Igbo Mass Readings for July 26 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 26 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 16:1-5, 9-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
Mgbe ha hapụrụ Elim, ụmụ Izrel niile rutere na mbara ịkpa nke Sịn, nke dị n’etiti Elim na Sinaị, ha rutere ebe a n’ụbọchị iri na ise n’ime ọnwa nke abụọ ha jiri hapụ ala Ijipt.
Mana ụmụ Izrel niile tamuru ntamu n’ime ịkpa ahụ megide Mosis na Erọn, sị ha, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na Yahweh gbusịrị anyị n’ala Ijipt bụ ebe anyị na-eriju achịcha afọ karịa otu a ụnụ kpọpụtarala anyị na mbara ịkpa a ka agụụ gbuo anyị”.
Yahweh wee gwa Mosis sị, “Lee ugbu a, aga m eme ka achịcha si n’elu na ezoro ụnụ ka mmiri, ha ga na-ekpokọrọ naanị nke ga-ezuru ha n’ụbọchị, achọrọ m ka m si ụzọ a nwalee ha ka m wee mara ma ha ga-edobe iwu m.
N’ụbọchị nke isii, mgbe ha na-akwado ihe ha nwetara, ọ ga-eji mmaji abụọ karịa ihe ha na-enweta kwa ụbọchị”. Mosis gwara Erọn ka ọ gwa ụmụ Izrel niile sị, “Bịanụ Yahweh nso, maka na ọ nụla ntamu ụnụ”.
Ka Erọn na-agwa ụmụ Izrel okwu ndị a, ha lere anya n’ịkpa, ma lee, ebube nke Yahweh bịakwutere ha n’urukpu.
Yahweh gwara Mosis sị, “Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel, gwa ha sị, na mgbede, ụnụ ga-eri anụ, n’isi ụtụtụ, ụnụ ga-eri achịcha, mgbe ahụ ụnụ ga-ama na abụ m Yahweh Chineke ụnụ”.
N’oge mgbede, nnụnụ kwel jupụtara ogige ha, ma n’ụtụtụ igirigi wụchisịrị ogige ahụ niile. Mgbe igirigi ahụ gbasasịrị; ihe dịka ntụ na-acha ọcha jupụtara n’ịkpa ahụ.
Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ihe a, ha jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị bụ ihe a?” Maka ha amaghị ihe ọ bụ. Ma Mosis gwara ha sị, “Ọ bụ achịcha nke Yahweh nyere ụnụ ka ụnụ rie”.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 78:18-19, 23-24, 25-26, 27-28
Azịza: O zooro ha achịcha ka mmiri ka ha rie.
1. Ha kpachaara anya nwaa Chineke
site n’ịchọ nri nke na-amasị ha.
Ha kwutọrọ Chineke sị,
Chineke o nwere ike ịkpọ oriri n’ịkpa? Azịza
2. N’agbanyeghị ihe ndịa, O nyere mbara igwe iwu,
meghee ọnụụzọ nke eluigwe;
O zooro ha achịcha ka mmiri ka ha rie,
nyekwa ha ọka nke si n’eluigwe. Azịza
3. Mmadụ riri nri nke ndị mmụọọma,
o nyere ha nri n’uju.
O mere ka ikuku ọwụwa anyawụ kuo n’eluigwe,
n’ike ya ka o jiri kpọlite ikuku ọdịda anyanwụ. Azịza
4. ziteere ha anụ n’ụbara dịka uzuzu,
zitekwara ha nnụnụ ufe buru ibu dịka aja dị n’akụkụ osimiri.
O mere ka ha daa n’etiti ebe obibi ha,
n’akụkụ ụlọikwu ha niile. Azịza.
MBEKU – Matiu 4:4
Alleluia, Alleluia:
Ọ bụghị naanị site na nri ka mmadị si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta”.
Alleluia.
OZIỌMA – 13:1-9
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
N’otu ụbọchị ahụ, Jesu siri n’ụlọ pụọ, gaa nọdụ n’akụkụ oke osimiri. Oke igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu, nke mere o jiri banye n’ụgbọmmiri wee nọdụ ala.
Igwe mmadụ ahụ guzokwa n’akụkụ oke osimiri ahụ. O jiri ụkabụilu gwa ha ọtụtụ okwu sị, “Ọgha mkpụrụ gara ịgha mkpụrụ n’ubi ya. Ka ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ dara n’akụkụ okporo ụzọ, ụmụnnụnụ atụrịa ha.
Ụfọdụ dara n’ala okwute, ebe ha enwetaghị aja zuuru ha. Ozigbo ha pulitere, n’ihina aja dị ebe ahụ emighị emi, mgbe anwụ wara, ha chanwụrụ, kpọnwụọ n’ihina mgbọrọgwụ ha emibaghị n’ime ala.
Mkpụrụ ụfọdụ dara n’etiti ogwu; ogwu tolitere, kpagbuo ome ha pupụtara. Mkpụrụ ụfọdụ dara n’ala dị mma, wee mịta mkpụrụ, ụfọdụ mịtara otu narị, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ iri atọ. Onye nwere ntị ya nụrụ”.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.