Igbo Mass Readings for May 1 2024, Wenezde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 1 2024, Wenezde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:1-6
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
N’oge ahụ, ụfọdụ ndị mmadụ siri na Judia bịa n’Antiọk na-akuziri ndị ụmụnna n’ime Kristi sị: “A gaghị azọpụta ụnụ ma ọ bụrụ na e bighị ụnụ ugwu dịka iwu Mosis siri kwuo.”
Ha na Pọl na Banabas sere nnukwu okwu, sịekwa agụgọ okwu dị ọkụ maka nke a. N’ihi nke a, ha kpebiri ka Pọl na Banabas, na ụfọdụ ndịisi ndị ọzọ nọ n’Antiọk soro gaa Jerusalem hụ ụmụazụ na ndị okenye nke nzukọ Kristi, maka okwu a.
Mgbe nzukọ Kristi nọ n’Antiọk dupụrụ ha, ndịozi ahụ siri Fonishịa na Sameria, na-akọrọ ụmụnna n’ime Kristi ka ndị mba ọzọ si chegharịa, bịakwute Chineke. Akụkọ ndị a nyere ụmụnna n’ime Kristi ọñụ.
Mgbe ha bịaruru Jerusalem, ndịozi na ndị okenye na nzukọ Kristi niile zutere ha. Ha kọọrọ ha ihe niile Chineke jiri ha rụọ. Ụfọdụ ndị Farisii ndị kwere ekwe biliri, na-ekwurịrị sị, “Ọ dị mkpa ka e bie ha ugwu ma gwakwa ha ka ha dobe Iwu Mosis.” Ndịozi na ndị okenye zukọrọ ịtụle okwu a.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 122: 1-2, 3-4, 4-5.
Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, “Ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.”
1. Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị,
“Ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.
Ugbu a, anyị kwụzi n’ọnụụzọ ama gị,
O Jerusalem. Azịza
2. A rụrụ Jerusalem dịka obodo
e jikọtara ọnụ nke ọma.
Ọ bụ na ya ka agbụrụ niile na-aga,
agbụrụ nke Izrel. Azịza
3. Inye Onyenweanyị ekele
dịka o siri nye n’iwu.
Ebe ahụ ka e dobere oche ikpe eze,
ocheeze nke ụlọ Devid. Azịza
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Ọ bụrụ na ụnụ so Kristi bilie n’ọnwụ na-achọnụ ihe dị n’eluigwe ebe Kristi nọ n’aka nri nke Chukwu.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 15:1-8
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Abụ m ezigbo vaịn, Nna m bụkwa onye na-edozi vaịn ahụ. Alaka m ọbụla nke na-adịghị amị mkpụrụ ka ọ ga-egbupụ.
Ma ọ na-egbucha alaka ọbụla nke na- amị mkpụrụ, ka ọ mịa mkpụrụ karịa. Ugbu a emeela ka ụnụ dị ọcha site n’okwu niile m gwara ụnụ. Nọgidenụ n’ime m, ka mụ onwe m nọgidekwa n’ime ụnụ.
Dịka alaka vaịn na-apụghị ịmịta mkpụrụ, karịa ma ọ nọgideghi n’osisi vaịn, otu aka ahụ, ụnụ apụghị ịmịta mkpụrụ belụsọ ma ụnụ ọ nọgidere n’ime m.
Abụ m osisi vaịn ahụ, ma ụnụ bụ alaka m. Onye ọbụla nọgidere n’ime m, mụ onwe m anọgidekwa n’ime ya, bụ onye ga-amịta ọtụtụ mkpụrụ, n’ihina ewezuga m, ọ dịghị ihe ụnụ pụrụ ime.
Onye ọbụla na-anọgideghị n’ime m, a ga-egbupụ ya dịka alaka, ọ ga-akpọnwụ. Aga-achịkọta ya, chịnye ya n’ọkụ, o repịa. Ọ bụrụ na ụnụ anọgide n’ime m, okwu m anọgidekwa n’ime ụnụ, rịọnụ ihe ọbụla ụnụ chọrọ a ga-emere ụnụ ya. Site n’ịmị ọtụtụ mkpụrụ ka ụnụ ga-esi enye Nna m otito wee gosi na ụnụ bụ ndị na-eso ụzọ m.”
Igbo Mass readings for May 2 2024, Ncheta Athanasius dị Asọ, Bishọp na Dọktọ
Igbo Mass Readings for May 1 2024, Wenezde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.