Igbo Mass Readings for August 30 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 30 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:9-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl Degaara Ndị Tesalonịka
Eji m aka ụmụnna, na ụnụ chetara ọrụ na ndọlị anyị. Anyị rụrụ ọrụ ehihie na abalị ka anyị ghara ịbụrụ onye ọbụla n’ime ụnụ ibu arọ mgbe anyị na-ekwusara ụnụ oziọma.
Ụnụ onwe ụnụ bụ ndị akaebe anyị, Chineke bụkwa onye akaebe anyị, otu anyị si dị nsọ bụrụ ndị eziomume, bụrụkwa ndị omume ha enweghị ntụpọ n’ebe ụnụ bụ ndị kwere ekwe nọ.
Ụnụ matakwara na anyị mesoro onye ọbụla n’ime ụnụ dịka nna si emeso ụmụ ya; anyị gbara ụnụ ume, jakwaa ụnụ ike; ka ụnụ na-ebi ndụ otu o kwesịrị ndị nke Chineke, onye kpọrọ ụnụ ka ụnụ bata n’alaeze ya na otito ya.
Anyị na-ekelekwa Chineke mgbe niile n’ihi nke a, na mgbe ụnụ nụrụ okwu Chineke nke anyị wetaara ụnụ, ụnụ naara ya, ọ bụghị dịka okwu mmadụ kama dịka ihe ọ bụ n’onwe ya, okwu nke Chineke nke na-arụ ọrụ n’ime ụnụ, ndị kwerenụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 139:7-8, 9-10, 11-12
Azịza: Onyenweanyị i nyochaala m marakwa m!
1. Olee ebe m nwere ike ịga iji gbalahụ gị
Ebee ka m ga-agbaga wee pụọ n’ihu gị?
Ọ bụrụ na m agbagoo n’eluigwe, ị nọ ebe ahụ!
Ọ bụrụ na m agaa n’ala mmụọ, ị nọkwa ebe ahụ. Azịza
2. Ọ bụrụ na m efegaa n’ọwụwa anyanwụ;
Mọbụ biri n’ọdịda ya na ngafe osimiri,
Aka gị nọkwa ebe ahụ na-edu m;
Aka nri gị na-ejidesị m ike. Azịza
3. Ọ bụrụ na m arịọ ọchịchịrị ka o kpuchie m,
Ma ọ bụkwanụ ka ehihie ghọọrọ m abalị
Ọchịchịrị ahụ agaghị agbara gị itiri,
Ọ bụladị abalị na-adịrị gị ka ehihie. Azịza.
MBEKU – Jọn 17:17
Alleluia, Alleluia:
Were eziokwu gị doo anyị nsọ n’ihina okwu gị bụ eziokwu.
Alleluia
OZIỌMA – 23:27-32
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu kwuru sị: “Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihuabụọ. Ụnụ dịka ili e tere nzu ọcha mara mma n’anya, ma ihe jupụtara ha n’ime bụ ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ na ihe rere ure.
Otu a ka ụnụ si eme ka ndị eziomume n’ihu ndị mmadụ, ma n’ime ụnụ, ụnụ jupụtara na mpụ na aghụghọ. Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihuabụọ.
Ụnụ na-egwu ili ndị amụma, na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta eziomume. Ụnụ na-ekwukwa sị, A sị, na anyị biri n’oge nnanna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wụfuo ọbara ndịamuụma.
N’ụzọ dị otu a, ụnụ na-agba akaebe megide onwe ụnụ na ụnụ bụ ụmụ ndị gburu ndịamụma. Ngwa rụchazienụ ọrụ nna ụnụ ha bidoro.”
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.