Igbo Mass Readings for October 3 2029, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 3 2029, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Nehemiah
Otu ụbọchị n’ime ọnwa Nisan, n’afọ iri abụọ nke ọchịchị eze Atagzezes, mgbe eze nọ n’oche nri, e buuru m mmanya ịgbanyere ya. Ma otu ọ dị, o nwebeghị mgbe m na-agbarụ ihu oge m na-agba odibo n’oche nri eze. Nke a mere eze ji jụọ m sị, “Gịnị kpatara ihu jiri gbarụọ gị?
Ị dịghịkwanụ ka onye ahụ na-adịghị. O nweghị ọzọ ọ bụ abụghị obi ọjọọ. Mgbe ahụ nnukwu egwu ejide m. Agwara m ya sị, “Eze ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighịebi.
Gịnị ga-eme ihu aghara ịgbarụ m, ebe ọ bụ na obodo ebe e liri nna m ha abụrụla ihe tọgbọrọ n’efu, ọkụ erepịachaala ọnụụzọ ama ya niile?” Eze ajụọ m sị, “Ọ bụ gịnị bụzi mkpa gị?”
Ya mere ekpere m ekpere rịọ Chineke nke eluigwe, wee zaghachi eze sị, “Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, ọ bụrụ na ọrụ m na-arụ dị ya mma, o nwere ike ziga m obodo Juda, n’obodo ebe e liri nna m ha, ka m rụgharịa ya.”
Ezenwaanyị nọ n’akụkụ eze mgbe eze jụrụ m sị, “Ị ga-anọ ruo ole mgbe? Kedụ mgbe ị ga-alọta?” Mgbe m gwara ya ụbọchị m ga-alọta, ọ sịrị m gaba.
Agwara m eze sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị, nye m akwụkwọozi m ga-enye ndịisi ọchịchị obodo nke dị n’ofe osimiri, ka ha nwee ike ịhapụ m ka gafee ruo obodo Juda.
Nyekwa m akwụkwọozi m ga-enye Asaf onye nlekọta ọhịa eze ka onye m osisi m ga-eji rụzie mgbidi ụlọ ahụ dị n’akụkụ ụlọnsọ, na mgbidi obodo ahụ, n’ụlọ nke m ga-ebi na ya.” Eze meere m ihe m rịọrọ ya n’ihina aka ọma Chineke m nọnyeere m.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 137: 1-2, 3, 4-5,6
Azịza: Ka ire m tapara n’ọnụ m ma ọ bụrụ na m echefuo gị
1. N’akụkụ mmiri nke Babịlọn
ka anyị nọdụrụ ala bee akwa
mgbe anyị chetara Zayọn.
Anyị kobere ụbọ akwara anyị n’elu
osisi dị n’akụkụ mmiri ahụ.
Azịza: Ka ire m tapara n’ọnụ m ma ọ bụrụ na m echefuo gị
2. Ebe ahụ ka ndị dọtara anyị n’agha gwara anyị
Ka anyị kweere ha ụfọdụ ukwe
nke Zayọn iji mee ha obi ụtọ.
Azịza: Ka ire m tapara n’ọnụ m ma ọ bụrụ na m echefuo gị
3. Mana olee otu anyị ga-esi ekwe
Ukwe nke Onyenweanyị n’obodo ndị ọgọ mmụọ?
Ọ bụrụ na-echefuo m gị O Jerusalem,
Ka aka nri m kpọnwụọ!
Azịza: Ka ire m tapara n’ọnụ m ma ọ bụrụ na m echefuo gị
4. Ka ire m tapara n’ọnụ m
ma ọ bụrụ na m echefuo gị
Ọ bụrụ na anaghị m ewere Jerusalem
Dịka ihe kacha enye m añụrị.
Azịza: Ka ire m tapara n’ọnụ m ma ọ bụrụ na m echefuo gị
MBEKU – 1 Sam 3;9; Jọn 6:69
Alleluịa, Alleluịa:
Kwuwe Onyenwe m, nwodibo gị na-ege ntị. Ọ bụ gị jị okwu nke ndụ ebeebe.
Alleluịa.
OZIỌMA – 9:57-62
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe Jesu na ndị na-eso ụzọ ya na-aga n’ụzọ, otu nwoke sịrị Jesu, “Aga m eso gị ebe ọbụla ị na-eje.”
Jesu asị ya, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụnnụnụ nke igwe nwekwara akwu, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ ga-edobe isi.”
Ọ gwara onyeọzọ sị, “So m.” Ma onye ahụ sịrị, “Dinwenụ m, kwee ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”
Jesu sịrị ya, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie onwe ha. Ma gị onwe gị, gaa ka Ị kwusaa Alaeze Chineke.”
Onyeọzọ gwakwara ya sị, “Aga m eso gị Dinwenụ m, ma kwee ka m buru ụzọ gaa sị ndị nọ n’ụlọ m nọdụ mma.”
Jesu sịrị ya, “Onye ọbụla nke jidere ọgụ eji akọ ubi, ma anya atọ ya n’azụ, ekwesịghị alaeze nke Chineke.
Igbo Mass Readings for October 4 2029, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for October 3 2029, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.