Igbo Mass Readings for July 5 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 5 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 21:5, 8-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Abraham gbara otu narị afọ mgbe a mụụrụ ya Aịzik nwa ya nwoke. Mgbe nwa ahụ toro, a chụrụ ya ara, Abraham kpọrọ nnukwu oriri. Ugbu a Sera nọrọ na-ele nwa ahụ Haga onye ljipt mụtaara Abraham, ka ya na Aịzik na-egwu egwu.
Ọ gwara Abraham sị: “Chụpụ ohu nwaanyị a na nwa ya nwoke, n’ihina nwa ohu nwaanyị a na Aịzik agaghị ekekọ ihe nketa gị”. Nke a wutere Abraham nke ukwuu, n’ihina nwa ohu nwaanyị ahụ bụkwa nwa ya nwoke.
Ma Chineke sịrị ya, “Ya ewutekwala gị maka ihi nwatakịrị nwoke a na ohu gị nwaanyị. Mee ihe ọbụla Sera kwuru, n’ihina ọ bụ Aịzik bụ onye nke a ga-esi na ya nụ aha gị. Ma nwa nwoke nke ohu nwaanyị gị ahụ, aga m emekwa ya nnukwu mba, n’ihina ọ bụkwa nwa gị”.
N’isi ụtụtụ echi ya, Abraham were ụfọdụ achịcha na otu udu mmiri nye Haga, kunyekwa ya nwa ahụ n’ubu ya ma chụpụ ha. O were gaba n’ime ịkpa nke Biasheba.
Mgbe mmiri ahụ gwụrụ, ọ hapụrụ nwa ahụ n’ime ọhịa. N’oge ahụ, ọ gara nọdụ ala n’ebe dị anya, ihe dịka nzọụkwụ iri abụọ, na-ekwu n’onwe ya sị, “agaghị m enwe obi ịhụ ọnwụ nwa a”.
Ya mere, ọ nọdụ ala n’ebe dị anya, nwata a bidoro bewa akwa. Chineke nụrụ olu nwatakịrị ahụ ka ọ na-ebe akwa, mmụọọma nke Chineke si n’Eluigwe kpọọ Haga jụọ ya sị: “Olee ihe na-eme gị Haga?
Ụjọ atụla gị, n’ihina Chineke anụla olu akwa nwatakịrị a ya na n’ọnọdụ ya. Bilie, gaa kulite nwatakịrị ahụ ma jisie ya ike n’ihina aga m eme ya nnukwu mba.
N’oge a, Chineke emepee anya Haga o wee hụ otu ụmị, ọ gaa kujuo udu ahụ mmiri nye nwatakịrịahụ ọ ñụọ. Chineke nọnyeere nwatakịrị ahụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 34:6-7,9,11-12
Azịza: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye
1. Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye,
Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile.
Mmụọọma nke Onyenweanyị na-eche ndị na-atụ ya egwu nche;
Ọ na-azọpụta ha. Azịza
2. Ụnụ ndị nsọ niile, tụọnụ Onyenweanyi egwu
n’ihina ndị niile na-atụ Onyenweanyị egwu
enweghị ihe na-akpa ha.
Agụụ nwere ike gụọ ụmụ ọdụm
Mana iheọma anaghị akọ
n’ebe ndị na-achọ Onyenweanyị nọ. Azịza
3. Bịanụ ụmụ ntakịrị, geenụ m ntị,
aga m akụziri ụnụ ịtụ egwu Onyenweanyị.
Olee onye n’ime ụnụ chọrọ ibiru ndụ ya n’isi,
onye nke chọrọ ogologo ndụ na iheọma. Azịza
MBEKU – Ps. 145:13
Alleluia, Alleluịa:
Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile, omume ya niile jupụtara n’obi ebere.
Alleluịa.
OZIỌMA – 8:28-34
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe o rutere n’akụkụ nke ọzọ, n’obodo Gadara, mmadụ abụọ ndị ajọ mmụọ ji, si n’ebe a na-eliozu pụta zutere ya. Ha na-eyi oke egwu nke na o nweghị onye nwere ike ịgafe n’ụzọ ahụ.
Ozigbo ha tiri oke mkpu sị: “Kedụ ihe jikọrọ anyị na gị, nwa nke Chineke? Ị bịara ebe a ịta anyị ahụhụ tupu oge eruo? Mgbe ahụ e nwere igwe ezi nọ nso ebe ahụ na-ata nri.
Ajọ mmụọ ndị ahụ arịọ ya sị: “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, ziga anyị n’ime igwe ezi ndị a”. Jesu gwara ha sị, “Gabanụ!” Ha wee pụta, banye n’ime igwe ezi ahụ.
Ozigbo, ezi ndị ahụ weere ọsọ si n’ugwu ahụ gbadaa, wee wụba n’ime osimiri. Mmiri gbagburu ha niile. Ndị na-azụ ezi ahụ gbara ọsọ, gbaba n’ime obodo, ebe ha kọọrọ ndị mmadụ ihe merenụ, na ihe mekwara ndị ahụ ajọ mmụọ ji.
Ozigbo, ndị obodo ahụ niile pụtara izute Jesu. Mgbe ha hụrụ ya, ha rịọrọ ya ka o si n’obodo ha pụọ.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.