Igbo Mass Readings for June 28 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 28 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:1-12, 17-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Ka e mechara, okwu nke Yahweh bịakwutere Abram n’ọhụ sị, “Ụjọ atụla gị, Abram! Abụ m onye nchedo gị, ụgwọ ọrụ gị ga-adị ukwuu”. Abram zaa ya sị, “Onyenwe m Chineke, uru gịnị ka ihe Ị chọrọ inye m ga-abara m?
Lee, enweghị m nwa”. Abram gara n’ihu sị, “Lee, o nweghị nwa ọbụla I nyere m; otu onye na ndị ohu m ga-abụ onye ga-anọchi anya m”.
Mgbe ahụ ka okwu Yahweh rutere ya ntị sị, “Ohu gị agaghị anọchi anya gị; mba, onye ga-anọchi anya gị ga-abụ nwa nke afọ gị”. Mgbe ọ kpọọrọ ya pụta n’ezi ọ sịrị ya, “Lelie anya n’igwe ma gụọ kpakpando dị na ya ọnụ, ọ bụrụ na i nwere ike; otu a ka ụmụ ụmụ gị ga-adị.”
Abram tụkwasara okwukwe ya na Yahweh onye nke gụnyeere ya nke a dịka eziomume. Ọ sịrị ya, “Abụ m Osebụrụwa Chineke onye kpọpụtara gị site n’ala Ur nke Kaldia, inye gị ala a dịka oke nke gị”.
Abram jụrụ ya sị: “Onyenwe m Yahweh, olee otu m ga-eji mara na m ga-eketa ya?” Ọ gwara ya sị: “Wetere m otu nwa ehi gbara afọ atọ, otu nne ewu gbara afọ atọ, otu ebule gbara afọ atọ, otu nwa nduru na otu kparakuku”.
O wetaara ya ihe niile ndị a, gbubie ụmụ anụmaanụ ndị ahụ abụọ abụọ ma dobe otu isi n’ihu ibe ya; ma o kewaghị ụmụnnụnụ abụọ ndị ahụ.
Mgbe ọbụla ụmụnnụnụ fedara bịa iri ozu anụ ndị ahụ, Abram achụfuo ha. Ugbu a, ka anwụ na-ada egwu jidere Abram, o wee daa na nnukwu ụra.
Mgbe anwụ dara, ọchịchịrị gbaa, ite ọkụ nke na-eku anwụrụ ọkụ, na mpanaka ọkụ ya na-enwu enwu gafere n’etiti ụzọ anụ abụọ ndị ahụ.
N’ụbọchị ahụ Yahweh na Abram gbara ndụ n’ụdị okwu ndị a! Ụmụụmụ gị ka m ga-enye ala site n’osimiri ljipt ruo n’osimiri ukwu ahụ, iyi (Yufretes).
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105:1-2,3-4,6-7,8-9
Azịza: Onyenweanyị na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe.
1. Alleluia, nyenụ Chineke ekele, kpọkuonụ aha ya,
kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya!
Kweerenụ ya ukwe, kụọrọnụ ya egwu,
kwupụtanụ ọrụ ịtụnaanya ya niile! Azịza
2. Nwebenụ añụrị n’aha nsọ ya
ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa.
Chọbanụ Onyenweanyị na ike ya,
chọbanụ ihu nke Onyenweanyị mgbe niile. Azịza
3. Ụmụụmụ Abraham bụ nwodibo ya,
ụmụ Jekọb bụ onye nke ọ họọrọ!
Ọ bụ ya bụ Onyenweanyị na Chineke anyị,
ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile. Azịza
4. Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe,
Iwu nke o tiiri puku agbụrụ gara aga,
Ọgbụgbandụ ya na Abraham gbara
na iyi nke ọ ñụụrụ Aịzik. Azịza
MBEKU – Jọn 10:27
Alleluia, Alleluịa:
Atụrụ m na-anụ olu m, amakwara m ha, ha na-esokwa m.
Alleluia.
OZIỌMA – 7:15-20
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Zerenụ ndị amụma asị, ndị na abịakwute ụnụ n’oyiyi atụrụ, ma n’ime ha, ha bụ agụ owuru. Site n’omume ha ka ụnụ ga-esi mata ha.
A na-aghọta ụdara n’osisi ogwu? Ka a na-aghọta ube n’osisi uke? Osisi ọma ọbụla na-amịta mkpụrụ ọma, ma osisi ọjọọ na-amịta mkpụrụ ọjọọ.
Osisi ọma apụghị ịmịta mkpụrụ ọjọọ, nke osisi ọjọọ pụrụ ịmịta mkpụrụ ọma. Osisi ọbụla na-amịghị mkpụrụ ọma, a ga-egbutu ya, ma tụnye ya n’ọkụ. Ya bụ, ụnụ ga-amata ha site na mkpụrụ ha.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.