Igbo Mass Readings for November 29 2023, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 29 2023, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-6, 13-14, 16-17, 23-28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Daniel
Eze Belsheza kpọrọ puku ndịisi nọ n’alaeze ya nnukwu oriri, ya na ha ñụkọkwara mmanya. Mgbe Belshaza ñụtụrụ mmanya, o nyere iwu ka a chịta iko ọlaọcha na ọlaedo ahụ, nke nna ya bụ Nebukadneza chịkọọrọ n’ụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem ka eze, na ndịisi nọ n’alaeze ya, ndị nwunye ya na ndịikom ya were ha ñụọ mmanya.
Ha wee chịbata iko ọlaọcha na ọlaedo ahụ e siri na nnukwu ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem chịkọrọ. Mgbe a chịbatara ha, eze, ndịisi nọ n’alaeze ya, ndị nwunye ya na ndị ikom ya wee were ha ñụọ mmanya.
Ha ñụrụ mmanya wee tokwaa chi ha, ndị e jiri ọlaọcha na ọlaedo, mọbụ igwe na ọlaọkụ, mọbụ nkume na osisi mee. Na mberede, aka mmadụ pụtara bido debe ihe n’aja ụlọ nke obi eze ahụ ha nọ n’ime ya, n’azụ ebe a dọbara nkwụba ọkụ.
Eze n’onwe ya hụrụ aka ahụ oge ọ na-ede ihe a. Mgbe ahụ, ihu eze gbanwere, oke egwu tụkwara ya, apata ụkwụ ya yọsịrị, ikpere ya amawa jijiji. A kpọbatara Daniel n’ihu eze, eze wee jụọ ya sị, “Ọ bụ gị bụ Daniel otu n’ime ndị Juda ndị nna m siri Juda dọta n’agha?
Anụla m na mmụọ nke chi kachasị nsọ bi n’ime gị, na ịbụkwa onye jupụtara na nghọta na amamihe. Mana anụrụ m na I nwere ike ịkọwa ihe ọbụla gbagwojuru anya na ihe ọbụla siri ike.
Ugbu a, ọ bụrụ na I nwere ike ịgụ ihe a e dere ma kọwakwaara m ihe ọ pụtara, a ga-eyibe gị akwa nke ndịeze, yinyekwa gị ihe olu ọlaedo, meekwa ka ị bụrụ onye ọchịchị nke atọ n’alaeze m.”
Daniel zara ya sị, “Jide onyinye gị ma werekwa ụgwọ gị nye ndịọzọ. N’agbanyeghị aga m agụrụ gị ma kọwakwara gị ihe ahụ e dere. I leliala Chineke nke eluigwe.
I wepụtala iko ndị a e siri n’ụlọnsọ ukwu ya chịkọrọ, gị na ndịisi nọ n’alaeze gị, ndị nwunye gị na ndị ikom gị wee were ha ñụọ mmanya. Ụnụ tokwara chi ndị e jiri ọlaọcha na ọlaedo, ọlauhie na igwe, osisi na nkume wee mee, chi ndị a anaghị ahụ ụzọ, mọbụ na-anụ ihe, mọbụ nwee uche.
Ma ụnụ etoghị Chineke onye na-enye ụnụ ume ndụ, na onye ndụ gị na ọganiihu gị dị n’aka ya. Ọ bụ nke a mere ka Chineke zite aka ahụ nke depụtara okwu ndị a.
Ihe a bụ ihe o dere: MENE MENE TEKEL na PARSIN. Nke a bụ nkọwa ha, MENE pụtara na Chineke agụkọọla ụbọchị ọchịchị gị, mee ka ha bịa na njedebe. TEKEL pụtara na a tụọla gị n’ihe e ji atụ ihe, wee hụ na i zughị oke. PARSIN pụtara na e keela alaeze gị n’etiti ndị Mede na ndị Peshịa.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Dan 3: 62, 63, 64, 65, 66, 67
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
1. Anyanwụ na ọnwa gọzienụ Yahweh;
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza
2. Kpakpando niile nọ n’eluigwe gọzienụ Yahweh,
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza
3. Mmiri ozizo na igirigi gọzienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza
4. Ifufe niile gọzienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza
5. Ọkụ na-enwu enwu na ekpomọkụ gọzienụ Yahweh,
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza
6. Ụgụrụ na Oyi gọzienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza
MBEKU – Luk 21:36.
Alleluịa, Alleluịa:
Nọdụnụ na nche na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile; ka ụnụ nwee ike iguzo n’ihu nwa nke mmadụ ahụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 21:12-19.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ndị mmadụ ga-ejide ụnụ, sogbukwaa ụnụ. Ha ga-akpụrụ ụnụ gaa n’ụlọnzukọ ha dị iche iche ikpe ụnụ ikpe.
Ha ga-atụba ụnụ n’ụlọ mkpọrọ, kpọgakwa ụnụ n’ihu ndịeze na ndị ọchịchị, ikpe ụnụ ikpe n’ihi aha m.
Oge dị otu a ga-abụrụ ụnụ ohere iji gbaa akaebe. Ya mere kpebienụ n’obi ụnụ tupu oge ahụ eruo, na ụnụ agaghị echegbu onwe ụnụ maka ihe ụnụ ga-aza.
N’ihina mụ onwe m ga-enye ụnụ ọnụ okwu amamihe, nke onye ọbụla n’ime ndị na-emegide ụnụ agaghị enwe ike iguzogide, mọbụ imegide site n’okwu.
Ọ bụladị nne na nna ụnụ na ụmụnne ụnụ ndị nwoke, na ndị ịkwunibe ụnụ, na ndị enyi ụnụ, ga-arara ụnụ nye.
Ụfọdụ n’ime ụnụ ka ha ga-egbupụ isi. Mmadụ niile ga-akpọ ụnụ asị n’ihi aha m. Ma ọbụla otu ntụtụisi ụnụ agaghị ala n’iyi. Site n’ịkwụdosiike ụnụ ka ụnụ ga-esi enweta ndụ ụnụ.