọta ndịozi iri na abụọ ahụ, nye ha ike na ọchịchị n’ebe ndị mmụọ ọjọọ niile nọ, na ike ịgwọ ọrịa dị iche iche. O wee zipụ ha ikwusa Alaeze Chineke, na ịgwọ ọrịa dị ịcheiche.
O wee sị ha, “Ụnụ ejila ihe ọbụla maka ije ụnụ. Ụnụ ejila mkpọ, mọbụ akpa, mọbụ ogbe achịcha, mọbụ ego. Ụnụ achịkwala uwe abụọ.
Ụlọ ọbụla ụnụ banyere, nọgidenụ ebe ahụ, ruo mgbe ụnụ ga-apụ n’obodo ahụ. Ma ebe ọbụla a na-anabataghị ụnụ, mgbe ụnụ na-apụ n’obodo ahụ, tichapụ aja dị n’ọbụụkwụ ụnụ, ka ọ bụrụ ihe akaebe megide ha.
Ụmụazụ ahụ wee pụọ, gazuo obodo nta niile, na-ekwusa oziọma, na-agwọkwa ndị mmadụ nrịanrịa, ebe niile.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.