Igbo Mass Readings for July 10 2024, Wenezde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 10 2024, Wenezde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 10:1-3, 7-8, 12

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Hosea

Izrel bụ osisi vaịn ahụ dị mma, na-amịta mkpụrụ nke ukwu. Ka mkpụrụ ya na-abawanye ka ọ na-arụwanye ebe nchụaja. Ka obodo ya na-enwe agamnihu, ọ na eme ka ide ya siwanye ike.

Obi ha dị aghụghọ, ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka njọ ha. Yahweh ga-akwatu ebe nchụaja ha ma mebichaa ide ha.

Ma ugbu a, ha ga-asị, “Anyị enweghị eze n’ihina anyị anaghị atụ Yahweh egwu, ma kedụ ihe eze nwere ike imere anyị? Eze Sameria ga-ala n’iyi dịka mpekele osisi mmiri na ebugharị.

A ga-emebicha ụlọarụsị nke Aven ebe ndị Izrel mere njọ. Ogwu na ahịhịa ga-etochi ebe nchụaja ha. Mgbe ahụ ha ga-asị nnukwu ugwu, ‘kpuchie anyị!’ gwa obere ugwu, sị, ‘Dagide anyị!’

Kụọnụ mkpụrụ eziomume maka onwe ụnụ, weenụ ihe ubi nke ịhụnaanya kwụdosịrịike. Kọrienụ ala ụnụ hapụrụ ahapụ n’ihina ugbu a bụ oge a ga-eji chọọ Yahweh ka o wee bịa zokwasị ụnụ nzọpụta dịka mmiri.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105:2-3, 4-5, 6-7

Azịza: Chọbanụ ihu nke Onyenweanyị mgbe niile.

1. Kweerenụ ya ukwe, kụọrọnụ ya egwu,

Kwupụtanụ ọrụ ịtụnaanya ya niile!

Nwebenụ añụrị n’aha nsọ ya

Ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa. Azịza

2. Chọbanụ onyenweanyị na ike ya

chọbanụ ihu nke onyenweanyị mgbe niile,

Chetanụ ọrụ ebube niile ọ rụrụ,

ọrụ ịtụnaanya ya niile na ikpe niile si n’ọnụ ya pụta, Azịza

3. Ụnụ ụmụ Abraham bụ nwodibo ya,

ụmụ Jekọb bụ onye nke ọ họọrọ!

Ọ bụ ya bụ Onyenweanyị na Chineke anyị,

Ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile. Azịza

MBEKU – Phil 2:15-16

Alleluia, Alleluịa:

Chawapụtanụ dịka ihe n’ụwa, jidesienụ okwu nke ndụ ahụ ike.

Alleluia

OZIỌMA – 10:1-7

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu kpọrọ ndị ụmụazụ ya iri na abụọ, nye ha ike ịchụpụ ajọ mmụọ na ịgwọ ọrịa na nrịanrịa niile dị icheiche.

Aha ndị ụmụazụ iri na abụọ ahụ bụ ndị a: onye mbụ bụ Saịmọn onye a na-akpọ Pita, na nwanne ya nwoke bụ Andru, Jemis, nwa Zebedi, na nwanne ya nwoke bụ Jọn, Filip na Batolomi, Tọmọs na Matiu onye ọnaụtụ; Jemis nwa Alfeus na Tedeus, Saịmọn onye Kenaan na Judas Iskarịọt onye rere Jesu.

Jesu zipụrụ mmadụ iri na abụọ ndị na-eso ụzọ ya, nye ha iwu sị, “Ụnụ agakwala ebe ọbụla na nke ndị mba ọzọ, mọbụ banye n’obodo ndị Sameria, Kama jekwurunụ ụmụatụrụ furu efu nke ụlọ Izrel. Ka ụnụ na-aga, na-ekwunụ sị, “Alaeze eluigwe adịla nso”.

Igbo Mass Readings for July 11 2024, Ncheta Benedict dị Asọ, Abbọt

Igbo Mass Readings for July 10 2024, Wenezde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 10, 2022