Igbo Mass Readings for November 13 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 13 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-7
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara Taịtọs
Chetara ndị mmadụ ka ha na-erubere ndị nọ n’ọchịchị isi, dịkwa nkwadobe ịrụ ọrụ ọma ọbụla. Gwa ha ka ha ghara ikwutọ onye ọbụla, zere okwunụụka, dị ọgọ, na-akwanyekwara ndịọzọ ugwu.
Anyị onwe anyị bụ ndị nzuzu na mbụ, ndị isiike, ndị e duhiere ụzọ, ndị agụụ nke anụahụ na ihe ụtọ dị icheiche na-achị.
Na mbụ, anyị bi n’iro na ekworo. Ndị mmadụ kpọrọ anyị asị, anyị kpọkwara onwe anyị asị.
Oge obiọma na ịhụnaanya nke Chineke bụ onye Nzọpụta anyị pụtara ihe, ọ zọpụtara anyị. Ọ bụghị n’ihi ezi ọrụ ndị anyị rụrụ, kama ọ bụ site n’ebere ya, site na nsacha nke ọbara ya, nke Mmụọ Nsọ o ji amụ anyị ọzọ na nke o ji enye anyị ndụ ọhụrụ.
O nyere anyị Mmụọ Nsọ ahụ n’uju site n’onye Nzọpụta anyị bụ Jesu Kristi. Chineke mere nke a ka o nwee ike isi n’amara ya gụnye anyị na ndị eziomume, ka anyị nwee ike iketa ndụ ebighị ebi anyị na-ele anya ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 23:1-3, 3-4, 5, 6.
Azịza: Chineke bụ onyenche m, O nweghị ihe m ga-achọ.
1.Chineke bụ onyenche m O nweghị ihe m ga-achọ
Ọ na-eme ka m zuru ike ebe ahịhịa ndụ dị
Ọ na-eduga m na mmiri
Ebe ahụ ka Ọ na-enye m ike. Azịza.
2. Ọ na-edu m n’ụzọ eziomume
n’ihi aha ya
Ọbụrụgodu na m na-aga na ndagwurugwu nke ọnwụ
egwu ọbụla agaghị atụ m
iji mkpara na ngu gị nọdebe m
Ọ bụ ha na-enye m agbamume. Azịza.
3. Ị na-akwadoro m nri.
n’ihu ndịiro m.
I teela isi m mmanụ
Iko m ejula n’ọnụ na-agbọfu. Azịza.
4. N’ezie obiọma na ebere ga na-eso m
ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke
Ebeebe ebeebe! Azịza.
MBEKU – Col 3:16, 17.
Alleluịa, Alleluịa:
Na-enyekwanụ Chineke Nna anyị ekele site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi, ka okwu nke Kristi biri n’ime ụnụ n’uju ya.
Alleluịa.
OZIỌMA – 17:11-19.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ka Jesu na-aga Jerusalem, o sitere n’ụzọ dị n’agbata Sameria na Galili. Mgbe Ọ banyere n’otu ọnụmara, ndị ekpenta mmadụ iri kwụ n’ụzọ zutere ya.
Ha welitere olu tie mkpu sị, “Jesu, Nna anyị ukwu, meere anyị ebere.” Mgbe Jesu hụrụ ha, Ọ gwara ha sị, “Gaanụ gosị ndị ụkọchukwu onwe ụnụ.”
Ka ha na-aga e mere ka ahụ ha dị ọcha. Mgbe otu n’ime ha hụrụ na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chukwu.
Ọ bịara daa n’ụkwụ Jesu na-enye ya ekele. Nwoke a bụ onye Sameria. N’ihi nke a Jesu jụrụ sị, “Ọ bụ na ọ bụghị mmadụ iri ka a gwọrọ?
Kedụkwanụ maka mmadụ itoolu ndịọzọ? Ọ bụ na o nweghị onye n’ime ha lọghachiri azụ inye Chineke otito ma ọ bụghị onye mba ọzọ a?”
Jesu gwara ya sị, “Bilie, gawara onwe gị, okwukwe gị azọọla ga.”
Igbo Mass Readings for November 14 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for November 13 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.