Igbo Mass Readings for August 28 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 28 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:6-10, 16-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Abụọ Pọl degaara Ndị Tesalonịka

Anyị na-enye ụnụ iwu, ụmụnna m n’aha Dinwenụ anyị Jesu Kristi, ka ụnụ zere onye ọbụla n’ime ụnụ achọghị ịrụ ọrụ na onye adịghị eso nkuzi nke ụnụ natara n’aka anyị.

Ụnụ onwe ụnụ maara otu ụnụ ga-esi na-eñomi anyị. Anyị anọghị nkịtị mgbe anyị na ụnụ nọ. Anyị erighị nri onye ọbụla n’akwụghị ụgwọ, mana anyị rụsiri ọrụ ike, gbalịa mgbalị ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụrụ onye ọbụla ibu arọ.

Ọ bụghị na anyị enweghị ikike ịnara ụnụ ihe oriri, kama ka anyị wee kuziere ụnụ site n’omume anyị ihe ụnụ ga na-eñomi.

Ọ bụladị mgbe anyị na ụnụ nọ, anyị nyere ụnụ iwu a: “onye ọbụla achọghị ịrụ ọrụ, ya erila ihe.” Ugbu a, ka Dinwenụ anyị n’onwe ya, onyeisi udo, nye ụnụ udo mgbe niile n’ụzọ niile.

Ka Dinwenụ anyị nọnyere ụnụ. Mụ onwe m bụ Pọl jiri aka m dee ekele nke a. Nke a bụ ihe e ji ahụba akwụkwọozi ọbụla ama. Otu a ka m si ede ihe. Ka amara nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi dịrị ụnụ niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 128:1-2, 4-5

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu.

1. Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu

na-eso ụzọ ya.

Ihe aka gị kụtara ka ị ga-eri,

añụrị na ọganịihu ga-abụ nke gị. Azịza

2. Lee otu ahụ ka a ga-esi gọzie onye ahụ,

nke na-atụrụ Chineke egwu.

Ka Onyenweanyị si na Zayọn gọzie gị,

Ka ị hụkwa ọganịihu nke Jerusalem

ụbọchị ndụ gị niile. Azịza

MBEKU – Jọn 17:17

Alleluia, Alleluia:

Were eziokwu gị doo anyị nsọ n’ihina okwu gị bụ eziokwu.

Alleluia

OZIỌMA – 23:27-32

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu kwuru sị: “Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihuabụọ. Ụnụ dịka ili e tere nzu ọcha mara mma n’anya, ma ihe jupụtara ha n’ime bụ ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ na ihe rere ure.

Otu a ka ụnụ si eme ka ndị eziomume n’ihu ndị mmadụ, ma n’ime ụnụ, ụnụ jupụtara na mpụ na aghụghọ. Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihuabụọ.

Ụnụ na-egwu ili ndị amụma, na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta eziomume. Ụnụ na-ekwukwa sị, A sị, na anyị biri n’oge nnanna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wụfuo ọbara ndịamuụma.

N’ụzọ dị otu a, ụnụ na-agba akaebe megide onwe ụnụ na ụnụ bụ ụmụ ndị gburu ndịamụma. Ngwa rụchazienụ ọrụ nna ụnụ ha bidoro.”

Igbo Mass Readings for August 29 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for August 28 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 11, 2022