Igbo Mass Readings for July 19 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 19 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-6, 9-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
N’oge ahụ Mosis na-echekwa igwe atụrụ ọgọ ya nwoke bụ Jetro, onye nchụaja nke Midian, o duuru igwe atụrụ ndị ahụ gaa n’akụkụ ọdịda anyanwụ ọzara wee garute na Họreb bụ ugwu nke Chineke.
N’ebe ahụ ka mmụọọma nke Chineke bịakwutere ya n’ụdị ire ọkụ na-enwu n’ime ọhịa ma ọ naghị erepịa ahịhịa dị n’ọhịa ahụ. Mosis we kwuo sị, “Aga m agaru nso ma lee ihe ịtụnaanya nke a mere na ahịhịa ndị a dị n’ọhịa anaghị ere ọkụ”.
Mgbe Chineke hụrụ ka ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, o si n’ime ọhịa ahụ kpọọ ya oku sị, Mosis, Mosis” ọ zara ya sị, “Anọ m ebe a”.
Yahweh asị ya, “Abịakwala nso; yipụ akpụkpọ ụkwụ gị n’ihina ebe i guzo bụ ala nsọ”. Chineke gwakwara ya sị, “Abụ m Chineke nke nna gị ha, Chineke nke Abraham, Chineke nke Aịzik, na Chineke nke Jekọb”.
Mosis were kpuchie ihu ya n’ihina egwu na-atụ ya ile Chineke anya n’ihu. Ugbu a akwa ụmụ Izrel eruola m ntị, ahụla m otu ndị ụmụ ljipt si emekpa ha ahụ.
Bịa, aga m ezigara gị Fero ka ị gaa kpọpụta ndị nke m, ụmụ Izrel n’ala ljipt.” Mana Mosis jụrụ Chineke sị, “Onye ka m bụ m ga-eji gakwuru Fero wee kpọpụta ụmụ Izrel n’ala ljipt?
Chineke zara ya sị, “Aga m anọnyere gị, ma nke a bụ ihe ga-egosi gị na ọ bụ m zigara gị, mgbe ị dupụtachara ụmụ Izrel site n’ala ljipt, ụnụ ga-efe Chineke ofufe n’elu ugwu a”.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 103:1-2, 3-4, 6-7
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
1. Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,
gọzie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n’ime m!
Gọzie Onyenweanyị mkpụrụobi m,
echezọkwala obi ebere ya niile. Azịza
2. Nke o ji gbaghara njọ gị niile,
ma gwọọ ọrịa gị niile,
nke o ji si n’olulu zọpụta ndụ gị,
nke o ji were ịhụnaanya na obi ebere kpube gị okpueze. Azịza
3. Onyenweanyị, onye na-eme iheọma,
na-anọkarị n’akụkụ ndị a na-emegbu emegbu,
O mere ka Mosis mata echiche ya,
ma gosịkwa ụmụ Izrel ike ya. Azịza.
MBEKU – Matiu 11:25
Alleluia, Alleluia:
Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke eluigwe.
Alleluia.
OZIỌMA – 11:25-27
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
N’oge ahụ Jesu kwuru sị, “Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe ndị a i zonahụrụ ndị amamihe na ndị okemmụta.
Ee, Nna, otu a ka o siri masị gị. Nna m ahanyela m ihe niile n’aka, o nweghị onye ọbụla maara Nwa ahụ ma e wezuga Nna.
Ọ dịghịkwa onye ọbụla maara Nna ma e wezuga Nwa, ya na onye ọbụla Nwa ahụ chọrọ ka ọ mara ya.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.