Igbo Mass Readings for August 9 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 9 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 13:1-2, 25-14:1, 26-29, 34-35
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọnụọgụgụ
Yahweh gwara Mosis sị “Họpụta otu onye n’agbụrụ ọbụla, ndị ga-eje mee nchọpụta n’ala Kenaan m na-enye ụnụ. Ha ga-abụ ndị ndu n’agbụrụ ha.”
Ha mechara nchọpụta ala ahụ n’ime iri ụbọchị anọ wee laghachi. Ha bịakwutere Mosis na Erọn na ọgbakọ Izrel niile na Kadesh nke dị n’ịkpa Paran.
Ha wee kọọ ihe ha hụrụ gosịkwa ha ọyọkọ mkpụrụ osisi ha jiri lọta. Ha gwara Mosis, “Anyị eletachaala ala ahụ wee chọpụta na ọ bụ ala jupụtara na mmiriara ehi na mmanụ añụ n’ezie.
Nke a bụ ụfọdụ n’ime mkpụrụ osisi na-eme n’ala ahụ. Ma ndị bi n’ala ahụ siri ike nke ukwuu. E wusikwara obodo ahụ ike. Obodo ha niile buru ibu.
Ọ bụghị naanị nke ahụ, anyị hụkwara n’ebe ahụ ụmụụmụ ndị akatamkpo a na-akpọ ndị Anak. Ndị Amalek bi n’akụkụ ndịda nke ala ahụ, ndị Hit, na ndị Jebus na ndị Amọ bi n’elu ugwu ya.
Ndị Kenaan bikwa n’ụsọ oke osimiri Jọdan. Kaleb wee gwa ndị niile na-atamu ntamu megide Mosis ka ha daa jii. Ọ gwakwara ha sị, “Ka anyị busonụ ha agha ugbu a nara ha ala ha.
N’ihina anyị ga-emerili ndị ala ahụ.” Ndị ahụ ha na Kaleb soro jee sịrị, “Mba! Anyị agaghị ebusoli ndị ala ahụ agha n’ihina ha dị ike karia anyị.”
Ya mere ha jiri gbasaa akụkọ ụgha n’etiti ndị Izrel banyere ala ahụ ha mere nchọpụta n’ime ya. Ha sịkwara, “Ala ahụ anaghị emepụta nri na-ezuru ndị bi n’ime ya.
Ọzọkwa ndị niile bi n’ala ahụ toro ogologo nke ukwuu gbakwaa dimkpa. Anyị hụrụ n’ezie ndị akatamkpo ahụ bụ ụmụụmụ Anak n’ebe ahụ. A tụọ anyị na ha anyị dịka ụkpara.”
N’abalị ahụ niile ndị Izrel bere nnukwu akwa. Yahweh wee sị Mosis na Erọn, “Kedụ oge igwe mmadụ a ga-akwụsị ntamu megide m?
Anụjuola m ntị na ntamu ha! Ugbu a, nye ha ọsịsa nke a: Añụọla m iyi, na dịka mụ onwe m na-adị ndụ, aga m eme ụnụ ihe ahụ ụnụ kwuru na ntị m.
Ụnụ ga-anwụ, ozu ụnụ aghasara n’ịkpa a niile n’ihina ụnụ tamuru ntamu megide m. O nweghị onye n’ime ụnụ gbara karịa iri afọ abụọ ga-aba n’ala ahụ.
Ụnụ ga-ata ahụhụ n’ihi mmehie ụnụ iri afọ anọ. Iri ụbọchị anọ ka ụnụ jiri leta ala Kenaan; otu ụbọchị n’ime ha ga-abụziri ụnụ otu afọ.
Ya mere iri afọ anọ ka ụnụ ga-ata ahụhụ njọ ụnụ. Mgbe ahụ ụnụ ga-amata ihe ọ pụtara bụ ịgbakụta m azụ.
Ana m añụ iyi na-aga m enyerịrị ụnụ ahụhụ a, ụnụ bụ ndị obi ọjọọ, ndị na-ezukọ na-agba izu megide m. N’ịkpa ebe a ka ụnụ niile ga-anwụ. Mụ onwe m bụ Yahweh ekwuola ya.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 106: 6-7, 13-14, 21-22, 23
Azịza: Cheta m O Osebụrụwa! N’ihi ịhụnanya I nwere n’ebe ndị nke gị nọ
1. Anyị na nna anyị ha emehiela
anyị emeela ihe ọjọọ; ikpe mara anyị
Mgbe nnanna anyị ha nọ n’ijipt
ha aghọtaghị ọrụ ebube gị. Azịza
2. O teghị aka ha chefuo ọrụ ya niile
ha anaghị echezikwa maka ndụmọdụ ya;
Oke ọchịchọ ha naara ha uche n’ọzara
ha wee nwalee Onyenweanyị. Azịza
3. Ha chefuru Chineke nke zọpụtara ha
Onye nke rụrụ ọrụ dị egwu n’ ala ljipt
Onye nke rụrụ ọrụ ịtụnaanya n’ ala ljipt
na ihe na-atụga egwu n’osimiri uhie. Azịza
4. Ya mere O jiri chee echiche ikpochapụ ha
Ọ gaara eme nke a, ma a sị na Mosis,
onye nke ọ họtara anọchighị n’etiti ha
wee medaa iwe ya dị ọkụ. Azịza
MBEKU – Jọn 10:27
Alleluia, Alleluia
Atụrụ m na-anụ olu m, ọ bụ Dinwenụ na-ekwu; Amakwaara m ha, ha na-esokwa m.
Alleluia
OZIỌMA – 15:21-28
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu siri n’ebe ahụ pụta, jebe n’akụkụ obodo Taya na Sidọn. Otu nwaanyị onye Kenaan nke bi n’ala ahụ pụtara na-eti mkpu sị, “Meere m ebere Nna m ukwu nwa Devid, mmụọ ọjọọ jidesiri nwa m nwaanyị ike!”
Jesu egheghị ya ọnụ. Ndị na-eso ụzọ ya wee bịakwute ya, rịọ ya sị, “Chụlaa nwaanyị a n’ihina ọ na-eti mkpu na-eso anyị!” Ọ zaa ha sị, “Ezitere m naanị ijekwuru atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.”
Nwaanyị ahụ bịara sekpuru n’ihu Jesu na-arịọ ya sị, “Nna m ukwu biko nyere m aka.” Jesu azaa ya sị, “Ọ dịghị mma iwere nri ụmụaka ga-eri tụpụrụ nkịta.”
Nwaanyị ahụ zara ya sị, “Ee Nna anyị, ọbụladị ụmụ nkịta na eri irighịri nri nke siri n’okpokoro nna ha ukwu dapụ.”
Mgbe ahụ, Jesu zara ya sị, Nwaanyị okwukwe gị buru ibu! Ka ihe niile ị na-achọ mezuoro gị.” N’otu oge ahụ, ahụ dịrị nwa ya nwaanyị mma.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.