Igbo Mass Readings for September 25 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 25 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 30:5-9.

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ilu

Okwu niile nke Chineke bụ eziokwu. Ọ bụ ọta n’ebe ndị niile gbakwutere ya nọ. A tụkwasịla ihe ọbụla n’okwu ya ka ọ ghara ịbara gị mba, ị bụrụ onye asị. 

Ihe abụọ ka m na-arịọ gị; ajụla inye m ha tupu m anwụọ. Wepụ asị na okwu ụgha n’ebe m nọ; emela ka m bụrụ ogbenye mọbụ ọgaranya; kama nye m nri ga-ezuru m.

Ka m ghara iriju afọ cheere chi m aka mgba na-asị, “Onye bụ Chineke?” Ka m ghara ịbụ ogbenye nke ga-eme ka m zuo ohi metọọ aha Chineke m.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119:29, 72, 89, 101, 104, 163.

 Azịza: Onyenweanyị okwu Gị bụ mpanaka na-edu m, bụrụkwa ìhe n’ụzọ m.

1. Ekwela ka m soro ụzọ na-akwughị ọtọ

Ma nye m amara nke iwu gị. Azịza.

2. Iwu siri n’ọnụ gị pụta ka mma

karịa puku kwụrụ puru ọlaọcha na ọlaedo. Azịza.

3. Okwu gị kwụ chịm ebeebe

O guzosiri ike n’eluigwe O Onyenweanyị. Azịza.

4. Esepụla m ụkwụ n’ụzọ ọjọọ niile

Ka m wee nwee ike idobe okwu gị. Azịza.

5. Iwu gị niile enyela m nghọta

Ya mere akpọrọ m ụzọ aghụghọ niile asị. Azịza.

6. Akpọrọ m okwu ụgha asị

Mana ahụrụ m iwu gị n’anya. Azịza.

MBEKU – Jọn 8:12

Alleluịa, Alleluịa:

Jesu gwara ha okwu ọzọ sị, Abụ m ìhe nke ụwa onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhe nke ndụ.

Alleluịa.

OZIỌMA – Luk 9:1-6

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu were kpọkọta ndịozi iri na abụọ ahụ, nye ha ike na ọchịchị n’ebe ndị mmụọ ọjọọ niile nọ, na ike ịgwọ ọrịa dị iche iche. O wee zipụ ha ikwusa Alaeze Chineke, na ịgwọ ọrịa dị ịcheiche.

O wee sị ha, “Ụnụ ejila ihe ọbụla maka ije ụnụ. Ụnụ ejila mkpọ, mọbụ akpa, mọbụ ogbe achịcha, mọbụ ego. Ụnụ achịkwala uwe abụọ.

Ụlọ ọbụla ụnụ banyere, nọgidenụ ebe ahụ, ruo mgbe ụnụ ga-apụ n’obodo ahụ. Ma ebe ọbụla a na-anabataghị ụnụ, mgbe ụnụ na-apụ n’obodo ahụ, tichapụ aja dị n’ọbụụkwụ ụnụ, ka ọ bụrụ ihe akaebe megide ha.

Ụmụazụ ahụ wee pụọ, gazuo obodo nta niile, na-ekwusa oziọma, na-agwọkwa ndị mmadụ nrịanrịa, ebe niile.

Igbo Mass Readings for September 26 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for September 25 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X
Scroll to Top

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.