Igbo Mass Readings for November 6 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 6 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:12-18.
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndi Filipi.
Ya bụ, ndị m hụrụ n’anya, dịka ụnụ si eruwebu isi, sinụ otu a na-eruwe isi, ọ bụghị naanị mgbe mụ na ụnụ nọ, kama, ma mgbe mụ na ụnụ anọghị.
Werenụ egwu na ịma jijiji gbawa mbọ nzọpụta ụnụ. N’ihina Chineke na-arụ ọrụ n’ime ụnụ, n’ịchọ nakwa ịrụ ọrụ dị ya ezi mma.
Ụnụ ejila ntamu mọbụ ịrụ ụka eme ihe ọbụla. Nke a dị mkpa ka ụnụ wee ghara inwe ụta, dịkwa ọcha, dịkwa ụmụ nke Chukwu n’enweghị ntụpọ n’etiti ọgbọ a, jupụtara na mmehie na arụrụala.
Kama chawapụtanụ dịka ihe n’ụwa. Jidesienụ okwu nke ndụ ahụ ike, ka ọ ga-abụ oge nke Kristi ruo, ka m nyaa isi na agbaghị na ọsọ mọbụ ruo ọrụ n’efu.
Ọ bụrụgodụ na a gbara ọbara m dịka mmanya n’elu aja nke okwukwe ụnụ, aga m enwe añụrị na obiụtọ. Otu aka ahụ, ụnụ kwesịrị iso m nwee añụrị na obiụtọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 27:1, 4, 13-14.
Azịza: Dinwenụ bụ ihe m na nzọpụta m.
1. Dinwenụ bụ ihe na nzọpụta m
onye ka m ga-atụ egwu?
Dinwenụ bụ ide nke ndụ m
Onye ga-eyi m egwu! Azịza.
2. Otu ihe ka m na-arịọ Dinwenụ
otu ihe ka m na-achọ
Ka m biri n’ụlọ nke Dinwenụ
ụbọchị niile nke ndụ m
ka m nweta ịdị ụtọ nke Dinwenụ
ka m na-ahụ ya n’ụlọnsọ ya. Azịza.
3. Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke
n’ala ndị dị ndụ
Chekwube na Dinwenụ, obi sie gị ike
tụkwasị ya obi, chekwube nay a. Azịza.
MBEKU – Ọrụ Ndịozi 16:14.
Alleluịa, Alleluịa:
Dinwenụ, meghee obi anyị, k’anyị gee ntị n’okwu nke nwa gị.
Alleluịa.
OZIỌMA – 14: 25-33.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ugbu a ọtụtụ igwe mmadụ so Jesu, O wee tụgharịa sị ha, “Onye ọbụla nke na-abịakwute m, ma ọ kpọghị nna ya na nne ya asị, na nwunye ya na ụmụ ya na nwanne ya nwoke na nwanne ya nwaanyị, ee, ọ bụladị ndụ ya, ọ pụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.
Onye ọbụla na-agaghị eburu obe ya sobe m n’azụ, Ọ pụghị ịhụ onye na-eso ụzọ m. Onye n’ime ụnụ chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ego ole ọ ga-ewe ka o wee mara ma o nwere ego ga-ezu ịrụ ụlọ elu?
O meghị otu a, mgbe ọ tọsịrị ntọala ma o nweghị ike ịrụcha ya, ndị niile hụrụ ya ga-ebido were ya mebe ihe ọchị na-asị, “Nwoke a bidoro ịrụ ụlọ ma o nweghị ike ịrụchapụ ya.”
Mọbụ, olee eze ga-achịrị naanị iri puku ndịagha gaa ibuso eze ibe ya nke nwere puku iri abụọ ndịagha, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, tụlee ma o nwere ike ibusoli ya agha?
Ọ bụrụ na o nweghị ike, mgbe onye na-ebuso ya agha ka nọ n’ebe dị anya, ọ na-ezipụ onyeozi ma rịọkwa maka ihe ga-eweta udo.
Ya bụ, onye ọbụla n’ime ụnụ na-ajụghị ihe niile o nwere, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.
Igbo Mass Readings for November 7 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for November 6 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.