Igbo Mass Readings for August 20 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 20 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:6-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ndịikpe

Mgbe ahụ, ụmụ nwoke ndị Shekem na Betmilo niile wee zukọọ, jee n’osisi Ook dị na Shekem nọrọ ebe ahụ chie Abimelek eze.

Mgbe Jotam nụrụ ya, o jere guzo n’elu Ugwu Gerizim, nọrọ ebe ahụ kwuo n’olu ike sị: “Geenụ m ntị, ụnụ ụmụnwoke ndị Shekem, ka Chineke wee gee ụnụ ntị!

Otu mgbe, osisi niile zukọrọ ịhọta onye ga-abụrụ ha eze. Ha wee sị osisi oliv, “bụrụ eze anyị.” Osisi Oliv zaa ha sị, “Aga m ahapụ imepụta mmanụ nke e ji asọpụrụ Chineke na mmadụ wee chịwa ụnụ?”

Osisi niile wee sị osisi Fiig, “Bịa bụrụ eze anyị? Osisi Fiig zaa ha sị, “Aga m akwụsị ịmịpụta mkpụrụ ọma m dị ezigbo ụtọ wee chịwa ụnụ?”

Osisi niile wee jekwuru osisi vaịn sịkwa ya, “Bịa bụrụ eze anyị?” Osisi vaịn zaa ha, “Aga m akwụsị ịmepụta mmanya m nke na-enye chi niile na mmadụ añụrị wee chịwa ụnụ?”

Ha jekwuru osisi ogwu sị ya, “Bịa bụrụ eze anyị.” Osisi ogwu zara ha sị, “Ọ bụrụ na ụnụ chọrọ n’ezie ime m eze ụnụ, bịanụ zere anwụ n’okpuru ndo m.

Ma ọ bụrụ na ọ bụghị ezie, ka ọkụ si n’ogwu m pụta repịa osisi sida niile nke Lebanọn.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 21:2-3, 4-5,6-7

Azịza: Osebụrụwa, ike gị na-enye eze añụrị

1. Osebụrụwa, ike gị na-enye eze añụrị

Ọ na-enwe añụrị n’ihina I nyela ya mmeri

I nyela ya ihe obi ya na-achọ                       

Ị naghị ajụ ihe ọbụla ọ rịọrọ gị.

Azịza: Osebụrụwa, ike gị na-enye eze añụrị

2. N’ihina I jirila ngọzi pụrụ iche zute ya

Kpube ya okpueze ejiri ọlaedo na-enweghị ntụpọ mee

I nyere ya ndụ mgbe ọ rịọrọ gị

Nyekwa ya ogologo ndụ ebeebe ebeebe.

Azịza: Osebụrụwa, ike gị na-enye eze añụrị

3. Otito ya na-abawanye site n’enyemaka nke nzọpụta gị

I jirila otito na ebube chọọ ya mma

N’ezie, I nyela ya ngọzi dị ebighịebi

Nyekwa ya ọñụ site n’ịnọ ya nso mgbe niile.

Azịza: Osebụrụwa, ike gị na-enye eze añụrị

MBEKU – Ps 145:13

Alleluia, Alleluia:          

Alaeze gị ga-adị ebeebe, ọchịchị gị na-adị na ndụdụgandụ niile Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile, omume ya niile jupụtara n’obi ebere.

Alleluia

OZIỌMA – 20:1-16

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “N’ihina alaeze eluigwe dịka otu nwoke nwere ezinụụlọ nke pụrụ n’isi ụtụtụ igote ndị ọrụ ọ ga-etinye n’ugbo vaịn ya.

Mgbe ya na ndị ọrụ ahụ kwubiri na ọ ga-akwụ ha otu dinarị n’ụbọchị, o zigara ha n’ubi ya. N’ihe dịka elekere itoolu ọ pụkwara hụ ndị ọzọ ebe ha guzo nkịtị n’ọma ahịa, Ọ sịrị ha, ‘Gabakwuonụ n’ugbo m aga m akwụ ụnụ ihe ọbụla ziri ezi.’

Ha wee gaba. Ọ pụkwara n’elekere nke iri na abụọ na nke atọ, mekwaa otu ihe ahụ. N’ihe dịka elekere nke ise, ọ pụkwara hụ ndị ọzọ ka ha guzo nkịtị.

Ọ sịrị ha, ‘Gịnị mere ụnụ ji nọrọ nkịtị n’ebe a ụbọchị niile.’ Ha sịrị ya, ‘Ọ bụ n’ihina o nweghị onye goro anyị ọrụ. O wee sị ha, ‘Gabakwanụ n’ubi m.’

Mgbe o ruru na mgbede onye nwe ubi ahụ gwara odibo na-elekọtara ya ubi anya sị, ‘Kpọkọta ndị ọrụ, kwụọ ha ụgwọ, bido na ndị ikpeazụ ruo na ndị mbụ.

Mgbe ndị bịara ọrụ n’elekere nke ise pụtara, a kwụọ onye ọbụla n’ime ha otu dinarị. Mgbe ndị buru ụzọ bido ọrụ bịara ha chere na a ga-akwụ ha karịa.

Ma onye ọbụla n’ime ha natara otu dinarị dịka ndị ọzọ. Mgbe ha natara ego, ha tamuru ntamu megide onye ahụ nwe ubi, na-asị, ‘Ndị bịara n’ikpeazụ rụrụ ọrụ naanị otu elekere ma i meela ka anyị na ha hara.

Anyị bụ ndị ji ụtụtụ buru mgbu ọrụ na anwụ chara n’ụbọchị taa.’ Onye nwe ubi zara otu n’ime ha sị, ‘Enyi m, ọ dịghị ihe ọjọọ m mere gị.

Ọ bụ na mụ na gị ekwughị na m ga-akwụ gị otu dinarị n’ụbọchị. Nara nke ruru gị laba. N’ihina achọrọ m ịkwụ ndị a bịara ikpeazụ ụgwọ dịka m si kwụọ gị.

Ọ bụ na-agaghị m eji ihe m nwere mee otu ọ masịrị m? Ka ị na-arọ m anya n’ihi obiọma m?’ Onye mbụ ga-abụ onye ikpeazụ, onye ikpeazụ abụrụ onye mbụ.

Igbo Mass Readings for August 21 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for August 20 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.