Igbo Mass Readings for November 27 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 27 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:1-4

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.

Ahụrụ m akara ọzọ dị egwu ma dịkwa ebube n’eluigwe, ndị mmụọọma asaa ji ụzọ ahụhụ asaa.

Ha bụ ahụhụ nke ikpeazụ ndị ga-eweta iwe nke Chineke na njedebe. Ahụrụ m ihe dịka osimiri enyo nke a gwakọtara ya na ọkụ.

Ahụkwara m ndị ahụ nweterala mmeri n’ebe anụọhịa ahụ na ihe oyiyi ya na ọnụọgụgụ nke aha ya nọ ka ha guzo n’akụkụ osimiri enyo ahụ jidekwa ụbọ akwara nke Chineke n’aka ha.

Ha na-ekwe ukwe Mosis nwodibo Chineke na nke Nwaatụrụ ahụ na-asị: “Onyenweanyị, Chineke nke pụrụ ime ihe niile ọrụ gị dị ịtụnaanya dịkwa ukwuu, ụzọ gị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; Gị bụ eze nke ọgbọ niile.

Olee onye na-agaghị atụ egwu ma tookwa aha gị, O Onyenwe, O Onyenweanyị? Sọọsọ gị dị asọ. Mba niile ga-abịa kpọọ isiala nye gị n’ihina e kpugheela ikpe nkwụmọtọ gị.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98:1, 2-3, 7-78, 9.

Azịza: Onyeweanyị, Chineke nke pụrụ ime ihe niile, ọrụ gị dị ịtụnaanya dịkwa ukwuu.

1.Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,

n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube,

aka nri ya na aka ya dị nsọ

ewetarala ya mmeri. Azịza.

2. Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya

O meela ka mba niile mata eziomume ya.

O chetala ịhụnaanya ya na ịkwụdosiike ya

n’ebe ezinụụlọ Izrel nọ. Azịza.

3. Tienụ mkpu osimiri na ihe niile dị n’ime ya,

ụwa na ndị niile bi n’ime ya!

ka iyi niile kụọ aka ha

ka ugwu niile kwee ukwe añụrị. Azịza.

4. N’ihu Onyenweanyị n’ihina ọ na-abịa

Ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe;

Ọ ga-eji ikpe ziri ezi na ikpe nkwụmọtọ

Were kpee ụwa na ndị mmadụ ikpe. Azịza.

MBEKU – Luk 21:36.

Alleluịa, Alleluịa:

Nọdụnụ na nche na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile; ka ụnụ nwee ike iguzo n’ihu nwa nke mmadụ ahụ.

Alleluịa.

OZIỌMA – 21:12-19.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ndị mmadụ ga-ejide ụnụ, sogbukwaa ụnụ. Ha ga-akpụrụ ụnụ gaa n’ụlọnzukọ ha dị iche iche ikpe ụnụ ikpe.

Ha ga-atụba ụnụ n’ụlọ mkpọrọ, kpọgakwa ụnụ n’ihu ndịeze na ndị ọchịchị, ikpe ụnụ ikpe n’ihi aha m. 

Oge dị otu a ga-abụrụ ụnụ ohere iji gbaa akaebe. Ya mere kpebienụ n’obi ụnụ tupu oge ahụ eruo, na ụnụ agaghị echegbu onwe ụnụ maka ihe ụnụ ga-aza.

N’ihina mụ onwe m ga-enye ụnụ ọnụ okwu amamihe, nke onye ọbụla n’ime ndị na-emegide ụnụ agaghị enwe ike iguzogide, mọbụ imegide site n’okwu.

Ọ bụladị nne na nna ụnụ na ụmụnne ụnụ ndị nwoke, na ndị ịkwunibe ụnụ, na ndị enyi ụnụ, ga-arara ụnụ nye.

Ụfọdụ n’ime ụnụ ka ha ga-egbupụ isi. Mmadụ niile ga-akpọ ụnụ asị n’ihi aha m. Ma ọbụla otu ntụtụisi ụnụ agaghị ala n’iyi. Site n’ịkwụdosiike ụnụ ka ụnụ ga-esi enweta ndụ ụnụ.

Igbo Mass Readings for November 28 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for November 27 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: February 11, 2021