Igbo Mass Readings for February 12 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 12 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:5-9, 15-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
N’oge ahụ, mgbe Yahweh Chineke kechara Eluigwe na ụwa, e nweghị nnukwu oke ọhịa ọbụla n’elu ụne nke a na-enwe nnukwu oke osisi toliterenụ, n’ihina Osebụrụwa Chineke ezitebeghị mmiri ozizo n’elu ụwa, nke a na-enwe mmadụ nwere ike ikọ ihe ubi n’oge ahụ.
Kama mmiri si n’ime ala ahụ na-agbapụta bịara gbasaa n’elu ala ahụ niile. Yahweh Chineke abịa si n’ụrọ ala ahụ kpụọ mmadụ, bịakwa fụnye ikuku ndụ n’imi ya; mmadụ ahụ wee ghọọ onye dị ndụ.
Yahweh Chineke wuru ogige n’Eden, nke dị n’ofe ọwụwa anyanwụ; ọ bụ n’ebe ahụ ka o mere ebe obibi mmadụ ahụ o kere.
Yahweh Chineke mere ka osisi dị icheiche dị mma ile anya ma dịkwa mma oriri si n’ụrọ ala ahụ topụta; o mere ka osisi nke na-enye ndụ nakwa osisi nke ịmata iheọma na nke ọjọọ dịrị n’etiti ogige ahụ.
Yahweh Chineke kpọọrọ mmadụ ahụ bịa nye ya ebe obibi n’ogige nke Eden ka ọ na-etize ala ya, nakwa echekwa ya.
E mechara Yahweh Chineke enye nwoke ahụ iwu sị, “I nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị n’ogige a. Ma ị gaghị ata mkpụrụ nke si n’osisi nke na-enye amamihe iheọma na nke ọjọọ, n’ihina ụbọchị ị tara ya, ị ga-anwụ”.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 104: 1-2,27-28, 29-30
Azịza: Gozie Onyenweanyị, mkpụrụobi m.
1. Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,
Onyenweanyị Chineke, lee ka i si dị ukwu!
I jupụtara n’ebube na otito,
I ji ihe ekpuchi onwe gị dịka akwa.
Azịza: Gozie Onyenweanyị, mkpụrụobi m.
2. Ihe niile e kere eke chekwubere na gị,
ka i zụọ ha nri n’ogologo afọ.
I na-eweta nri ha na-eri,
i ji obiọma gi enyejucha ha afọ.
Azịza: Gozie Onyenweanyị, mkpụrụobi m.
3. Ị kwụsị ha iku ume, ha anwụọ,
ma laghachikwa n’etum.
Ọ bụrụ na i nye ikuku, ndụ ọhụrụ ebidokwa,
Ị na-eme ụwa ka ọ dị ọhụrụ mgbe niile.
Azịza: Gozie Onyenweanyị, mkpụrụobi m.
MBEKU – Ps. 25:4,5
Alleluia, Alleluia:
Onyenweanyị, mee ka m mata ụzọ gị, dube m n’ụzọ eziokwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 7:14-23
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu kpọrọ igwe mmadụ ahụ ọzọ ka ha bịakwute ya. Ọ sịrị ha, “Geenụ m ntị, ụnụ niile, ghọtakwanụ ihe m ga-ekwu! O nweghị ihe ọbụla si n’ọnụ banye n’ime mmadụ na-emerụ ya.
Kama ọ bụ ihe si n’ime mmadụ pụta bụ ihe na-emerụ mmadụ. Onye nwere ntị ya nụrụ”. Mgbe Jesu hapụrụ igwe mmadụ ahụ banye n’ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe okwu a pụtara.
Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ na ụnụ enwekwaghị nghọta? Ọ pụtara na ụnụ amaghị na ihe ọbụla si n’ọnụ banye n’ime mmadụ apụghị imerụ ya. N’ihina ihe oriri adịghị abanye n’obi mmadụ kama n’afọ.
Ọ na-esikwa ebe ahụ pụọ”. Site n’ikwu otu a, o mere ka ihe oriri niile dị ọcha. O kwukwara sị, “Ihe na-emerụ mmadụ bụ ihe si n’ime mmadụ pụta.
N’ihina site n’ime mmadụ, ya bụ site n’ime obi, ka echiche ọjọọ nke na-eduba mmadụ n’omume rụrụ arụ, si apụta, ya na ịkwaiko na izu ohi niile na igbu mmaduụ na ịkpọrọ nwunye mmadụ mọbụ di mmadụ, obi ọjọọ na arụrụala, nghọgbu, asọghị anya na ịkwaiko, anya ụfụ, nkwulu, mpako, enweghị uche ime ihe ziri ezi na ịghọta ihe nke mmụọ. Omume ọjọọ ndị a na-esi n’ime mmadụ apụta. Ọ bụ ha na-emerụ mmadụ”.
Igbo Mass Readings for February 13 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for February 12 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.