Igbo Mass Readings for July 31 2024, Wenezde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 31 2024, Wenezde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:10, 16-21

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah

Aziị agbala m nne m, n’ihina ị mụrụ m ka m bụrụ ihe esemokwu na ihe ịrụụka n’etiti mmadụ niile. Ebinyeghị m mmadụ ego nke m na-ebiri ebiri ma ha niile na-ata m ụta.

Mgbe okwu gị bịara, e jiri m obi ịnụ ọkụ nabata ya, okwu gị bụ mmasị m na añụrị nke obi m, maka na a kpọrọ m n’aha gị, O Yahweh na Chineke.

Anaghị m anọ n’oriri na ọñụñụ ndị ajọ mmadụ, ana m anọ naanị m maka na aka gị ji m, ejupụtakwara m n’iwe. Gịnị mere na ihe ụfụ m ekweghị nkwụsị, ọnya m enweghịkwa ọgwụgwọ, o kweghịkwa ala?

Ị chọrọ ịghọgbu m dịka iyi nke na-ata n’oge ọkọchị. Yahweh kwuru sị: ‘Ọ bụrụ na ị lọghachi, aga m anabata gị, ị ga-akwụkwa m n’ihu.

Ọ bụrụ na i kwuo ihe dị mma na-abụghị nke abaghị uru, ị ga-adịkwa ka ọnụ m. Ha ga-abịakwute gị, ma ị gaghị agakwu ha.

Aga m eme ka i sie ike dịka mgbidi ọlaọkụ n’ebe ndị a nọ, ha ga-alụso gị ọgụ, ma ha agaghị emeri gị, n’ihina anọnyeere m gị iji zọpụta gị; ọ bụ Yahweh na-ekwu. Aga m azọpụta gị n’aka ndị ajọ mmadụ na n’aka ndị ogbu ọchụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 59:1-2,3-4,9-10,16,17

Azịza: Chineke bụ ebe nchedo m oge m nọ na nsogbu.

1. Zọpụta m n’aka ndịiro m Chineke m,

Chekwaba m n’aka ndị na-ebuso m agha,

Zọpụta m n’aka ajọ mmadụ ndị a

n’aka ndị ogbu mmadụ ndị a! Azịza

2. Lee ha na-ezo onwe ha ezo ka ha nwee ike ijide m,

Ha dị ike jikọtakwa onwe ha ọnụ imegide m

e nweghị mmehie njọ mọbụ ihe m mere ha,

Onyenweanyị, lee ka ha ji ọsọ na-ewere ọnọdụ imegide m. Azịza

3. Ike m, elekwasịrị m gị anya;

Chineke n’onwe ya bụ ebe ozuzu ike m

Chineke onye hụrụ m n’anya na-abịa,

Chineke ga-egosi m mmeri e meriri ndịiro m. Azịza

4. N’akụkụ nke m, ana m añụrị maka ike gị

ana m ekwe ukwe n’ụtụtụ niile

Ị bụ ụlọ nke siri ike oge niile

Ebe nchedo m oge m nọ na nsogbu. Azịza

5. Ike m ana m akụrụ gị egwu,

ụlọ m siri ike bụ Chineke n’onwe ya

Chineke onye hụrụ m n’anya. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, meghee anya nke obi anyị, ka anyị wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ anyị.

Alleluia.

OZIỌMA – 13:44-46

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara oke igwe mmadụ sị,”Alaeze eluigwe dịka akụ e zoro n’ubi nke otu nwoke hụrụ wee kpuchie ya ihe, o were ọñụ laa, ree ihe niile o nwere, bịa zụrụ ala ubi ahụ”.

“Ọzọ, alaeze eluigwe dịka onye na-azụ ahịa nke na-achọ ụlarị ọma. Mgbe ọ hụrụ otu ụlarị dị oke ọnụ, ọ lara, ree ihe niile o nwere, wee zụta ụlarị ọma ahụ”.

Igbo Mass Readings for August 1 2024, Ncheta Alphọnsus Meri de Liguorị dị Asọ, Bishọp na Dọktọ

Igbo Mass Readings for July 31 2024, Wenezde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 10, 2022