Igbo Mass Readings for October 2 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 2 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:1-12, 14-16
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ nke Job
Job zara sị: “N’eziokwu ama m na ọ dị otu a, ma olee otu mmadụ ga-esi dịzu mma n’ihu Chineke?
Ọ bụrụ na mmadụ achọọ ka ya na ya gbaghaa okwu, onye ahụ apụghị ịza ya otu ugboro n’ime otu puku.
Ọ maara ihe, ike ya dị ebube, olee onye kpọchiri obi n’ebe ọ nọ ma nwee mmeri? Onye nke na-akwagharị ụwa n’ọnọdụ ya, ma mee ka ide ya niile ma jijiji.
Onye na-etiri anyanwụ iwu, ọ hapụ ịwa, onye nke kpuchiri kpakpando ga. Onye ọ bụ naanị ya setịpụrụ eluigwe ma zọgidekwa ebilimmiri ụkwụ.
Onye nke mebere Bea na Ọrion, Plaịdes na ụlọ ọgbakọ nke ndịda. Onye na-eme nnukwu ihe nke karịrị nghọta na ihe dị ịtụnanya enweghị ịgụta ọnụ.
Lee, ọ na-esi n’ebe m nọ agafe, ma anaghị m ahụ ya. Ọ narịị agakwa ma amataghị m ya. Lee ọ na-apụnarị ihe n’ike, onye pụrụ igbochi ya?
Onye ga-ajụ ya: “Gịnị ka ị na-eme ihe a?” Kedụ ka m ga-esi zaghachi ya, ma kpachapụkwa anya n’okwu m?
Ọ bụ ezie na aka m dị ọcha ma apụghị m ịza ya okwu.S Aga m arịọ ebere n’aka onye na-ebo m ebubo. Ọ bụrụ na m kpọkuo ya, ọ zam, agaghị m ekwere na ọ na-ege m ntị n’olu.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 88:10-11, 12-13, 14-15
Azịza: Onyenweanyị mee ka ekpere m ruo gị ntị
1. Ana m akpọku gị ụbọchị niile O Onyenweanyị
agbasapụrụla m gị aka m.
Ọrụ ebube gị niile ọ bụ maka ndị nwụrụ anwụ?
Mmụọ ha ọ ga-esi n’ili kulie too gị? Azịza.
2. Onye na-ekwupụta ịhụnanya gị n’ime ili
Mọbụ ntụkwasịobi gị n’ala mmụọ?
Ndị nọ n’ime ili ha na-anụ maka ọrụ ebube gị niile
ndị e chezọrọ echezọ ha na-anụ maka eziomume? Azịza.
3. Mana anọ m ebe a na-arịọ enyemaka gị
O Onyenweanyị na-ekpere m ụtụtụ niile!
Gịnị mere I jiri jụ m O Onyenweanyị?
Gịnị mere I jiri zonahụ m ihu gị? Azịza.
MBEKU – 1 Sam 3;9; Jọn 6:69
Alleluịa, Alleluịa:
Kwuwe Onyenwe m, nwodibo gị na-ege ntị. Ọ bụ gị jị okwu nke ndụ ebeebe.
Alleluịa.
OZIỌMA – 9:57-62
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe Jesu na ndị na-eso ụzọ ya na-aga n’ụzọ, otu nwoke sịrị Jesu, “Aga m eso gị ebe ọbụla ị na-eje.”
Jesu asị ya, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụnnụnụ nke igwe nwekwara akwu, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ ga-edobe isi.”
Ọ gwara onyeọzọ sị, “So m.” Ma onye ahụ sịrị, “Dinwenụ m, kwee ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”
Jesu sịrị ya, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie onwe ha. Ma gị onwe gị, gaa ka Ị kwusaa Alaeze Chineke.”
Onyeọzọ gwakwara ya sị, “Aga m eso gị Dinwenụ m, ma kwee ka m buru ụzọ gaa sị ndị nọ n’ụlọ m nọdụ mma.”
Jesu sịrị ya, “Onye ọbụla nke jidere ọgụ eji akọ ubi, ma anya atọ ya n’azụ, ekwesịghị alaeze nke Chineke.
Igbo Mass Readings for October 3 2024, Ncheta Therese nke Oberenwa Jesu dị Asọ
Igbo Mass Readings for October 2 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.