Igbo Mass Readings for July 17 2024, Wenezde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 17 2024, Wenezde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 10:5-7, 13-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Isaiah
Azị gbakwa gị, Asiria, mkpọ igwe nke iwe m, mkpara nke obi ọkụ m. Ana m eziga ya imegide mba na-amaghị Chineke; Ezipụrụ m ya maka ndị ka kpasuru m iwe; ka o mebie ha, kwakọrọ akụ ha; zọpịa ha ka apịtị dị n’okporo ụzọ.
Mana o cheghị otu a, uche ya adịkwaghị na nke a; kama o bu n’obi imebi na ịkwatu ọtụtụ mba; Maka na O kwuru sị; Ọ bụ n’ike aka m ka m si wee mee ihe ndị a; ọ bụkwa site n’amamihe m, n’ihina enwere m nghọta;
Ewepụla m oke jikọrọ mba na mba, kwakọrọkwa akụ ha niile; Dịka oke ehi, a kwatuola ndị nọ n’ocheeze. Aka m anwụchiela akụnụụba ndị mmadụ dịka akwụ ụmụnnụnụ;
Dịka ndị mmadụ si achịkọrọ akwa a hapụrụ ahapụ; otu ahụ ka m si chịkọta ụwa niile; O nweghị onye megharịrị nku ya mọbụ saghee ọnụ ya, mọbụ mee mkpọtụ.
Anyiike, ọ ga-anara otito karịa onye ji ya awa nkụ? Mọbụ, nkwọ osisi ọ ga-asị na ya ka onye ji ya akwọ osisi ike?
Ọ ga-adị ka a ga-asị na mkpọ igwe na-efegharị onye ji ya; mọbụ na mkpara na eweli ihe na-abụghị osisi elu! N’ihi ya Yahweh nke igwe ndịagha, ga-ezigara ndị ya bụ dike n’agha ọrịa ga-ala ha n’iyi, Akụnụụba ya ga agba ọkụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 94:5-6, 7-8, 9-10, 14-15
Azịza: Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya
1. Onyenweanyị ha na-azọpịa ndị nke gị,
na-emegbu ndị bụ ekpe gị.
Ha na-egbu ụmụ nwaanyị ajadụ na ndị ọbịa;
Na-egbukwa ụmụ ndị na-enweghị nne na nna. Azịza
2. Ha na-asị: Onyenweanyị anaghị ele anya,
Chineke nke Izrel amaghị ihe anyị na-eme.
Ụnụ ndị kacha nzuzu ndị na-amaghị ihe,
chịgharịanụ ihe ndị a n’obi ụnụ ka ụnụ mụta ihe. Azịza
3. Ọ bụ na onye mere ntị a gaghị enwe ike ịnụ ihe?
Onye kere anya, O nweghị ike ịhụ ụzọ?
Ọ dị ụnụ ka onye na-agbaziri mba niile, agaghị ata ha ahụhụ?
Onyenweanyị, onyenkuzi mmadụ niile ọ gaghị enwe amamihe? Azịza
4. N’ihina Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya,
Ọ gaghị echezọ ndị nke o jiri aka ya were họrọ
Ma ikpe nkwụmọtọ ga-abịaghachi n’ụlọ ikpe,
ndị eziomume ga-agbasokwa ya. Azịza
MBEKU – Matiu 11:25
Alleluia, Alleluia:
Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke eluigwe.
Alleluia.
OZIỌMA – 11:25-27
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
N’oge ahụ Jesu kwuru sị, “Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe ndị a i zonahụrụ ndị amamihe na ndị okemmụta.
Ee, Nna, otu a ka o siri masị gị. Nna m ahanyela m ihe niile n’aka, o nweghị onye ọbụla maara Nwa ahụ ma e wezuga Nna.
Ọ dịghịkwa onye ọbụla maara Nna ma e wezuga Nwa, ya na onye ọbụla Nwa ahụ chọrọ ka ọ mara ya.
Igbo Mass Readings for July 18 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for July 17 2024, Wenezde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.