Igbo Mass Readings for November 15 2023, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 15 2023, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:2-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe

Nụrụnụ nke a ụnụ bụ ndị na-achị igwe mmadụ, ụnụ bụ ndị na-etu ọnụ maka ọtụtụ obodo dị n’okpuru ụnụ. N’ihina ka ọchịchị ụnụ sitere n’aka nke Yahweh, okpueze ụnụ bụ onyinye nke onye kacha elu.

Yahweh n’onwe ya bụ onye ga-eleba anya n’omume ụnụ ma nyochaakwa atụmaatụ ụnụ. Dịka ụmụodibo ọ hanyere ala eze ya n’aka, ọ bụrụ na ụnụ achịghị n’usoro nke kwụọtọ, nke ụnụ na-edebe iwu ya mọbụ na-eme otu Chineke siri chọọ;

Ọ ga-ezitere ụnụ ahụhụ dị egwu na mberede. Oke ikpe na-eche ndị ọchịchị na ndị ukwu. E nwere ike iji obi ebere gbaghara ndị obere mmadụ, mana ndị ukwu ka a ga-enye nnukwu ahụhụ.

N’ihina Yahweh nke ihe niile anaghị atụ egwu onye ọbụla. Ọ dịghị ihe ukwu ọbụla nke ga-agbachi ya anya, n’ihina ọ bụ ya onwe ya mere ma ndị ukwu ma ndị nta, na-akpachapụrụ ihe niile anya.

Kama ezigbo nnyocha na-eche ndị ike ọchịchị dị n’aka. N’ezie, ndịeze, okwu m ndị a bụ maka ụnụ; ka ụnụ mara ihe amamihe bụ, wee ghara ijehie ụzọ.

N’ihina ndị na-edebe ihe dị asọ nsọ, a ga-ewere ha ka ndị dị asọ. Ọ bụrụ na ụnụ esi na ha mụta nnukwu ihe, ụnụ nwere ike ịzọpụta onwe ụnụ n’ụbọchị ikpe. Nwee nnukwu mmasị n’okwu m oge niile, nwee agụụ maka ha, ka ha kuziere gị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 82: 3-4, 6-7

Azịza: Kulie, O Chineke, kpee ụwa niile ikpe

1. Ka ndị ike adịghị na ndị enwe nne enwe nna

nweta ikpe ziri ezi                

Chekwaba ndị ogbenye na ndị enweghị enyemaka

Zọpụtanụ ndị adịghị ike na ndị nọ na mkpa;

Zọpụtanụ ha n’aka ndị ajọ mmadụ. Azịza

2 Ekwuru m na mbụ, Ụnụ onwe ụnụ bụcha chi,

ụmụ nke onye kacha elu

mana n’agbanyeghị, ụnụ ga-anwụ dịka ndị mmadụ ndị ọzọ,

daa ka nwa eze ọbụla. Azịza

MBEKU – Col 3:16, 17.

Alleluịa, Alleluịa:

Na-enyekwanụ Chineke Nna anyị ekele site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi, ka okwu nke Kristi biri n’ime ụnụ n’uju ya.

Alleluịa.

OZIỌMA – 17:11-19.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Ka Jesu na-aga Jerusalem, o sitere n’ụzọ dị n’agbata Sameria na Galili. Mgbe Ọ banyere n’otu ọnụmara, ndị ekpenta mmadụ iri kwụ n’ụzọ zutere ya.

Ha welitere olu tie mkpu sị, “Jesu, Nna anyị ukwu, meere anyị ebere.” Mgbe Jesu hụrụ ha, Ọ gwara ha sị, “Gaanụ gosị ndị ụkọchukwu onwe ụnụ.”

Ka ha na-aga e mere ka ahụ ha dị ọcha. Mgbe otu n’ime ha hụrụ na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chukwu.

Ọ bịara daa n’ụkwụ Jesu na-enye ya ekele. Nwoke a bụ onye Sameria. N’ihi nke a Jesu jụrụ sị, “Ọ bụ na ọ bụghị mmadụ iri ka a gwọrọ?

Kedụkwanụ maka mmadụ itoolu ndịọzọ? Ọ bụ na o nweghị onye n’ime ha lọghachiri azụ inye Chineke otito ma ọ bụghị onye mba ọzọ a?”

Jesu gwara ya sị, “Bilie, gawara onwe gị, okwukwe gị azọọla ga.”

Igbo Mass Readings for November 16 2023

Last Update: October 16, 2022