Igbo Mass Readings for July 12 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 12 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 41:55-57; 42:5-7, 17-24
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Mgbe oke agụụ ahụ malitere n’ala ljipt, ndị mmadụ agakwuru Fero ịrịọ ya ihe oriri, Fero gwa ndị ljipt niile sị, “Gakwurunụ Josef meenụ ihe ọbụla ọ gwara ụnụ mee”. Ụnwụ dị n’obodo niile mgbe agụụ ahụ dịrị nnukwu n’obodo ljipt, Josef meghere ebe niile e dobere ọka wee si na ya na-eresị ndị ljipt niile nri.
Ndị mmadụ si n’akụkụ ụwa dị icheiche wee bịakwute Josef n’ljipt ịzụrụ nri, n’ihina ụnwụ kawanyere njọ n’akụkụ ụwa niile. Ụmụ Izrel sonyere ndịọzọ bịara ịzụta nri n’ihi ụnwụ dị n’ala Kenaan niile. Ọ bụ Josef onye ọchịchị obodo dị n’aka na-eresị ndị mmadụ niile bịara ịzụrụ ihe oriri.
Ụmụnne Josef wee bịa kpọọ isiala n’ihu ya. Ozigbo Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara na ọ bụ ha, mana o meghị ka ha mata na ọ bụ ya. Ọ gwara ha okwu n’olu ike sị, “Ebee ka ụnụ siri bịa?”
Ha zaa ya sị “Anyị si n’ala Kenaan bịa ịzụta nrị”. O wee kpọrọ ha niile tinye n’ụlọmkpọrọ mkpụrụ ụbọchị atọ. N’ụbọchị nke atọ, Josef gwara ha sị, “Meenụ nke a, ụnụ ga-adị ndụ makana abụ m onye na-atụ Chineke egwu.
Ọ bụrụ na ụnụ bụ ndị eziokwu, ka a kpọchie otu onye n’ime ụnụ n’ebe ahụ a kpọchibidoro ụnụ mbụ, ka ndịọzọ buru ihe oriri bulaara ezinụụlọ ụnụ ndị nọ n’oke agụụ. Ma ụnụ ga-akpọtara m nwanne ụnụ nwoke nke ọdụdụ; ọ bụ otu a ka m ga-esi chọpụta ma ihe ụnụ kwuru ọ bụ eziokwu.
Ọ bụrụ eziokwu, ụnụ agaghị anwụ”. Ha mere otu ahụ. Ha gwarịtara onwe ha, na-asị, “n’ezie ọ bụ ahụhụ ihe ọjọọ anyị mere nwanne anyị nwoke ka anyị na ata ugbu a.
Anyị hụrụ ụdị nnukwu ihemgbu nke mmụọ ọ nọ n’ime ya mgbe ọ rịọrọ anyị ka anyị hapụ ya, mana anyị egeghị ya ntị. Ọ bụ nke a mere mmekpaahụ ndị a ji rute anyị ugbu a”.
Ruben zara ha sị, “Ọ bụ na m agwaghị ụnụ emela nwa ahụ ihe ọjọọ ọbụla? Ma ụnụ egeghị ntị, ugbu a ọbara ya adịla n’isi anyị”.
Ha amataghị na Josef na-anụ ihe niile ha na-ekwu n’ihina o nwere onye ntapịaokwu nọ n’etiti ha. Ọ pụrụ n’ihu ha bee akwa.
Mgbe o nwere ike ịgwa ha okwu ọzọ, ọ laghachiri azụ nye iwu ka a kpọrọ Simiọn kekọọ ya aka na ụkwụ n’ihu ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 33:2-3, 10-11, 18-19
Azịza: Ka ịhụnaanya gị dị n’ebe anyị nọ, O Chineke, ebe nchekwube anyị dị na gị.
1. Werenụ ụbọ akwara too Chineke,
werenụ une kụọrọ ya egwu,
kweerenụ Chineke ukwe ọ hụrụ
werenụ ike ụnụ niile kweere Onyenweanyị ukwe mmeri. Azịza
2. Ọ na-emebi atụmaatụ mba niile,
ọ na-eme ka echiche ha laa n’iyi.
Mana atụmatụ Chineke ga-adị ọkpụ
Echiche obi ya niile ga-adị ebeebe. Azịza
3. Ma lee ka Onyenweanyị si eleta ndị niile na-atụrụ ya egwu anya,
ndị niile tụkwasịrịobi ha n’ịhụnaanya ya,
ka O wee zọpụta mkpụrụobi ha n’ọnwụ,
ma chekwaba ha oge ụnwụ. Azịza.
MBEKU – Phil 2:15-16
Alleluia, Alleluịa:
Chawapụtanụ dịka ihe n’ụwa, jidesienụ okwu nke ndụ ahụ ike.
Alleluia
OZIỌMA – 10:1-7
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu kpọrọ ndị ụmụazụ ya iri na abụọ, nye ha ike ịchụpụ ajọ mmụọ na ịgwọ ọrịa na nrịanrịa niile dị icheiche. Aha ndị ụmụazụ iri na abụọ ahụ bụ ndị a: onye mbụ bụ Saịmọn onye a na-akpọ
Pita, na nwanne ya nwoke bụ Andru, Jemis, nwa Zebedi, na nwanne ya nwoke bụ Jọn, Filip na Batolomi, Tọmọs na Matiu onye ọnaụtụ; Jemis nwa Alfeus na Tedeus, Saịmọn onye Kenaan na Judas Iskarịọt onye rere Jesu.
Jesu zipụrụ mmadụ iri na abụọ ndị na-eso ụzọ ya, nye ha iwu sị, “Ụnụ agakwala ebe ọbụla na nke ndị mba ọzọ, mọbụ banye n’obodo ndị Sameria, Kama jekwurunụ ụmụatụrụ furu efu nke ụlọ Izrel. Ka ụnụ na-aga, na-ekwunụ sị, “Alaeze eluigwe adịla nso”.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.